Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 11/1 p. 10-15
  • Ndị A Zọpụtara n’Aka “Ajọ Ọgbọ”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị A Zọpụtara n’Aka “Ajọ Ọgbọ”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ọgwụgwụ”—Olee Mgbe?
  • “Ọgbọ A”—Gịnị Ka Ọ Bụ?
  • “Ajọ Ọgbọ A”
  • E Mee Ka A Mata “Ọgbọ A”
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Oge Ịmụrụ Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ọnụnọ Kraịst—Gịnị Ka Ọ Pụtara Nye Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 11/1 p. 10-15

Ndị A Zọpụtara n’Aka “Ajọ Ọgbọ”

“Unu ọgbọ na-enweghị okwukwe, nke nwekwara anya uhie, ruo ole mgbe ka Mụ na unu ga-anọ, ewee m nagidekwa unu?”—LUK 9:41.

1. (a) Gịnị ka oge anyị ndị jupụtara n’ọdachi bụ ihe àmà ya? (b) Gịnị ka Akwụkwọ Nsọ na-ekwu banyere ndị nlanarị?

ANYỊ na-ebi n’oge nke ọdachi jupụtara. Ala ọma jijiji, idei mmiri, ụnwụ nri, ọrịa, mmebi iwu, ịtụ bọmbụ, na agha ọjọọ—ndị a na ọtụtụ ndị ọzọ erikpuwo ihe a kpọrọ mmadụ n’ime narị afọ nke 20 anyị. Otú ọ dị, ọdachi kachasị ọdachi nile na-ejikere ime n’ọdịnihu dị nso. Gịnị ka ọ bụ? Ọ bụ “mkpagbu ukwu . . . nke ihe dị ka ya a ka adịghị site ná mmalite ụwa ruo mgbe a, ee e, ọ gaghị adịkwa ma ọlị.” (Matiu 24:21) Otú ọ dị, ọtụtụ n’ime anyị na-elepụ anya n’ihu n’ọdịnihu nke ọṅụ! N’ihi gịnị? N’ihi na Okwu Chineke n’onwe ya na-akọwa “oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile, pụta . . . Ndị a bụ ndị na-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta . . . Agụụ agaghị agụ ha ọzọ, akpịrị agaghị akpọkwa ha nkụ ọzọ . . . Chineke ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha.”—Mkpughe 7:1, 9, 14-17.

2. Amaokwu ndị mbụ nke Matiu 24, Mak 13, na Luk 21 nwere mmezu mbụ dị aṅaa nke amụma?

2 Ihe ndekọ sitere n’ike mmụọ nsọ nke dị na Matiu 24:3-22, Mak 13:3-20, na Luk 21:7-24 na-ewebata nkọwa amụma Jisọs nyere “ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a.”a Amụma nke a nwere mmezu mbụ n’usoro ihe rụrụ arụ nke ndị Juu narị afọ mbụ nke Oge Anyị, na-abịa ná njedebe ná “mkpagbu ukwu” nke na-enweghị atụ n’ahụ ndị Juu. A kwaturu usoro okpukpe na ndọrọ ndọrọ ọchịchị dum nke usoro ihe ndị Juu, nke hiwere isi n’ụlọ nsọ Jerusalem, n’enweghị mweghachi ma ọlị.

3. N’ihi gịnị ka o ji dị ngwa na anyị ṅara ntị taa n’amụma Jisọs?

3 Ugbu a ka anyị tụlee ọnọdụ ndị gbara mmezu mbụ nke amụma Jisọs gburugburu. Nke a ga-enyere anyị aka karị ịghọta mmezu yiri ya taa. Ọ ga-egosi anyị otú ọ dịruru ngwa ime ihe ugbu a iji lanarị mkpagbu kachasị mkpagbu nile nke na-eyi ihe nile a kpọrọ mmadụ egwu.—Ndị Rom 10:9-13; 15:4; 1 Ndị Kọrint 10:11; 15:58.

“Ọgwụgwụ”—Olee Mgbe?

4, 5. (a) N’ihi gịnị ka ndị Juu na-atụ egwu Chineke na narị afọ mbụ O.A. ji nwee mmasị n’amụma nke Daniel 9:24-27? (b) Olee otú e si mezuo amụma a?

