Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 4/1 p. 26-29
  • Ụzọ Ndị Kraịst Si Anagide Nkọcha Ihu Ọha

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụzọ Ndị Kraịst Si Anagide Nkọcha Ihu Ọha
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Nlereanya nke Ndị Kraịst Ga-agbaso
  • Ì Kwesịrị Ịzaghachi Nkatọ?
  • Ịnụta Site n’Ọnụ Onye O Metụtara Dị Mkpa
  • Ekwela Ka Ndị Mmegide Menye Gị Ụjọ
  • Ịgọpụrụ Okwukwe Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Ndị A Kpọrọ Asị N’enweghị Ihe Kpatara Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Ndị A Na-akpagbu Ma Ha Enwee Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Ndị Kraịst Na Ọha Mmadụ Nke Oge A
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 4/1 p. 26-29

Ụzọ Ndị Kraịst Si Anagide Nkọcha Ihu Ọha

OLEE otú ọ na-adị gị mgbe mmadụ na-akọcha gị ma ọ bụ na-agbasa ihe ndị bụ ụgha banyere gị? Dị ka ọ na-adịkarị ọ na-ewute gị nke ukwuu. Ndịàmà Jehova na-enwe mmetụta yiri ya mgbe ọ bụla ha ghọrọ ndị ụlọ ọrụ mgbasa ozi na-ekwu ihe ndị bụ ụgha ma ọ bụ ihe ndị na-abụchaghị eziokwu banyere ha. Ma dị ka Jisọs kwuru na Matiu 5:11, 12, ha ka nwere ihe mere ha ga-eji na-enwe ọṅụ.

Dị ka ihe atụ, otu akwụkwọ ndị Katọlik na Germany kwuru na “ọ bụ iwu nye Onyeàmà ọ bụla inye isi ụlọ ọrụ nke ịrọ òtù ahụ onyinye nke ihe nọ n’agbata pasent 17 na 28 nke ihe ọ na-akpata.” Otú ọ dị, Ndịàmà Jehova abụghị ịrọ òtù, ọ bụkwa onyinye afọ ofufo ka e ji akwado ọrụ ha nile kpam kpam. E ji akụkọ a na-abụghị eziokwu duhie ọtụtụ ndị gụrụ ya, bụ́ nke wutere Ndịàmà Jehova. Ma olee otú ezi ndị Kraịst kwesịrị isi meghachi omume ná nkọcha nke ụlọ ọrụ mgbasa ozi?

Ihe Nlereanya nke Ndị Kraịst Ga-agbaso

Matiu isi 23 na-akọwa n’ụzọ doro anya otú Jisọs si katọọ ndị okpukpe na-emegide ya n’ihi omume ihu abụọ na aghụghọ ha. Nke a ọ̀ na-enye ndị Kraịst taa ihe nlereanya n’ụzọ a ga-esi mesoo ndị nkatọ? Ọ bụchaghị. Ọkpara Chineke katọrọ ndị okpukpe na-emegide ya n’ihi ike na nghọta pụrụ iche o nwere, na-eme otú ahụ maka abamuru nke ìgwè mmadụ na-ege ntị.

Matiu 15:1-11 na-akọ na a katọrọ Jisọs n’ihi na a sịrị na ndị na-eso ụzọ ya mebiri ọdịnala nke ndị Juu. Olee otú Jisọs si meghachi omume? Ọ kwụsiri ike ebe ọ kwụrụ. Mgbe ụfọdụ, Jisọs ji nkwuwa okwu soro ndị na-akatọ ya rụrịta ụka, na-ajụ echiche ha ndị na-ezighị ezi. N’ozuzu ha, ndị Kraịst taa adịghị ehie ụzọ n’ịgbalị ịgbazi ihe ndị na-ezighị ezi ndị e kwuworo banyere ọrụ ma ọ bụ ozizi ha, na-anwa ime ka ọnọdụ dowanye anya n’ụzọ eziokwu na n’ụzọ ezi izu dị na ya. Ha na-eme nke a iji nyere ndị nwere obi eziokwu aka ịghọta na nkatọ a na-akatọ Ndịàmà Jehova enweghị ihe kpatara ya, bụrụkwa nke nkwutọ.

Ma rịba ama otú Jisọs si meghachi omume ntakịrị oge ka e mesịrị mgbe ndị na-eso ụzọ ya kwuru, sị: “Ị̀ matawo na e mere ka ndị Farisii ma n’ọnyà, mgbe ha nụrụ okwu ahụ?” Ndị Farisii ndị a ‘mara n’ọnyà’—ọ bụghị nanị na iwe were ha kama ha ghọrọ ndị mmegide a na-apụghị ịgbazi agbazi bụ́ ndị Jisọs jụrụ. Ya mere ọ zara, sị: “Hapụnụ ha: ha bụ ndị ndú kpuru ìsì.” Isoro ndị mmegide dị otú ahụ nwere obi ilu kwurịtakwuo okwu enweghị isi, ọ baghịrị onye ọ bụla uru, ọ ga-edujekwa nanị n’ịrụ ụka na-agaghị arụpụta ihe. (Matiu 7:6; 15:12-14; tụlee 27:11-14.) Azịza ndị Jisọs nyere na-egosi na e nwere “mgbe ịgba nkịtị, na mgbe ikwu okwu.”—Eklisiastis 3:7.

Ndịàmà Jehova adịghị atụ anya ka onye ọ bụla kwuo okwu ọma banyere ha. Ha na-eburu okwu Jisọs n’uche: “Ahụhụ ga-adịrị unu, mgbe ọ bụla mmadụ nile ga-ekwu okwu ọma banyere unu: n’ihi na otú ahụ ka ndị bụ nna ha mere ndị amụma ụgha.” (Luk 6:26) Ọ dị mgbe a jụrụ C. T. Russell, bụ́ onye isi oche mbụ nke Watch Tower Society, ihe mere na ọ zọrọghị onwe ya pụọ ná nkọcha. Ọ zara, sị: “Ọ bụrụ na ị kwụsị iji gbaa nkịta ọ bụla gbọrọ gị ụja ụkwụ, ị gaghị ejeru ebe dị anya.”

Ya mere, anyị ekwesịghị ikwe ka okwu nke ndị mmegide fooro ntùtù taa dọpụ anyị n’ozi anyị na-ejere Chineke. (Abụ Ọma 119:69) Ka anyị tụkwasị uche n’ọrụ ezi ndị Kraịst, ya bụ, izisa ozi ọma. Dị ka ihe na-esikarị na ya apụta, anyị ga-enwe ohere nke ịza ajụjụ dị iche iche na ịkọwa isi ọrụ anyị, dị ka imeziwanye omume mmadụ na izi ya ihe n’Okwu Chineke.—Matiu 24:14; 28:19, 20.

Ì Kwesịrị Ịzaghachi Nkatọ?

Jisọs kwuru banyere ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu esiteghị n’ụwa . . . N’ihi nke a ụwa na-akpọ unu asị.” (Jọn 15:19) Ọtụtụ akụkọ nke ụlọ ọrụ mgbasa ozi bụ́ ndị na-akọcha Ndịàmà Jehova nke ukwuu bụ ngosipụta nke ịkpọasị nke a, e kwesịkwara ileghara ha anya. Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, ụlọ ọrụ mgbasa ozi pụrụ ikwu ihe ndị na-egosi amaghị ihe ọ bụla banyere Ndịàmà ma ọ bụ ndị na-agbagọ ma na-akọwahie eziokwu ụfọdụ. Ndị ntà akụkọ ụfọdụ pụrụ inweta akụkọ ha site n’aka ndị nwere echiche ndị na-ezighị ezi. Ma ànyị na-eleghara akụkọ ndị na-abụghị eziokwu anya ma ọ bụ jiri ụzọ ndị ziri ezi na-agbachitere eziokwu na-adabere n’ọnọdụ ndị dịnụ, onye kpalitere nkatọ ahụ, na ihe bụ nzube ya.

Mgbe ụfọdụ a pụrụ ịgbazi ihe ndị bụ eziokwu site n’idegara onye editọ akwụkwọ ozi e deziri nke ọma ma ọ bụrụ na e bipụtara akwụkwọ ozi ahụ nile. Ma akwụkwọ ozi dị otú ahụ pụrụ ịrụpụta ihe megidere nnọọ ihe e bu n’obi. N’ụzọ dị aṅaa? A pụrụ isi otú a gbasaa ụgha mbụ ahụ ọbụna karị, ma ọ bụ a pụrụ inyekwu ndị mmegide ohere ibipụta ụgha ma ọ bụ okwu ọjọọ n’akwụkwọ. N’ihe ka n’ọtụtụ ọnọdụ ọ na-abụ ihe amamihe ịhapụrụ ndị okenye okwu ahụ metụtara, okwu metụtara idegara onye editọ ahụ akwụkwọ ozi. Ọ bụrụ na akụkọ ọjọọ nke ụlọ ọrụ mgbasa ozi akpalite ịkpọasị, alaka ụlọ ọrụ nke Watch Tower Society pụrụ ime ka ọgbakọ ndị dị ná mba ahụ mara ihe ndị bụ eziokwu, si otú a mee ka ndị nkwusa nile nwee ike inye ndị na-ajụ ajụjụ nkọwa na-eju afọ.

Ọ̀ dị unu mkpa n’otu n’otu itinyedị aka ma ọlị n’ebubo ndị dị otú ahụ gbagọrọ agbagọ? Ndụmọdụ Jisọs bụ́ “hapụnụ ha,” leghara ha anya, na-emezu n’ebe ìgwè nke a nke ndị iro dị n’ụzọ doro anya. Ndị Kraịst na-eguzosi ike n’ihe nwere ihe ndị sitere na Bible mere ha ji ajụ ndị si n’ezi ofufe dapụ na echiche ha. (1 Ndị Kọrint 5:11-13; Taịtọs 3:10, 11; 1 Jọn 2:19; 2 Jọn 10, 11) Ọ bụrụ na mmadụ ji obi eziokwu chọọ ịmata ma nkatọ a na-akatọ Ndịàmà ọ̀ bụ eziokwu ka ọ bụ ụgha, ezi ihe ọmụma i nwere na-ezukarị iji nye azịza.—Lee Ụlọ Nche nke September 15, 1986, peji 13 na 14.

Ọ bụrụ na a jụọ gị ajụjụ banyere akụkọ gbagọrọ agbagọ sitere n’ụlọ ọrụ mgbasa ozi, buru ndụmọdụ nke Ilu 14:15 n’uche: “Onye na-enweghị uche na-ekwere okwu nile ọ bụla: ma onye nwere ezi uche na-aghọta ijeụkwụ ya.” Na Switzerland ọtụtụ ndị were iwe mgbe otu akụkọ na-akpali mmetụta uche nke otu akwụkwọ akụkọ kwuru na otu nwa agbọghọ bụ́ Onyeàmà nwụrụ n’ihi na ndị ikwu ya jụrụ ikwe ka ndị ọrụ ụlọ ọgwụ mịnyere ya ọbara. Ma ihe ndị ahụ hà bụ eziokwu? Ee e. Onye ọrịa ahụ jụrụ mmịnye ọbara n’ihi ihe ndị metụtara okpukpe, ma o kwetara ịnara ụdị ọgwụgwọ ọzọ a na-adịghị eji ọbara eme ihe na ya. A gaara amaliteworị nke a n’ekwughị ogologo okwu ọzọ, ọ gakwaara azọpụta ndụ ya ma eleghị anya. Otú ọ dị, ụlọ ọgwụ ahụ gbuwere oge na-enweghị isi ruo mgbe oge gafesịworo. Akụkọ nke akwụkwọ akụkọ ahụ ehotaghị eziokwu ndị a.

Ya mere, jiri nlezianya tụlee ka eziokwu dị n’akụkọ ahụ haruru. Anyị pụrụ ịkọwara ndị na-ajụ ajụjụ na ndị okenye nọ n’ógbè ahụ na-elebara ọnọdụ ndị dị otú ahụ anya n’ụzọ ịhụnanya na n’ụzọ kwekọrọ ná nduzi nke Bible. Ịrapara n’ụkpụrụ mgbe a na-enye azịza na-egbochi anyị ịmabanye ná nkwubi okwu.—Ilu 18:13.

Ịnụta Site n’Ọnụ Onye O Metụtara Dị Mkpa

Na narị afọ mbụ, ndị mmadụ gbasara ụgha banyere Jisọs Kraịst iji mebie aha ya, ụfọdụ ọbụna na-akọwa ya dị ka onye na-agba ọchịchị mgba okpuru. (Luk 7:34; 23:2; tụlee Matiu 22:21.) Ka e mesịrị, ọgbakọ ndị Kraịst ahụ ka dị ọhụrụ nwetara mmegide gbasapụrụ agbasapụ site n’aka ndị okpukpe na ndị ụwa. Ebe “ọ bụ ihe nzuzu nke ụwa ka Chineke họpụtara,” ọtụtụ ledara ndị ohu ya anya. (1 Ndị Kọrint 1:22-29) Ezi ndị Kraịst taa aghaghị inweta nkọcha, nke bụ otu ụdị nke mkpagbu.—Jọn 15:20.

Otú ọ dị, ọ na-amasị Ndịàmà Jehova mgbe onye ya na ha na-enwe mkparịta ụka nwere obi ghere oghe ma na-egosipụta ụdị àgwà ahụ nke ụfọdụ n’ime ndị ọbịa Pọl na Rom gosiri, bụ́ ndị kwuru, sị: “Ọ dị anyị mma ịnụ n’ọnụ gị ihe ị tụkwasịrị uche gị na ha: n’ihi na ihe banyere ịrọ òtù a, anyị mazuuru na a na-ekwugide ya ebe nile.”—Ọrụ 28:22.

Kọwaara ndị na-aghọtaghị ihe merenụ, jiri obi dị umeala na-eme otú ahụ. (Ndị Rom 12:14; tụlee 2 Timoti 2:25.) Kpọọ ha òkù inweta ihe ọmụma n’onwe ha banyere Ndịàmà Jehova, bụ́ nke na-eme ka ha ghara ịbụ ndị e ji ebubo ụgha ghọgbuo. Ị pụkwara iji nkọwa ndị Watch Tower Society bipụtara mee ihe bụ́ ndị na-enye nkọwa sara mbara banyere nzukọ ha, akụkọ ya, na ozizi ya.a N’otu oge Filip zaghachiri Nataniel nanị site n’ikwu, sị: “Bịa lee.” (Jọn 1:46) Anyị pụkwara ime otú ahụ. A na-anabata onye ọ bụla chọrọnụ n’ụzọ na-ekpo ọkụ ije leta Ụlọ Nzukọ Alaeze dị n’ógbè ha iji hụ n’onwe ya ụdị mmadụ Ndịàmà Jehova bụ na ihe ndị ha kwere na ha.

Ekwela Ka Ndị Mmegide Menye Gị Ụjọ

Lee ka o si bụrụ ihe na-enye agbamume ịmata na nkọcha adịghị egbochi ndị mmadụ ịghọ Ndịàmà! N’otu nkwurịta okwu TV na Germany, ndị si n’ezi ofufe dapụ kwuru ọtụtụ ihe ndị bụ ụgha banyere Ndịàmà. Otu onye na-ekiri ya matara ihe ndị ahụ si n’ezi ofufe dapụ na-ekwu dị ka ndị na-emeghị eme wee bụrụ onye a kwaliri isoro Ndịàmà ahụ maliteghachi ọmụmụ Bible ya. Ee, mgbe ụfọdụ nkọcha ihu ọha na-arụpụta ihe ndị dị mma!—Tụlee Ndị Filipaị 1:12, 13.

Pọl onyeozi maara na ụfọdụ ga-aṅa ntị n’ebe “akụkọ ifo” dị karịa n’ebe eziokwu dị. Ya mere o dere, sị: “Na-enwe anya udo n’ihe nile, hụjuo anya, rụọ ọrụ nke onye na-ezisa ozi ọma, jezuo ozi gị.” (2 Timoti 4:3-5) Ya mere ekwela ka a dọpụ uche gị, ma ‘ghara ikwe ka ndị na-emegide gị mee ka ị tụọ ụjọ n’ihe ọ bụla.’ (Ndị Filipaị 1:28) Nọgide na-enwe obi dị jụụ na ahụ iru ala, jirikwa ọṅụ na-ekwusa ozi ọma, ị ga-enwekwa ike iji nnọgidesi ike na-anagide nkọcha ihu ọha. Ee, cheta nkwa Jisọs: “Ngọzi na-adịrị unu mgbe ọ bụla ha na-ata unu ụta, na-esogbukwa unu, na-ekwukwa ajọ ihe nile dị iche iche megide unu n’okwu ụgha, n’ihi m. Ṅụrịanụ ọṅụ, ka obi tọọkwa unu ụtọ nke ukwuu: n’ihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu n’eluigwe: n’ihi na otú a ka ha sogburu ndị amụma ndị buru unu ụzọ.”—Matiu 5:11, 12.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Lee akwụkwọ ndị bụ́ Ndịàmà Jehova Na-eme Uche Chineke n’Ịdị n’Otu n’Ụwa Nile, Jehovah’s Witnesses in the Twentieth Century, na Jehovah’s Witnesses—Proclaimers of God’s Kingdom.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 27]

Mgbe ha zutere ndị mmegide, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Hapụnụ ha.” Gịnị ka o bu n’uche?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 29]

“Ngọzi na-adịrị unu mgbe ọ bụla ha na-ata unu ụta, na-esogbukwa unu, na-ekwukwa ajọ ihe nile dị iche iche megide unu n’okwu ụgha, n’ihi m.”—Matiu 5:11

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya