-
Gee Jehova NtịỤlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2019 | Mach
-
-
“GEENỤ YA NTỊ”
7. Dị ka Matiu 17:1-5 si kwuo, olee mgbe Jehova si n’eluigwe kwuo okwu, oleekwa ihe o kwuru?
7 Gụọ Matiu 17:1-5. Oge nke abụọ Jehova si n’eluigwe kwuo okwu bụ mgbe ‘e nwoghara Jizọs.’ Jizọs gwara Pita, Jems, na Jọn ka ha duga ya n’ugwu dị oké elu. Mgbe ha nọ ebe ahụ, ha hụrụ ọhụụ dị ịtụnanya. Ihu Jizọs nwuru gbaa dị ka ìhè, uwe ya ana-egbukekwa egbuke. Ihe abụọ yiri mmadụ, nke nọchiri anya Mozis na Ịlaịja, malitere ịgwa Jizọs okwu banyere ọnwụ ọ na-aga ịnwụ na otú a ga-esi akpọlite ya n’ọnwụ. Ọ bụ eziokwu na “ụra ji” ndịozi atọ ahụ, ma mgbe ha tetara, ha hụrụ ọhụụ a dị ịtụnanya. (Luk 9:29-32) Ígwé ojii malitere ikpuchi ha, ha anụkwa otu oké olu si n’ígwé ojii ahụ. Ọ bụ olu Chineke. Jehova kwukwara ụdị ihe ahụ o kwuru mgbe a na-eme Jizọs baptizim iji gosi na ọ hụrụ Ọkpara ya n’anya nakwa na ihe ya masịrị ya. O kwuru, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye ihe ya masịrị m.” Ma na nke ugbu a, Jehova kwuziri, sị: “Geenụ ya ntị.”
-
-
Gee Jehova NtịỤlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2019 | Mach
-
-
9. Olee ndụmọdụ bara uru Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya?
9 “Geenụ ya ntị.” Jehova mere ka o doo anya na ya chọrọ ka anyị na-ege Ọkpara ya ntị ma na-eme ihe ndị ọ gwara anyị. Olee ihe ndị Jizọs kwuru mgbe ọ nọ n’ụwa? O kwuru ọtụtụ ihe ndị bara uru anyị kwesịrị ige ntị na ha. Dị ka ihe atụ, o medara obi kụziere ndị na-eso ụzọ ya otú e si ezi ozi ọma, chetakwara ha ọtụtụ ugboro ka ha na-eche nche. (Mat. 24:42; 28:19, 20) Ọ gwara ha ka ha jiri ike ha niile rụọ ọrụ ahụ nakwa ka ha ghara ịda mbà. (Luk 13:24) Jizọs mere ka o doo ndị na-eso ụzọ ya anya na ha kwesịrị ịhụ ibe ha n’anya, dịrị n’otu ma na-edebe iwu ya. (Jọn 15:10, 12, 13) Ndụmọdụ Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya baara ha ezigbo uru. Ọ na-abakwara anyị uru taa.
-