Isi 16
Nhọrọ E Ji Aka na Ọ Ga-enye Ndụ nke Ezi Udo na Ntụkwasị Obi
1. Ọ bụrụ na anyị emee nhọrọ nke ziri ezi, udo na nchekwube dị aṅaa ka anyị pụrụ inwe ugbu a?
LEE ihe ọṅụ ọ bụ inweta ezi nzube n’ịdị ndụ, ịmara ebe ị na-eje! Leekwa udo nke uche na obi a na-enweta site n’ijide n’aka na ọ dịghị ụzọ ka mma ị pụrụ ịgbaso! Ụdị udo na nchekwube nke a ga-abụ nke gị nanị ma ọ bụrụ na i mee nhọrọ nke ziri ezi ugbu a.
2. Olee otú anyị ịmata Jehova na nzube ya nile ga-esi nyere anyị aka n’ihe banyere otú anyị si ele ndụ anya?
2 O doro anya na anyị apụghị ile ụwa anya dị ka ebe ezi udo na ntụkwasị obi ga-esi bịa. Usoro azụmahịa, okpukpe, na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, tinyere òtù United Nations na nkwupụta ya nke ‘udo na ntụkwasị obi’ apụghị iweta ya. Ya mere, Bible na-ezoro anyị aka n’ebe Jehova Chineke nọ dị ka nanị Isi Iyi e nwere maka ezi udo na ịnọ ná ntụkwasị obi. Ịmara ya na nzube ya nile na-enyere anyị aka ịghọta ihe mere anyị ji nọrọ ebe a n’elu ala, nakwa ihe mere ihe jiri dị otú ọ dị taa. Anyị na-amụta oké ihe iseokwu ahụ metụtara ọkaaka Jehova nke eluigwe na ụwa, na ụzọ o si emetụta onye ọ bụla n’ime anyị. Anyị na-amụta ịnwale izi ezi na amamihe nke dị n’ihe mgbaru ọsọ anyị, anyị na-enwetakwa ụkpụrụ omume ziri ezi anyị ga-esite na ya dị ndụ. Mgbe anyị na-eche ọrịa, ịka nká, ma ọ bụ ọnwụ ihu, anyị na-enwe olileanya na-akasi obi nke ndụ n’ime usoro ihe ọhụrụ nke ezi omume na ahụ ike, ọbụna site ná mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa.
3. N’ihi gịnị ka Jehova ji bụrụ onye anyị ga-atụkwasị obi anyị nile?
3 Ka a sịkwanụ ihe mere Aịsaịa 26:4 ji na-ekwu, sị: “Tụkwasịnụ obi na Jehova ruo mgbe nile ebighị ebi: n’ihi na Jaa Jehova bụ oké nkume nke mgbe nile ebighị ebi.” N’ihi ịbụ onye na-adịghị agbanwe agbanwe, onye kachasị ihe nile elu, onye na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, Jehova bụ n’ezie onye ahụ nke anyị ga-atụkwasị obi na olileanya anyị nile. Ị̀ chọrọ inweta nduzi na nchebe ya ọ bụghị nanị maka ugbu a kamakwa maka oge nile nke ọdịnihu n’ime Usoro Ihe Ọhụrụ ya nke e kwere ná nkwa? Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị ka ị na-aghaghị ime?
4. Iji nweta ihu ọma Jehova, gịnị dị anyị mkpa, gịnị na-emekwa ka o kwe omume?
4 E wezugawo ihe a kpọrọ mmadụ ka ha hà n’ebe Chineke nọ n’ihi mmehie nke nne na nna anyị mbụ. Ma Chineke emeghewo ụzọ maka ịdịghachi n’otu na ịbụenyi anyị na ya site n’àjà nke Ọkpara ya chụrụ. (2 Ndị Kọrint 5:19-21; Ndị Efesọs 2:12, 13) Ma, o zughị anyị ikwu ugbu a nanị na anyị chọrọ ọbụbụenyi Chineke.
5. Gịnị kwesịrị ịbụ ihe na-akpali anyị ịchọ ọbụbụenyi nke Jehova?
5 Anyị ga-adị njikere, ọbụna na-achọsi ike igosipụta nye ya na anyị chọrọ nke a, na ọ bụkwa site n’ezi mkpali. Dị ka ihe atụ, ànyị na-achọ ọbụbụenyi Chineke nanị iji gbanarị ọdachi? Ọ bụrụ na anyị ga-enwe ezi nguzo n’ebe Chineke nọ, ọ gaghị abụ nanị maka oge a dị ngwa tupu ikpe ya eruo ma ọ bụ nanị iji lanarị “mkpagbu ukwu” ahụ nke na-abịa. (Matiu 24:21, 22) Ọ ghaghị ịbụ maka oge nile n’ọdịnihu. Nanị ezi ịhụnanya ga-enye anyị nkwali nke a. Ya mere anyị kwesịrị igosipụta izi ezi nke ọchịchọ obi anyị maka ọbụbụenyi ya, Jehova esetịpụwokwa n’ime Okwu ya ihe ụfọdụ anyị nile n’otu n’otu na-aghaghị ime ka anyị na ya wee dịghachi ná mma.
Okwukwe Dị Ndụ
6. Iji mee ihe ga-atọ Chineke ụtọ, nchekwube dị aṅaa ka anyị na-aghaghị inwe n’ebe ọ nọ?
6 Jehova bụ Chineke nke eziokwu. Ya mere anyị pụrụ inwe ntụkwasị obi zuru ezu ná nkwa ya nile. N’ezie, “ma a sị na okwukwe adịghị ọ bụ ihe a na-apụghị ime, bụ́ ime ihe ga-atọ Chineke ezi ụtọ: n’ihi na onye na-abịakwute Chineke aghaghị ikwe na ọ dị, na ọ na-egosikwa onwe ya onye na-enyeghachi ndị na-achọ ya ụgwọ ọrụ.” (Ndị Hibru 11:6) Ọ bụrụ na i nwere ụdị okwukwe ahụ, mgbe ahụ ị maara na ihe ọ bụla Chineke mere nwere nzube ziri ezi, na o bukwa ọdịmma kasị ukwuu banyere anyị n’obi mgbe dum. Site n’ọrụ okike ya nile nakwa Okwu ya e dere ede, ị na-ahụ na ọ bụghị nanị onye mazuuru ihe nile na onye pụrụ ime ihe nile, kamakwa na ọ bụ Chineke nke nwere ịhụnanya na obi ebere. N’ezie, ọ gaghị agbakụta ụkpụrụ ezi omume ya azụ ma ọlị. Ma, ọ bụ ezie na anyị bụ ndị na-ezughị okè, na-emehiekwa emehie, ọ bụrụ na anyị hụrụ ezi omume n’anya, o nwere ụzọ isi mesoo anyị nke ga-ewe ọtụtụ ngọzi.
7. Olee otú inwe nchekwube n’izi ezi Jehova na amamihe ya ga-esi chebe anyị?
7 N’ihi nke a, mgbe anyị natara ịdọ aka ná ntị sitere n’aka Chineke, anyị ga-amata na ọ bụ maka ọdịmma ebighị ebi anyị. Anyị ga-atụkwasị Jehova obi dị ka nwa nwoke ma ọ bụ nwanyị na-atụkwasị nna ya nke na-ahụ n’anya, nke maara ihe, dịkwa ike. (Abụ Ọma 103:13, 14; Ilu 3:11, 12) Ọ bụrụ na anyị enwee ụdị okwukwe a, anyị agaghị arụ amamihe nke ndụmọdụ ya, ma ọ bụ izi ezi nke ụzọ ya nile, ụka, ọ bụ ezie na mgbe ụfọdụ anyị adịghị aghọtacha ihe ụfọdụ. Site n’ụzọ dị otú ahụ, anyị na-esonye ná ndị ahụ ọbụ abụ kọwara, sị: “Udo nke hiri nne ka ndị na-ahụ iwu gị n’anya nwere; ọ dịghịkwa ihe ịsụ ngọngọ ha nwere.”—Abụ Ọma 119:165; Ilu 3:5-8.
8. (a) Gịnị mere na inwe okwukwe nanị ezughị? (b) Okwukwe kwesịrị ịkpali anyị ime ihe omume dị aṅaa nke a kpọtụrụ uche n’Ọrụ 3:19?
8 Ma “okwukwe bụ ihe nwụrụ anwụ ma ọrụ adịghị ya,” ka Jemes 2:26 na-akọwapụta. Ezi okwukwe na-akpali mmadụ ime ihe. Otu n’ime ihe mbụ ọ na-eme ka mmadụ mee bụ ihe Pita onyeozi na-agba ume, sị: “Chegharịanụ . . . chigharịakwanụ, ka e wee hichapụ mmehie nile unu, ka oge inwe ume ndụ wee si n’ihu [Jehova, NW] bịa n’otú a.” (Ọrụ 3:19) Gịnị ka nke a pụtara?
Ichegharị na Ichigharịkwa
9. (a) Gịnị bụ ezi nchegharị? (b) Ànyị kwesịrị ichegharị site na gịnị?
9 N’ime Bible, nchegharị na-egosi mgbanwe nke uche nke ihe sochiri ya bụ ịkwa ụta sitere n’obi n’ihi ụzọ ndụ ochie ma ọ bụ n’ihe omume dị njọ. (2 Ndị Kọrint 7:9-11) Ma ọ bụrụ na anyị ga-enweta nkwa nke “oge inwe ume ndụ” site n’aka Chineke, anyị agaghị eme nanị nchegharị site n’omume ọjọọ e mere n’oge gara aga. Kama, anyị aghaghị igosi nchegharị n’ihi na anyị matara na, dị ka ụmụ Adam, ọdịdị anyị bụ nke mmehie. Dị ka Jọn onyeozi gosiri: “Ọ bụrụ na anyị asị na anyị enweghị mmehie, anyị na-eduhie onwe anyị . . . anyị na-eme [Chineke] onye ụgha, okwu ya adịghịkwa n’ime anyị. (1 Jọn 1:8, 10) Anyị kwesịrị ịdị nnọọ ka Onye Okike anyị, na-egosipụta ‘oyiyi na ọdịdị ya.’ Ma mmehie e ketara eketa na-eme ka anyị ghara ime otú a n’ụzọ zuru okè. N’ihi ya, anyị ‘adịghị eru akara’ ahụ, nke bụ ihe okwu ahụ bụ “mmehie” pụtara n’ime Bible.—Jenesis 1:26; Ndị Rom 3:23.
10, 11. (a) Ònye ka ndụ anyị dabeere n’ebe ọ nọ, n’ihi gịnịkwa? (b) N’ihi ya, n’ụzọ dị aṅaa ka anyị kwesịrị iji ndụ anyị na-eme ihe?
10 Ya mere mgbaghara Chineke dị anyị mkpa. (Matiu 6:12) Anyị matara na ndụ anyị dabeere n’ebe ọ nọ dị ka Onye Okike anyị. Ma ugbu a anyị na-amụta site n’àjà nke Ọkpara Chineke, e jikwa “ọnụ ahịa” dị ukwuu zụghachikwa ihe a kpọrọ mmadụ. Ya mere anyị ekwesịghị ịbụ “ndị ohu mmadụ,” ọbụna nye ọchịchọ nke onwe anyị. (1 Ndị Kọrint 7:23) Ma, tupu anyị amụta ma nakwerekwa eziokwu, ọ́ bụghị ihe anyị nile bụ?—Jọn 8:31-34.
11 N’ime obi gị, ị na-ewere onyinye Chineke nke Ọkpara ya nakwa ihe o meworo site na Kraịst iji meghee ụzọ mgbapụ pụọ n’ịbụ ohu nke mmehie na ọnwụ dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa? Mgbe ahụ n’ezie, ị ga-echegharị n’ihi ejighị ndụ gị mee ihe n’oge gara aga ná nrubeisi nye Onye Okike gị. Nke ahụ ga-akpali gị ime nchegharị si n’obi n’ihi ịgbasoworị ụzọ ndụ ahụ dị ka nke ụwa, nke na-ekwekọghị n’uche na nzube nile nke Chineke.—Ọrụ 17:28, 30; Mkpughe 4:11.
12. Olee otú onye chegharịworo echegharị si egosi n’ezie na ya ajụwo ụzọ ndụ mbụ ya?
12 Ezi nchegharị nke a na-eduba ‘n’ichigharị’ nke bụ ihe okwu ahụ bụ “ntọghata” pụtara. Onye ahụ nke chegharịrị echegharị n’ezie adịghị enwe mwute nanị n’ihi iji ndụ ya mee ihe na-ezighị ezi. Ọ na-ajụ ụzọ ọjọọ ahụ ma kpọọkwa ụzọ ọjọọ ya asị n’ezie. Ọ na-egosi nke a site ‘n’ichigharị’ ma rụọkwa “ọrụ kwesịrị nchegharị,” na-ewetakwa ndụ ya ka o kwekọọ n’uche Chineke.—Ọrụ 26:20; Ndị Rom 6:11.
13. (a) Gịnị ka okwu Jisọs ahụ nke bụ na ndị na-eso ụzọ ya ‘ga-ajụ onwe ha’ pụtara? (b) N’ihi ihe dị aṅaa ka anyị ji edo onwe anyị n’okpuru Jehova, nke a sikwa aṅaa na-emetụta ndụ anyị?
13 Otu akụkụ nke nchegharị na nchigharị nke a na-agụnye ihe Jisọs kpọrọ ‘ịjụ onwe anyị.’ (Matiu 16:24) Ya bụ, anyị adịghịkwa ebi ndụ ọzọ dị ka ọchịchọ onwe anyị nke na-enweghị mmetụta maka uche na nzube nile nke Chineke si dị. Kama, anyị na-amụta na ndụ anyị na-adabere kpam kpam n’ebe Jehova Chineke nọ dị ka Onye Okike na Onye Nzụtaghachi anyị site n’àjà mgbapụta nke Ọkpara ya. Dị ka Bible si kọwaa ya, ‘anyị enwereghịkwa onwe anyị, n’ihi na o weere ọnụ ahịa gbara anyị.’ (1 Ndị Kọrint 6:19, 20) N’ihi ya, kama iji inwe onwe dị ukwuu nke eziokwu megheere anyị mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, anyị na-edo onwe anyị kpam kpam n’okpuru ime uche Chineke. (Ndị Galetia 5:13; 1 Pita 2:16) Anyị na-emekwa nke a ọ bụghị nanị n’ihi na o ziri ezi, kama n’ihi na anyị hụrụ Jehova Chineke n’anya site ‘n’obi anyị dum, mkpụrụ obi anyị dum, uche anyị dum, na ike anyị dum.’ (Mak 12:29, 30) N’ezie, nke a na-achọ ka onye ọ bụla n’ime anyị dị ndụ nke ịrara onwe ya nye Chineke. Kama ịbụ ihe ibu arọ, ụzọ nke a na-enyere anyị aka inweta ọṅụ ná ndụ dị ka anyị na-enwebeghị ya mbụ.—Matiu 11:28-30.
Ime Nkwupụta Ihu Ọha maka Nzọpụta
14. (a) Mgbe mmadụ ghọtara izi ezi nke Jehova dị ka onyenwe ya, ọ̀ pụrụ isi aṅaa kọwapụta nke a nye Chineke? (b) Dị ka Ndị Rom 10:10 gosiri, ihe ọzọ dị aṅaa ka ọ ga-achọ ime?
14 Ọ bụ ihe dị mma ịkọwapụta n’ekpere okwukwe anyị ná ndokwa nile nke Chineke, na-amata na ọ bụ ya nwe anyị. Ma anyị pụrụ ma kwesịkwa ịchọ iburu nkwupụta nke okwukwe anyị gaa n’ihu, dị ka Ndị Rom 10:10 na-agwa anyị, sị: “A na-eji obi kwere ruo ezi omume; a na-ejikwa ọnụ kwupụta ruo nzọpụta.” ‘Nkwupụta’ nke a nke okwukwe anyị nwere na Jehova na ná ndokwa ya nile kwesịrị isite n’obi nke jupụtara n’ekele. Ime nkwupụta nke a gụnyere ịrara ndụ anyị nye Jehova ime uche ya, na-egosipụta nke a site na baptism ime mmiri.
15. Gịnị mere anyị ga-eji chesie echiche ike banyere baptism ime mmiri?
15 Mgbe Jisọs Kraịst malitere ozi ihu ọha ya, o mere ka Jọn Onye na-eme baptism mikpuo ya na mmiri. Bible kọrọ na Jisọs gwara Chineke mgbe ahụ, sị: “Lee, Abịawo m ime ihe ị na-achọ.” (Ndị Hibru 10:9; Abụ Ọma 40:7, 8) Jisọs nyekwara ndụmọdụ ka e mee ndị nile ghọrọ ndị na-eso ụzọ ya baptism. Ị̀ bụ ụdị onye ahụ nke na-eso ụzọ? Mgbe ahụ baptism gị nke ime mmiri ga-abụ ‘nkwupụta’ nke a.—Matiu 28:19, 20.
16. (a) Olee otú ị pụrụ isi mata ma ì ruwo eru ka e mee gị baptism? (b) Olee otú ndị nlekọta si enyere ndị mmadụ aka ná nkwadebe ha maka baptism?
16 Ọ bụ oké ihe ùgwù mmadụ ịghọ onyeàmà raara onwe ya nye, nke e mekwara baptism nke Jehova, bụ́ Ọkaaka nke eluigwe na ala. Tụleghachi ugbu a ihe nke a gụnyere: Site n’ịhụnanya Jehova emegheworo gị ụzọ ịbụ enyi ya, ma iji nweta ya, ị ghaghị inwe okwukwe, na-ekwere n’ezie na Bible bụ Okwu Chineke nke e dere site n’ike mmụọ nsọ. (2 Timoti 3:16, 17) Ị ghaghị inwekwa okwukwe n’àjà mgbapụta nke Jisọs dị ka nanị ụzọ a pụrụ isi nweta ọnọdụ dị mma n’ebe Chineke nọ. (Ọrụ 4:12) Ọ dị gị mkpa ịghọta ndabere ị dabeere n’ebe Jehova nọ ma dookwa ndụ gị n’okpuru ya ime uche ya, ọ bụghị nanị ruo afọ ole na ole, kama ruo mgbe ebighị ebi. Ụzọ ndụ dị otú ahụ na-agụnye “abụghị akụkụ nke ụwa.” (Jọn 17:16, NW; 1 Jọn 2:15) Dị ka ihe àmà na-egosi na i chegharịwo ma ‘chigharịakwa,’ ị ghaghị ịhapụwo omume ọ bụla nke megidere ụkpụrụ ezi omume Chineke na-emekwa ihe Chineke nyere n’iwu. Ì mewo ka uche gị dị ọhụrụ nke mere na ọ bụ otú a ka i si ele ndụ anya ugbu a? (Ndị Rom 12:1, 2) Ya bụrụ otú ahụ, Bible na-agba gị ume ka i mee ‘nkwupụta’ nke okwukwe dị otú ahụ. Nzọụkwụ mbụ bụ ijekwuru otu n’ime ndị nlekọta nke ọgbakọ Ndịàmà Jehova n’ógbè ebe i bi ma mee ka ọ mara ihe i bu n’uche. Ọ ga-edokwa isoro gị mee ntụleghachi nke ozizi ndị bụ isi nke Bible ná nkwadebe gị maka baptism.
17. Na-eji Bible eme ihe, gosi otú anyị ga-esi nọgide na-eme ‘nkwupụta nke okwukwe anyị.’
17 Nzọụkwụ nke baptism agaghị apụta nkwụsị nke ime ‘nkwupụta ihu ọha nke okwukwe gị.’ Dị ka onye Kraịst raara onwe ya nye Jehova Chineke, ị ga-achọ ikwupụta olileanya gị site n’ịkọwapụta onwe gị ná mgbakọ ọha, ‘na-ekele ya ná nzukọ bara ụba.’ (Abụ Ọma 35:18; 40:9, 10) Ị ga-achọkwa ikere òkè n’ọrụ ahụ pụrụ iche nke ‘nkwupụta’ nke Jehova kenyere ndị nile ga-ejere ya ozi—ikwusa ozi ọma nke Alaeze n’ụwa nile na ime ndị na-eso ụzọ nke ndị mmadụ sitere ná mba nile.—Matiu 24:14; 28:19.
Ilezi Mmekọrịta Gị na Chineke Anya nke Ọma
18. Mkpa dị aṅaa ka ọmụmụ ihe onwe onye dị n’ijide n’aka na mmekọrịta nke mmadụ na Chineke ga-adịgide?
18 Ya mere, ugbu a, olee otú ị pụrụ isi jide n’aka na mgbe ọ bụla i nwetara ya, mmekọrịta gị na Jehova ga-adịru mgbe ebighị ebi n’udo nke ọṅụ na ịnọ ná ntụkwasị obi? Otu ihe bụ na ị ga-achọ ịdị na-eto eto n’ihe ọmụma banyere ya. Site n’ọmụmụ ihe onwe onye, ị ga-achọta ezi obi ụtọ n’inweta akụ nke amamihe a kwakọbara n’Okwu Chineke. Ị pụrụ ịdị ka onye Abụ Ọma 1:2, 3 kọwara, sị: “N’iwu Jehova ka ihe ụtọ ya dị; ọ bụkwa n’iwu ya ka ọ na-atụgharị uche ehihie na abalị. Ọ ga-adịkwa ka osisi a kụworo n’akụkụ iyi jupụtara ná mmiri, nke na-amị mkpụrụ ya na mgbe ya, ọzọ, akwụkwọ ya adịghị akpọnwụ; ihe ọ bụlakwa nke ọ na-eme, ọ na-eme ka ọ gaa nke ọma.” Ee, inweta ihe ọmụma Chineke na itinye ya n’ọrụ, ga-enyere gị aka ije ozi ‘n’ụzọ nke ịdị ụtọ’ na ‘n’okporo ụzọ nke udo,’ n’ihi na ọ ga-enye gị amamihe iche nsogbu nile nke ndụ ihu. (Ilu 3:13, 17, 18) Akpịrị ịkpọ nkụ ị na-enwe ugbu a maka ihe ọmụma Bible dị otú ahụ ga-egosipụta iru eru gị maka ndụ n’Usoro Ihe Ọhụrụ Chineke, n’ihi na mgbe ahụ “ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.”—Aịsaịa 11:9.
19. Gịnị mere ijechi nzukọ anya ji dị mkpa ná ndụ nke ndị Jehova?
19 Ihe ọzọkwa nke dị gị oké mkpa bụ ijechi anya ná nzukọ nke ndị ohu ndị ọzọ nke Jehova. N’ebe ahụ ị ga-achọta ezi mkpasu nke ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche, agbamume iji nọgidesie ike n’ezi mmekọrịta gị na Chineke. (Ndị Hibru 10:23-25) Nnọkọ obi ụtọ nke dị ka ezinụlọ nke ndị ohu Jehova na-enye ihe àmà na-ewusi obi ike na a ga-enwe mmezu nke udo na ịnọ ná ntụkwasị obi e kwere nkwa ya n’Usoro Ihe Ọhụrụ Chineke.—Abụ Ọma 133:1; 1 Ndị Kọrint 14:26, 33.
20. Ndị okenye nọ n’ime ọgbakọ pụrụ isi aṅaa nyere anyị aka n’oge mmegide na ihe isi ike nke onwe onye?
20 N’ime ọgbakọ ị pụrụ irite uru site ná ndokwa ịhụnanya ọzọ. Jisọs, bụ́ ‘Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma,’ nwere ‘ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’okpuru ya’ n’elu ala. Ndị a bụ ndị nlekọta, ma ọ bụ ndị okenye nke ime mmụọ, ndị na-elekọta “atụrụ” ya. Ha bụ ihe ọrụ dị ike n’iwulite udo na ntụkwasị obi n’etiti ndị nọ ná nzukọ Chineke n’ụwa dum. (1 Pita 5:2, 3) Ndị ikom ndị a dịkwa “ka ebe izonarị ifufe, na ebe nzuzo ịpụ n’oké mmiri ozuzo; dị ka ọtụtụ iyi jupụtara ná mmiri n’ebe kpọrọ nkụ, dị ka ndo nke oké nkume dị elu n’ala nke kpatara ike ọgwụgwụ.” (Aịsaịa 32:1, 2) Ee, n’oge ifufe nke nrụgide na ihe mgbu n’ihi mmegide nke ụwa ma ọ bụ ihe isi ike nke onwe onye, site n’okwukwe ha dị ka nkume na nguzosi ike ha n’iji Okwu Chineke na-eme ihe, ndị okenye ime mmụọ ndị a pụrụ inye ezi nkwado. Ha pụrụ inye gị ndụmọdụ na agbamume na-edo ahụ.
21. Gịnị ga-egbochi anyị ikwere ka ezughị okè nke ndị ọzọ mebie mmekọrịta anyị na Jehova?
21 Ọ bụ eziokwu na ezughị okè nke mmadụ ga-apụta ìhè, ọbụna n’etiti ndị ohu Chineke. Anyị nile na-emehie kwa ụbọchị. (Jemes 3:2) Ma ànyị ga-ekwe ka e mee ka anyị sụọ ngọngọ n’ihi ezughị okè nke ndị ọzọ ma kwerekwa ka nke a mebie mmekọrịta anyị na Jehova? Ebe ọ bụ na anyị onwe anyị na-emehiekwa, ọ̀ bụ na o kwesịghị ka anyị gosi ndị ọzọ otu ụdị mgbaghara ahụ anyị onwe anyị chọkwara? (Matiu 6:14, 15) Ọ bụrụ na anyị ga-egosipụta onwe anyị ndị ruru eru nke Usoro Ihe Ọhụrụ nke udo ga-achị, anyị aghaghị igosipụta ugbu a ike anyị nwere isoro ndị ọzọ dịrị n’udo. Anyị apụghị ịhụ Chineke n’anya ma ọ bụrụ na anyị enweghị ịhụnanya n’ebe ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị nke ime mmụọ nọ, bụ́ ndị Kraịst nwụrụ n’ihi ha.—1 Jọn 4:20, 21.
22. Ọnọdụ dị aṅaa ka ekpere kwesịrị inwe ná ndụ anyị?
22 Ezi mmekọrịta gị na Chineke na-enyekwa gị oké ihe ùgwù ọzọ: ịbịakwute Chineke n’ekpere na-ejide n’aka na ọ na-anụ olu gị. Lezie ihe ùgwù ahụ anya ma na-ejikwa ya eme ihe kwa ụbọchị, n’ụbọchị nile. Nsogbu ga-ebilite. Ezughị okè nke gị onwe gị nwere ike imekpa gị ahụ. Ma Bible na-adụ ọdụ, sị: “Unu echegbula onwe unu n’ihe ọ bụla; kama n’ihe nile ọ bụla site n’ekpere na arịrịọ, ya na ekele, meenụ ka Chineke mara ihe unu na-arịọ. Udo nke Chineke, nke kachasị uche nile, ga-echekwa obi unu na echiche uche unu nche n’ime Kraịst Jisọs.”—Ndị Filipaị 4:6, 7.
23. Mgbe anyị na-eche ule na ahụhụ ihu n’ihi okwukwe anyị, gịnị ga-enyere anyị aka ịtachi obi?
23 Site n’ịhọrọ ijere Jehova ozi, bụ́ ezi Isi Iyi nke udo na ịnọ ná ntụkwasị obi, na itinye olileanya gị n’Usoro Ihe Ọhụrụ ya, ị ga-enweworị ezi mmalite. Ugbu a, dị ka Bible na-ekwu, “ntachi obi dị unu mkpa, ka ọ ga-abụ, mgbe unu meworo ihe Chineke na-achọ, ka unu wee nata nkwa ahụ.” (Ndị Hibru 10:36) Ebe i detụworo ngọzi nke ezi mmekọrịta gị na Jehova ọnụ, kpebisie ike na ị gaghị ahapụ ya aka. Ekwela ka ihe ụtọ na-agafe ngwa ngwa nke ụwa dọkpụfuo gị. Ọ bụ ezie na ule ndị na-esite n’aka ndị iro gị ga-esiwanye ike, cheta na ndị a bụ nanị maka nwa oge. E jiri ha tụnyere ngọzi nile Jehova ga-enye ndị hụrụ ya n’anya, ụdị ahụhụ nile ahụ dị ka ihe na-abụghị ihe.—2 Ndị Kọrint 4:16-18.
24. (a) Na gịnị karịsịa ka anyị nwere ihe mere anyị ga-eji ṅụrịa ọṅụ taa? (b) Dị ka onye ọbụ abụ ahụ, ànyị kwesịrị isi aṅaa na-eche echiche mgbe nile banyere Jehova na mmekọrịta nke anyị na ya?
24 Nọgide n’ụzọ nke nsọpụrụ Chineke, na-enwe obi ike na ọ bụ ụzọ kasị mma nke ndụ ugbu a, nke na-edubakwa ná ndụ ebighị ebi n’ime Usoro Ihe Ọhụrụ Chineke. (1 Timoti 4:8) Ṅụrịa ọṅụ n’ihe àmà nke ịdị nso nke Usoro Ihe Ọhụrụ ahụ na udo na ntụkwasị obi na-adịgide adịgide ọ ga-eweta. Ka ị na-anọgide na-ewulite mmekọrịta gị na Jehova, na-enwe echiche dị ka onye ọbụ abụ ahụ nwere ike mmụọ nsọ nwere, onye dere, sị: “Oké nkume nke obi m na òkè m ka Chineke bụ ruo mgbe ebighị ebi. N’ihi na, lee, ndị nọ gị n’ebe dị anya ga-ala n’iyi: i kpochapụwo onye ọ bụla nke na-apụ n’aka gị akwa iko. Ma mụ onwe m, ịbịaru Chineke nso dị m mma: edowo m ebe mgbaba m n’Onyenwe anyị, bụ́ Jehova, ka m wee kọọ akụkọ banyere [ọrụ, NW] gị nile.”—Abụ Ọma 73:26-28.
[Foto dị na peeji nke 181]
Ime Nkwupụta Ihu Ọha