Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w12 3/1 p. 23
  • Nkụzi Atọ n’Ime Otu ò si na Baịbụl?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nkụzi Atọ n’Ime Otu ò si na Baịbụl?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ònye Bụ “Nanị Ezi Chineke Ahụ”?
    Teta!—2005
  • Akụkụ 1—Jisọs na Ndị Na-eso Ụzọ Ya Hà Kụziri Ozizi Atọ n’Ime Otu?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ì Kwesịrị Ikwere Ya?
    Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?
  • Chineke Ọ̀ Bụ Atọ n’Ime Otu Dị Ngọzi?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
w12 3/1 p. 23

Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . .

Nkụzi Atọ n’Ime Otu ò si na Baịbụl?

▪ E nwere ọtụtụ ụzọ ndị mmadụ si akọwa nkụzi Atọ n’Ime Otu. Otu n’ime ha bụ na “e nwere Chukwu atọ (Nna, Ọkpara, na Mmụọ Nsọ), nke ọ bụla n’ime ha na-adịru ebighị ebi, nke ọ bụla n’ime ha pụrụ ime ihe niile, ọ dịghị nke ka ibe ya ma ọ bụ nke dị ala karịa ibe ya, a sịrị na nke ọ bụla n’ime ha bụ Chineke, sịkwa na ha abụghị Chineke atọ, kama otu Chineke.” Nkụzi a ò si na Baịbụl?

Ebe ndị mmadụ na-agbakwasịkarị ụkwụ akụzi Atọ n’Ime Otu bụ na Matiu 28:19. Lee otú Bible Nsọ Ọhụụ si sụgharịa ihe Jizọs kwuru n’amaokwu ahụ: “Ya mere, gaanụ, mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptizm n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmọọ Nsọ.” N’eziokwu, a kpọrọ Nna, Ọkpara, na mmụọ nsọ aha n’amaokwu ahụ. Ma, amaokwu ahụ ekwughị na ha atọ bụ otu. Mgbe Jizọs kwuru ihe e dere n’amaokwu ahụ, ọ nọ na-agwa ndị na-eso ụzọ ya, bụ́ ndị Juu, ka ha gaa kụziere ndị mmadụ ihe ma na-eme ha baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ. Ma mba Izrel, ma ọ bụ ndị Juu, hà kweere n’Atọ n’Ime Otu?

Mgbe Chineke si n’aka Mozis nye mba Izrel Iwu ya, bụ́ nke dị na Baịbụl, a gwara ụmụ Izrel, sị: “Ya adịla mgbe ị ga-enwe chi ọ bụla ọzọ tinyere m.” (Diuterọnọmi 5:7) Ọ̀ bụ Chineke ole nyere iwu a? Azịza ya doro anya n’ihi na Diuterọnọmi 6:4 kwuru, sị: “Nụrụ, Izrel: Jehova bụ́ Chineke anyị bụ otu Jehova,” ọ bụghị Chineke atọ nke dị n’otu Chineke. Mgbe e nyere mba Izrel iwu a, ha ka si n’Ijipt pụta bụ́ ebe ndị mmadụ na-efe Osaịris, Aịsis, na Họres (ị ga-ahụ ha n’aka ekpe). Osaịris, Aịsis, na Họres so n’ọtụtụ chi atọ n’ime otu ndị Ijipt na-efe ofufe. N’ihi ya, e nyere ndị Izrel iwu ka ha na-efe naanị otu Chineke. Gịnị mere o ji dị mkpa ka ndị mmadụ ghọta iwu a nke ọma? Otu onye nkụzi ndị Juu, nke aha ya bụ Dọkịta J. H. Hertz, kwuru, sị: “Otú a e si gwa ha hoo haa ka ha fewe otu chi mere ka o doo anya na a chọtụdịghị iji ntị nụ na ha fere ọtụtụ chi . . . Shema [ya bụ, iwu ahụ e nyere na Diuterọnọmi 6:4, nke bụ́, “Nụrụ, Izrel: Jehova bụ́ Chineke anyị bụ otu Jehova] gosiri na atọ n’ime otu Ndị Kraịst na-akụzi abụghị eziokwu n’ihi na ozizi atọ n’ime otu na-ekwu na Chineke dị atọ.”a

Ebe ọ bụ na Jizọs bụ onye Juu, a kụziiri ya ka o rube isi n’iwu ahụ e nyere ndị Izrel. Mgbe e mechara Jizọs baptizim, Ekwensu bịara nwaa ya ọnwụnwa, Jizọs asị ya: “Si ebe a pụọ, Setan! N’ihi na e dere, sị, ‘Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka ị na-aghaghị ife ofufe, ọ bụkwa naanị ya ka ị na-aghaghị ijere ozi dị nsọ.’” (Matiu 4:10; Diuterọnọmi 6:13) Ọ dịkarịa ala, e nwere ụzọ ihe abụọ anyị nwere ike ịmụta n’ọnwụnwa ahụ Ekwensu nwara Jizọs. Nke mbụ bụ na Setan nọ na-agbalị ime ka Jizọs fee onye ọzọ na-abụghị Jehova. Ọ bụrụ na Jizọs na Jehova bụ otu Chineke, Setan agaraghị agbalịwa ime ka Jizọs fee onye ọzọ na-abụghị Jehova. Nke abụọ bụ na Jizọs mere ka o doo anya na e nwere naanị otu Chineke onye e kwesịrị ife ofufe n’ihi na o kwuru na ‘ọ bụ naanị Chineke gị ka ị na-aghaghị ife ofufe.’ A sị na e nwere Atọ n’Ime Otu, Jizọs gaara asị ‘ọ bụ naanị anyị ka ị na-aghaghị ife ofufe.’

Mgbe ndị mmadụ mụtara eziokwu banyere Chineke ma kpebie ife ya, a “na-eme ha baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ.” (Matiu 28:19) Nke a pụtara na ha ghọtara na Jehova bụ onye kacha elu nakwa na ha kwetara irubere ya isi. Ọ pụtakwara na ha ghọtara ọrụ Jizọs Kraịst na-arụ n’imezu nzube Jehova ma kweta irubere ya isi. (Abụ Ọma 83:18; Matiu 28:18) Ihe ọzọ ọ pụtara bụ na ha ghọtakwara ọrụ mmụọ nsọ Chineke na-arụ, ghọtakwa na ọ bụ ike Chineke nke nọ n’ọrụ.—Jenesis 1:2; Ndị Galeshia 5:22, 23; 2 Pita 1:21.

Ozizi Atọ n’Ime Otu emegharịala ndị mmadụ anya kemgbe ọtụtụ narị afọ. Ma, Jizọs mere ka ndị na-eso ụzọ ya ghọta nke bụ́ eziokwu ma nyere ha aka ka ha bịaruo Jehova nso, bụ́ “onye naanị ya bụ ezi Chineke.”—Jọn 17:3.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Ihe ahụ e kwuru na Diuterọnọmi 6:4 so n’ekpere ndị Juu na-ekpe n’ụlọ nzukọ ha.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji nke 23]

Musée du Louvre, Paris

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya