-
Ị Pụrụ Irite Nwanna Gị n’UruỤlọ Nche—1999 | Ọktoba 15
-
-
Inweta Enyemaka Rijuru Afọ
12, 13. (a) Olee nzọụkwụ nke abụọ Jisọs kwupụtara banyere idozi mmejọ? (b) Olee ihe ndị e kwesịrị ịkpachara anya banyere ha mgbe a na-ewere nzọụkwụ a?
12 Ị̀ ga-achọ ka ndị ọzọ hapụ gị ngwa ngwa ma ọ bụrụ na i mere otu mmehie dị oké njọ? Ọ dịghị ma ọlị. N’otu aka ahụ, Jisọs gosiri na mgbe i wesịịrị nzọụkwụ mbụ ahụ, i kwesịghị ịkwụsị ịgbalị irite nwanna gị n’uru, ka gị na ya na ndị ọzọ wee nọgide na-adị n’otu n’ife Chineke n’ụzọ ọ na-anara nke ọma. Jisọs kwupụtara nzọụkwụ nke abụọ: “Ọ bụrụ na ọ nụghị, kuru otu mmadụ ma ọ bụ mmadụ abụọ ọzọ tinyere onwe gị, ka e wee mee okwu ọ bụla e kwuru ka o guzo n’ọnụ ndị àmà abụọ ma ọ bụ atọ.”
13 Ọ sịrị ka e kuru “otu mmadụ ma ọ bụ mmadụ abụọ ọzọ.” Ọ sịghị na mgbe i wesịịrị nzọụkwụ nke mbụ ahụ na i nweere onwe gị ịkọrọ ọtụtụ ndị ọzọ nsogbu ahụ, ịkpọtụrụ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị, ma ọ bụ idegara ụmụnna akwụkwọ banyere nsogbu ahụ. N’agbanyeghị otu o si wee gị anya na o mejọrọ ihe, a nwapụtabeghị ya n’ezie n’ụzọ zuru ezu. Ị gaghị achọ ịgbasa ihe ọmụma na-ezighị ezi nke pụrụ imesị bụrụ na i kwutọrọ mmadụ. (Ilu 16:28; 18:8) Kama Jisọs sịrị ka i kuru otu mmadụ ma ọ bụ mmadụ abụọ ọzọ. N’ihi gịnị? Oleekwa ndị ha pụrụ ịbụ?
14. Olee ndị anyị pụrụ ikuru gaa maka nzọụkwụ nke abụọ?
14 Ị na-agbalị irite nwanna gị n’uru site n’ime ka o kweta na o meela mmehie nakwa site n’ịkpali ya ichegharị ka gị na ya na Chineke wee dị n’udo. Iji mezuo nke ahụ, ọ ga-aka mma ma ọ bụrụ na “otu mmadụ ma ọ bụ mmadụ abụọ” ahụ bụ ndị akaebe nke mmejọ ahụ. Ikekwe ha nọ mgbe o mere, ma ọ bụ ha nwere ihe ọmụma ziri ezi banyere ihe e mere (ma ọ bụ ihe a na-emeghị) n’okwu achụmnta ego. Ọ bụrụ na ndị akaebe dị otú ahụ anọghị ya, ndị ị ga-ekuru pụrụ inwe ahụmahụ n’okwu ahụ ma nwee ike ịnwapụta ma e mejọrọ ihe n’ezie. Ọzọkwa, ọ bụrụ na ọ dị mkpa mgbe e mesịrị, ha pụrụ ịbụ ndị akaebe nke ihe e kwuru, na-emesi eziokwu ndị e wepụtara na mgbalị ndị e mere ike. (Ọnụ Ọgụgụ 35:30; Deuterọnọmi 17:6) N’ihi ya, ha abụghị ndị na-enweghị ebe ha kwụ n’okwu ahụ, ndị nchọpụta nkịtị; ma, ọnụnọ ha nọ ya bụ iji nye aka irite nwanna gị na ha n’uru.
15. N’ihi gịnị ka ndị Kraịst bụ́ ndị okenye pụrụ iji bụrụ ihe enyemaka ma ọ bụrụ na anyị aghaghị iwere nzọụkwụ nke abụọ ahụ?
15 Ọ dịghị gị mkpa iche na ndị ị ga-ekuru aghaghị ịbụ ndị ikom bụ́ ndị okenye n’ọgbakọ. Otú ọ dị, ndị ikom tozuru okè bụ́ ndị okenye pụrụ ịtụnye ụtụ site n’iru eru ime mmụọ ha. Ndị okenye dị otú ahụ dị “ka ebe izonarị ifufe, na ebe nzuzo ịpụ n’oké mmiri ozuzo; dị ka ọtụtụ iyi jupụtara na mmiri n’ebe kpọrọ nkụ, dị ka ndo nke oké nkume dị elu n’ala nke kpatara ike ọgwụgwụ.” (Aịsaịa 32:1, 2) Ha nwere ahụmahụ n’isoro ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị tụgharịa uche nakwa n’ịgbazi ha. Onye ahụ mere ihe ọjọọ nwekwara ezi ihe mere ọ ga-eji gosipụta obi ike n’ebe “onyinye n’ụdị mmadụ” dị otú ahụ nọ.c (Ndị Efesọs 4:8, 11, 12, NW) Ikwupụta ihe ahụ n’ihu ndị dị otú ahụ tozuru okè na isonyere ha n’ekpere pụrụ ime ka e nwee ọnọdụ ọhụrụ ma dozie ihe yiri ka a pụghị idozi ya edozi.—Tụlee 5:14, 15.
-
-
Ị Pụrụ Irite Nwanna Gị n’UruỤlọ Nche—1999 | Ọktoba 15
-
-
c Otu ọkà mmụta Bible kwuru, sị: “Ọ na-eme mgbe ụfọdụ na onye mere ihe ọjọọ na-aka adị njikere ịṅa mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ ntị (karịsịa ma ọ bụrụ na ha bụ ndị ruru eru ka a kwanyere ha ùgwù) karịa ka ọ ga-aṅa otu onye, karịsịa ma ọ bụrụ na onye ahụ bụ onye ya na ya nweworo echiche dịrịtara iche.”
-