4 N’ihe dị ka n’afọ 539 T.O.A., e nyere onye amụma Chineke bụ́ Daniel ọhụụ nke ihe ndị gaje ime n’ime “izu” ikpeazụ nke “[iri izu asaa]” nke afọ. (Daniel 9:24-27) “Izu” ndị a malitere na 455 T.O.A mgbe Eze Ataksakses nke Peasia nyere iwu iwughachi obodo Jerusalem. “Izu” ikpeazụ ahụ malitere site ná mpụta nke Mesaịa ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst, n’oge e mere ya baptism, teekwa ya mmanụ na 29 O.A.b Ndị Juu na-atụ egwu Chineke na narị afọ mbụ O.A. maara akụkụ a nke oge nke amụma Daniel nke ọma. Dị ka ihe atụ, banyere ìgwè mmadụ ahụ nutere ịbịa nụrụ nkwusa nke Jọn Onye Na-eme Baptism na 29 O.A., Luk 3:15 na-ekwu, sị: “Ndị Juu nọ na-ele anya, mgbe mmadụ nile na-atụgharịkwa n’obi ha ihe banyere Jọn, ma eleghị anya ya onwe ya bụ Kraịst ahụ.”

5 “Izu” nke 70 ahụ gaje ịbụ afọ asaa nke ihu ọma pụrụ iche e gosiri ndị Juu. Malite na 29 O.A., ọ gụnyere baptism na ozi Jisọs, ọnwụ ịchụ àjà ya “ná nkera izu ahụ” na 33 O.A., na “nkera izu” ọzọ ruo 36 O.A. N’ime “izu” a, ohere nke ịghọ ndị na-eso ụzọ e tere mmanụ nke Jisọs bụ nke e nyere nanị ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ndị Juu bụ́ ndị na-atụ egwu Chineke. E mesịa na 70 O.A., oge a na-amaghị tupu mgbe ahụ, ndị agha Rom n’okpuru nduzi Titus, kpochapụrụ usoro ihe nke ndị Juu ahụ si n’ezi ofufe dapụ.—Daniel 9:26, 27.

6. Olee otú “ihe arụ” ahụ si malite ime ihe na 66 O.A., oleekwa otú ndị Kraịst si meghachi omume?

6 E si otú a bibie usoro ndị nchụàjà nke ndị Juu, bụ́ nke metọworo ụlọ nsọ Jerusalem ma soro gbaa izu n’ogbugbu nke Ọkpara Chineke n’onwe ya. E bibikwara ihe ndekọ mba ahụ na nke ebo dị iche iche. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ dịghị onye Juu pụrụ ịzọrọ ihe nketa nke onye nchụàjà ma ọ bụ eze n’ụzọ iwu kwadoro. Otú ọ dị, n’ụzọ na-enye obi ụtọ, e kewapụwo ndị Juu ime mmụọ e tere mmanụ iche dị ka ndị nchụàjà bụkwa eze iji “kwusaa ịdị mma nile” nke Jehova Chineke. (1 Pita 2:9) Mgbe mbụ ndị agha Rom gbara Jerusalem gburugburu ọbụna gwuo ala n’okpuru ebe nile gbara ụlọ nsọ ahụ gburugburu na 66 O.A., ndị Kraịst matara ndị agha ahụ dị ka “ihe arụ nke na-akpata ịtọgbọrọ n’efu, nke e kwuru site n’ọnụ Daniel onye amụma, ka ọ na-eguzo n’ebe nsọ.” Ná nrubeisi nye iwu amụma Jisọs, ndị Kraịst nọ na Jerusalem na Judia gbalagara n’ebe ugwu maka nchebe.—Matiu 24:15, 16; Luk 21:20, 21.

7, 8. “Ihe ịrịba ama” dị aṅaa ka ndị Kraịst hụrụ, ma gịnị ka ha na-amaghị?

7 Ndị Kraịst ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi bụ́ ndị Juu hụrụ mmezu amụma Daniel ma jiri anya ha hụ agha ọjọọ ndị ahụ, ụnwụ nri, ajọ ọrịa na-efe efe, ala ọma jijiji, na mmebi iwu ndị Jisọs buru n’amụma dị ka akụkụ nke “ihe ịrịba ama . . . nke ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a.” (Matiu 24:3, NW) Ma Jisọs ọ̀ gwawo ha mgbe Jehova ga-emezu n’ezie ihe e kpere n’ikpe n’ahụ usoro ihe ahụ rụrụ arụ? Ee e. Ihe o buru n’amụma banyere njedebe nke ọnụnọ ya dị ka eze n’ọdịnihu metụtakwara n’ezie “mkpagbu ukwu” ahụ nke narị afọ mbụ: “Banyere ụbọchị na oge hour ahụ, ọbụna ndị mmụọ ozi nke eluigwe amataghị, Ọkpara ahụ amataghịkwa, kama ọ bụ nanị Nna m matara.”—Matiu 24:36.

8 Site n’amụma Daniel, ndị Juu pụrụ ịgbakọtaworị oge mpụta Jisọs dị ka Mesaịa ahụ. (Daniel 9:25) Ma e nyeghị ha oge ọ bụla maka “mkpagbu ukwu” ahụ nke mesịrị bibie usoro ihe ndị Juu dapụrụ n’ezi ofufe. Ọ bụ nanị mgbe mbibi Jerusalem na ụlọ nsọ ya gasịrị ka ha ghọtara na oge ahụ bụ 70 O.A. Otú ọ dị, ha maararịị banyere okwu amụma Jisọs bụ: “Ọgbọ a agaghị agabiga ma ọlị, ruo mgbe ihe ndị a nile ga-eme.” (Matiu 24:34) N’ụzọ doro anya, ojiji e ji “ọgbọ” mee ihe n’ebe a dị iche na nke ahụ dị n’Eklisiastis 1:4, bụ nke na-ekwu banyere ọgbọ ndị na-abịa ma na-ala ruo ogologo oge ụfọdụ.

“Ọgbọ A”—Gịnị Ka Ọ Bụ?

9. Olee otú akwụkwọ ọkọwa okwu si akọwa okwu Grik ahụ bụ́ ge·ne·aʹ?

9 Mgbe ndị ozi anọ ha na Jisọs nọ n’elu Ugwu Olive nụrụ amụma ya banyere “ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a,” olee otú ha ga-esi ghọta okwu ahụ bụ “ọgbọ a”? N’Oziọma ndị ahụ, a sụgharịtara okwu bụ́ “ọgbọ” site n’okwu Grik bụ́ ge·ne·aʹ, bụ́ nke akwụkwọ ọkọwa okwu ndị nke oge a na-akọwa n’okwu ndị a: “N’[ụzọ] nkịtị ndị si[tere] n’otu nna ochie.” (A Greek-English Lexicon of the New Testament nke Walter Bauer) “Ihe ahụ a mụworo, ezinụlọ; . . . ndị na-esote ibe ha n’otu usoro ọmụmụ . . . ma ọ bụ nke otu agbụrụ mmadụ . . . ma ọ bụ nke ìgwè mmadụ nile na-ebi ndụ n’otu oge, Mat. 24:34; Mak 13:30; Luk 1:48; 21:32; Fil. 2:15, na karịsịa ndị sitere n’agbụrụ ndị Juu na-ebi ndụ n’otu oge.” (An Expository Dictionary of New Testament Words nke W. E. Vine) “Ihe ahụ a mụworo, ndị sitere n’otu nna, otu ezinụlọ; . . . ìgwè mmadụ nile na-ebi ndụ n’otu oge: Mt. xxiv. 34; Mk. xiii. 30; Lk i. 48 . . . bụ nke e ji eme ihe karị[sịa] n’ebe agbụrụ ndị Juu na-ebi ndụ n’otu oge ahụ dị.”—A Greek-English Lexicon of the New Testament nke J. H. Thayer.

10. (a) Nkọwa dị aṅaa yiri ibe ha ka akwụkwọ abụọ nyere n’ihota Matiu 24:34? (b) Olee otú akwụkwọ ọkọwa okwu nkà mmụta okpukpe na nsụgharị ụfọdụ nke Bible si akwado nkọwa nke a?

10 Otú a, ma Vine ma Thayer hotara Matiu 24:34 n’ịkọwa “ọgbọ a” (he ge·ne·aʹ hauʹte) dị ka “ìgwè mmadụ nile na-ebi ndụ n’otu oge.” Akwụkwọ bụ́ Theological Dictionary of the New Testament (1964) na-akwado nkọwa nke a, na-asị: “Ojiji Jisọs ji ‘ọgbọ’ mee ihe na-egosipụta nzube ya zuru ezu: ọ na-elekwasị anya ná ndị ahụ dum, ọ makwaara banyere ịdị n’otu ha ná mmehie.” N’eziokwu, a pụrụ ịhụ ‘ịdị n’otu ná mmehie’ ná mba ndị Juu mgbe Jisọs nọ n’elu ala, dịkwa nnọọ ka e si jiri ya mara usoro ụwa nke taa.c

11. (a) Olee onye kwesịrị iduzi anyị n’ụzọ bụ isi n’ikpebi ụzọ isi jiri he ge·ne·aʹ hauʹte mee ihe? (b) Olee otú onye a si jiri okwu a mee ihe?

11 N’ezie, ndị Kraịst na-amụ okwu a na-eji ụzọ ndị ahụ e nyere ike mmụọ nsọ dere Oziọma si jiri okwu Grik ahụ bụ́ he ge·ne·aʹ hauʹte, ma ọ bụ “ọgbọ a” mee ihe na-eduzi echiche ha n’ụzọ bụ́ isi n’ịkọ banyere okwu Jisọs. A nọgidere jiri okwu ahụ mee ihe n’otu ụzọ ahụ n’echiche nke ihe na-adịghị mma. N’ihi ya, Jisọs kpọrọ ndị ndú okpukpe bụ́ ndị Juu ‘agwọ, ụmụ ajụala’ ma gaa n’ihu ikwu na a ga-emezu ikpe nke Gehena n’ahụ “ọgbọ a.” (Matiu 23:33, 36) Otú ọ dị, ọ̀ bụ nanị ndị ụkọchukwu ihu abụọ nke okpukpe ka ikpe a metụtara? Ọ dịghị ma ọlị. Ọtụtụ mgbe, ndị na-eso ụzọ Jisọs nụrụ ka o kwuru okwu banyere “ọgbọ a,” na-eji okwu ahụ eme ihe n’otu ụzọ ahụ n’echiche sara nnọọ mbara karị. Gịnị ka ọ bụ?

“Ajọ Ọgbọ A”

12. Ka ndị na-eso ụzọ ya nọ na-ege ntị, olee otú Jisọs si jikọta “ìgwè mmadụ” na “ọgbọ a”?

12 Na 31 O.A., n’oge ozi dị ukwuu nke Jisọs na Galili, ntakịrị oge kwa ka Ememe Ngabiga ahụ gasịrị, ndị na-eso ụzọ ya nụrụ ka ọ gwara “ìgwè mmadụ,” sị: “M̀ ga-eji ọgbọ a tụnyere gịnị? O yiri ụmụntakịrị ndị na-anọdụ n’ọmà ahịa, ndị na-akpọ ibe ha òkù, sị, Anyị gbuuru unu ọjà, ma unu eteghị egwú; anyị kwara ákwá, ma unu etighị aka n’obi. N’ihi na Jọn [Onye Na-eme Baptism] bịara n’erighị ihe oriri n’aṅụghịkwa ihe ọṅụṅụ, ha wee sị, O nwere mmụọ ọjọọ. Nwa nke mmadụ [Jisọs] bịara na-eri ihe oriri na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, ha wee sị, Lee, onye ori nke ukwu, na onye oké ọṅụ mmanya, enyi ndị ọna ụtụ na ndị mmehie!” “Ìgwè mmadụ” ahụ na-enweghị ụkpụrụ na-achị ha enweghị mmeta!—Matiu 11:7, 16-19.

13. N’ihu ndị na-eso ụzọ ya, ole ndị ka Jisọs kọwara ma katọọ dị ka “ajọ ọgbọ a”?

13 Ka e mesịrị na 31 O.A., ka Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya malitere njem nkwusa ha nke abụọ na Galili, “ụfọdụ n’etiti ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii” jụrụ Jisọs maka ihe ịrịba ama. Ọ gwara ha na “ìgwè mmadụ” ndị nọ n’ebe ahụ, sị: “Ajọ ọgbọ nke na-akwakwa iko na-achọ ihe ịrịba ama; a gaghị enyekwa ya ihe ịrịba ama ma ọ bụghị ihe ịrịba ama nke Jona onye amụma: n’ihi na dị ka Jona nọrọ ụbọchị atọ ehihie na abalị n’afọ oké anụ mmiri; otú a Nwa nke mmadụ ga-anọ n’obi nke ala ụbọchị atọ ehihie na abalị. . . . Otú a ka ọ ga-adịkwara ajọ ọgbọ a.” (Matiu 12:38-46) N’ụzọ doro anya, “ajọ ọgbọ a” gụnyere ma ndị ndú okpukpe ma “ìgwè mmadụ” ahụ ndị ọ na-adịghị mgbe ha bịara ghọta ihe ịrịba ama ahụ nke e mezuru n’ọnwụ na mbilite n’ọnwụ nke Jisọs.d

14. Ndị na-eso ụzọ Jisọs nụrụ mgbe o mere nkatọ dị aṅaa nke ndị Sadusii na ndị Farisii?

14 Mgbe Ememe Ngabiga nke 32 O.A. gasịrị, ka Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya batara n’ógbè Galili bụ́ Magadan, ndị Sadusii na ndị Farisii jụkwara Jisọs ọzọ maka ihe ịrịba ama. Ọ gwaghachikwara ha, sị: “Ajọ ọgbọ nke na-akwakwa iko na-achọ ihe ịrịba ama; ma a gaghị enye ya ihe ịrịba ama, ma ọ bụghị ihe ịrịba ama nke Jona.” (Matiu 16:1-4) N’ezie ụta dịịrị ndị ihu abụọ ahụ nke okpukpe karịsịa dị ka ndị ndú n’etiti “ìgwè” mmadụ ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi bụ́ ndị Jisọs katọrọ dị ka “ajọ ọgbọ a.”

15. Kpọmkwem tupu nakwa mgbe nnwogha ahụ gasịrị, nzute dị aṅaa ka Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya na “ọgbọ a” zutere?

15 Ka ọ na-eru ná ngwụsị nke ozi Galili ya, Jisọs kpọrọ ìgwè mmadụ ahụ na ndị na-eso ụzọ ya ka ha bịakwute ya wee, sị: “Onye ọ bụla ihere Mụ onwe m na okwu m nile ga-eme n’ọgbọ a nke na-akwa iko, nke na-emehiekwa, ihere onye ahụ ga-emekwa Nwa nke mmadụ.” (Mak 8:34, 38) Ya mere ìgwè ndị Juu nke oge ahụ na-enweghị nchegharị n’ụzọ doro anya mejupụtara “ajọ ọgbọ a nke na-akwa iko, nke na-emehiekwa.” Ụbọchị ole na ole n’ihu, mgbe nnwogha Jisọs gasịrị, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya “bịakwutere ìgwè mmadụ ahụ,” otu nwoke rịọkwara ya ka ọ gwọọ nwa ya nwoke. Jisọs kwuru, sị: “Ọgbọ na-enweghị okwukwe, nke nwekwara anya uhie, ruo ole mgbe ka Mụ na unu ga-anọ? ruo ole mgbe ka M ga-anagide unu?”—Matiu 17:14-17; Luk 9:37-41.

16. (a) Nkatọ dị aṅaa nke “ìgwè mmadụ” ahụ ka Jisọs kwughachiri na Judia? (b) Olee otú “ọgbọ a” si bịa mee mpụ kachasị njọ?

16 Ma eleghị anya ọ bụ na Judia, mgbe Ememe Ụlọ Ntu nke 32 O.A. gasịrị, “mgbe ìgwè mmadụ na-ezukọ” gburugburu Jisọs, ka o kwughachiri nkatọ ọ katọrọ ha, na-asị: “Ọgbọ a bụ ajọ ọgbọ: ọ na-achọ ihe ịrịba ama; a gaghị enyekwa ya ihe ịrịba ama ma ọ bụghị ihe ịrịba ama nke Jona.” (Luk 11:29) N’ikpeazụ, mgbe ndị ndú okpukpe kpụtara Jisọs maka ikpe ya ikpe, Paịlet kwuru ka ya tọhapụ ya. Ihe ndekọ ahụ na-asị: “Ndị isi nchụàjà na ndị okenye rafuru ìgwè mmadụ nile ka ha rịọ ya Barabas, ma laa Jisọs n’iyi. . . . Paịlet sị ha, Ọ̀ bụ gịnị ka m ga-emekwa Jisọs Onye a na-akpọ Kraịst? Ha nile sị, Ka a [kpọgbuo ya, NW]. O wee sị, Ee e, n’ihi na Ò mere ihe ọjọọ gịnị? Ma ha tibigara mkpu ókè, sị, Ka a [kpọgbuo ya, NW].” “Ajọ ọgbọ” ahụ na-achọ ka e gbuo Jisọs!—Matiu 27:20-25.

17. Olee ụzọ ụfọdụ ndị n’ime “ọgbọ a gbagọrọ agbagọ” si meghachi omume ná nkwusa Pita na Pentikọst?

17 “Ọgbọ na-enweghị okwukwe, nke nwekwara anya uhie,” n’ịbụ ndị ndú okpukpe ya kwaliri, si otú a kere òkè bụ isi n’ịkpata ọnwụ nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Iri ụbọchị ise n’ihu, na Pentikọst na 33 O.A., ndị na-eso ụzọ ahụ natara mmụọ nsọ wee malite ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche. Mgbe ha nụrụ ụzụ ahụ, “ọha mmadụ gbakọrọ,” Pita onyeozi wee kpọọ ha “ndị ikom Judia, na unu nile ndị bi na Jerusalem,” na-asị: “Onye a [Jisọs] . . . ka unu kpọgidere [n’elu osisi, NW] gbuokwa site n’aka ndị na-amaghị iwu.” Olee otú ụfọdụ n’ime ndị ahụ na-ege ntị si meghachi omume? “E wee dụọ ha n’ime obi ha.” Mgbe ahụ Pita rịọrọ ha ka ha chegharịa. O “jikwa ọtụtụ okwu ọzọ kwusie okwu ike, na-arịọkwa ha, sị, Zọpụtanụ onwe unu n’ọgbọ a dị mgbagọ.” Ná nzaghachi, ihe dị ka puku mmadụ atọ “naara okwu ya nke ọma, e mee[kwa] ha baptism.”—Ọrụ 2:6, 14, 23, 37, 40, 41.

E Mee Ka A Mata “Ọgbọ A”

18. Ojiji Jisọs ji okwu bụ́ “ọgbọ a” mee ihe nọgidere na-ezo aka na gịnị?

18 Mgbe ahụ, gịnị bụ “ọgbọ” ahụ nke Jisọs zoro aka na ya ọtụtụ ugboro n’ihu ndị na-eso ụzọ ya? Gịnị ka ha ghọtara n’okwu ya bụ́: “Ọgbọ a agaghị agabiga ma ọlị, ruo mgbe ihe ndị a nile ga-eme”? N’ezie, Jisọs adịghị agbanwe ụzọ doro anya o si eji okwu ahụ bụ́ “ọgbọ a” eme ihe, bụ́ nke o jiri mee ihe n’otu ụzọ ahụ n’ebe ìgwè mmadụ dịrị ndụ n’oge ya nọ ha na ndị ‘ndị ndú ha kpuru ìsì’ bụ́ ndị ha na ha jikọrọ aka mejupụta mba ndị Juu. (Matiu 15:14) “Ọgbọ a” hụrụ ihe isi ike nile Jisọs buru n’amụma ma gabiga ná “mkpagbu ukwu” na-enweghị atụ nke bịakwasịrị Jerusalem.—Matiu 24:21, 34.

19. Olee mgbe, n’ụzọ dịkwa aṅaa ka “eluigwe na ala” nke usoro ihe ndị Juu si gabiga?

19 Na narị afọ mbụ, Jehova nọ na-ekpe ndị Juu ikpe. Ndị chegharịrịnụ, bụ́ ndị bịara gosi okwukwe ná ndokwa obi ebere Jehova mere site n’aka Kraịst, bụ ndị a zọpụtara pụọ ná “mkpagbu ukwu” ahụ. N’ezie dị ka okwu Jisọs si dị, ihe nile e buru n’amụma mere, mgbe ahụkwa “eluigwe na ala” nke usoro ihe ndị Juu—mba ahụ dum, tinyere ndị ndú okpukpe ya na ajọ ọha mmadụ ya—gabigara. Jehova emezuwo ihe e kpere n’ikpe!—Matiu 24:35; tụlee 2 Pita 3:7.

20. Ndụmọdụ dị aṅaa bịara n’oge ya na-emetụta ndị Kraịst n’ụzọ dị ngwa?

20 Ndị Juu ahụ ṅararịị ntị n’okwu amụma Jisọs ghọtara na nzọpụta ha dabeere, ọ bụghị n’ịgbalị ịgbakọ otú otu “ọgbọ” na-adịru n’ogologo ma ọ bụ “oge ma ọ bụ ụbọchị” ụfọdụ a kara aka, kama n’ịnọpụ iche n’ọgbọ ọjọọ nke dị n’oge ha na iji ịnụ ọkụ n’obi na-eme uche Chineke. Ọ bụ ezie na okwu ndị ikpeazụ nke amụma Jisọs metụtara mmezu ka ukwuu n’ụbọchị anyị, ọ dịkwa ndị Juu bụ ndị Kraịst na narị afọ mbụ mkpa ịṅa ntị na ndụmọdụ ahụ bụ́: “Mụrụnụ anya n’oge ọ bụla, na-arịọ arịrịọ, ka unu wee ka n’ike ịgbanarị ihe nile ndị a nke gaje ime, na iguzo n’ihu Nwa nke mmadụ.”—Luk 21:32-36; Ọrụ 1:6-8.

21. Ihe omume mberede dị aṅaa ka anyị pụrụ ịtụ anya ya n’ọdịnihu dị nso?

21 Taa, “oké ụbọchị nke Jehova . . . dị nso, ọ na-emekwa ngwa nke ukwuu.” (Zefanaịa 1:14-18; Aịsaịa 13:9, 13) Na mberede, ‘n’ụbọchị na oge hour’ nke Jehova buru ụzọ kpebie n’onwe ya, a ga-awụpụ iwe ya n’ahụ akụkụ okpukpe, ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na azụmahịa nke ụwa, tinyere ndị isi ike bụ́ ndị mejupụtara “ajọ ọgbọ nke na-akwakwa iko” nke dị ugbu a. (Matiu 12:39; 24:36; Mkpughe 7:1-3, 9, 14) Olee otú a pụrụ isi zọpụta gị pụọ ná “mkpagbu ukwu” ahụ? Isiokwu anyị ọzọ ga-aza ma kọọ banyere olileanya dị ebube maka ọdịnihu.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Maka nkọwa sara mbara nke amụma a, biko lee chaatị dị na peji nke 14, 15 nke Ụlọ Nche nke February 15, 1994.

b Maka inwetakwu ihe ọmụma banyere “izu” nke afọ ndị ahụ, lee peji nke 130-132 nke akwụkwọ bụ́ The Bible—God’s Word or Man’s?, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

c Bible ụfọdụ na-asụgharị he ge·ne·aʹ hauʹte dị na Matiu 24:34 otú a: “ndị nke a” (The Holy Bible in the Language of Today [1976], nke W. F. Beck dere); “mba a” (The New Testament—An Expanded Translation [1961], nke K. S. Wuest dere); “ndị nke a” (Jewish New Testament [1979], nke D. H. Stern dere).

d A gaghị eji “ìgwè mmadụ” a na-ekwesịghị ntụkwasị obi tụnyere ndị ʽam-ha·ʼaʹret ahụ, ma ọ bụ “ndị nke ala,” bụ́ ndị ndị ndú okpukpe ahụ dị mpako jụrụ iso kpakọrịta, ma bụrụ ndị Jisọs nwere “ọmịiko” n’ahụ ha.—Matiu 9:36; Jọn 7:49.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

◻ Gịnị ka anyị na-amụta site ná mmezu nke Daniel 9:24-27?

◻ Olee otú akwụkwọ ọkọwa okwu ndị nke oge a si akọwa “ọgbọ a” dị ka e si jiri ya mee ihe na Bible?

◻ Olee otú Jisọs si nọgide jiri okwu bụ́ “ọgbọ” mee ihe n’otu ụzọ ahụ?

◻ Olee otú e si mezuo Matiu 24:34, 35 na narị afọ mbụ?

[Foto dị na peeji nke 12]

Jisọs ji “ọgbọ a” tụnyere ìgwè ụmụaka isi ike

[Foto dị na peeji nke 15]

Ọ bụ nanị Jehova maara tupu oge eruo oge hour maka imezu ihe e kpere n’ikpe n’ahụ ajọ usoro ihe ndị Juu

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya