Echiche nke Bible
À Pụrụ Ịzọpụta Alụmdi na Nwunye Mgbe E Nwesịrị Ekwesịghị Ntụkwasị Obi?
“Ma asị m unu, onye ọ bụla nke ga-ahapụ nwunye ya, ma ọ bụghị n’ihi ịkwa iko, lụrụkwa nwunye ọzọ ọ na-akwa iko.” —MATIU 19:9.
SITE n’okwu ndị ahụ Jisọs Kraịst nyere ohere maka onye Kraịst ịhọrọ ịgba onye òtù ọlụlụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi alụkwaghịm.a Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na onye nke aka ya dị ọcha ahọrọ ichekwa alụmdi na nwunye ahụ, di na nwunye ahụ ewee kpebie iwuliteghachi mmekọrịta ha? Ihe ịma aka ndị dị aṅaa chere di na nwunye ahụ ihu, oleekwa otú ha pụrụ isi merie ihe ịma aka ndị ahụ? Ka anyị hụ ụzọ Bible si enye aka ịza ajụjụ ndị a.
Ụlọ E Tikpọrọ Etikpọ
Anyị aghaghị ibu ụzọ ghọta ịdị ukwuu nke mmebi ahụ ekwesịghị ntụkwasị obi kpatara. Dị ka Jisọs Kraịst kọwara, Onye Malitere alụmdi na nwunye zubere na di na nwunye “abụghịkwa mmadụ abụọ ọzọ, kama ọ bụ otu anụ ahụ.” Ọ gbakwụnyere: “Ya mere, ihe Chineke kekọtara, mmadụ atọsala.” Ee, e mere alụmdi na nwunye ijikọta mmadụ abụọ n’ụzọ a na-apụghị ikewa ekewa. Mgbe mmadụ mebiri ọgbụgba ndụ alụmdi na nwunye ahụ site n’ịkwa iko, ihe ndị na-eweta obi mgbu na-esochi.—Matiu 19:6; Ndị Galetia 6:7.
Ihe na-agbara nke a akaebe bụ nsogbu nke onye nke aka ya dị ọcha na-enwe. A pụrụ iji mmetụta ndị ịkwa iko na-akpata tụnyere ndị nke oké ifufe nke na-etisasị ebe obibi. Dr. Shirley P. Glass kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị ọrịa m gwọworo agwawo m na ọ gaara akaworo ha mfe ma a sị na onye òtù ọlụlụ ha nwụrụ.” N’eziokwu, ọ pụrụ ịbụ na ụfọdụ ndị òtù ọlụlụ ha nwụworo agaghị ekweta. Otú ọ dị, o doro anya na ịkwa iko na-akpata oké ihe mgbu. Ụfọdụ ndị adịghị agbakecha ma ọlị site ná nghọgbu a.
N’ihi nhụjuanya dị otú ahụ, mmadụ pụrụ ịjụ, sị, ‘Ịkwa iko ọ̀ ga-akwụsịrịrị alụmdi na nwunye?’ Ọ bụghị iwu. Okwu Jisọs banyere ịkwa iko na-egosi na onye nke kwesịrị ntụkwasị obi nwere nhọrọ Akwụkwọ Nsọ kwadoro ịgba alụkwaghịm ma ọ bụghị iwu na ọ ga-eme otú ahụ. Di na nwunye ụfọdụ na-ekpebi iwuliteghachi na iwusi ihe e gwepịara ike, site n’ime mgbanwe ndị dị mkpa—ọ bụ ezie na ọ dịghị ihe ngọpụ dịnụ maka ịkwa iko.
N’ezie, ọ ka mma ime mgbanwe ndị dị mkpa ná mmekọrịta alụmdi na nwunye mgbe ha abụọ na-ekwesị ntụkwasị obi nye onwe ha. Otú ọ dị, ọbụna mgbe ekwesịghị ntụkwasị obi weere ọnọdụ, ụfọdụ ndị òtù ọlụlụ aka ha dị ọcha na-ahọrọ ichekwa alụmdi na nwunye ahụ. Kama mkpebi dị otú ahụ ịdabere n’echiche nke ihe e lere anya ga-eme, onye nke aka ya dị ọcha kwesịrị ịtụle ihe ndị ga-esi na ya pụta. O yiri ka ọ ga-echebara mkpa ụmụ ya tinyekwara mkpa ya onwe ya nke ime mmụọ, mmetụta uche, anụ ahụ, na nke ego echiche.b Ọ ga-abụkwara ya ihe amamihe ịtụle ma a pụrụ imekwata alụmdi na nwunye ya.
À Pụrụ Imekwata Alụmdi na Nwunye Ahụ?
Tupu ọ na-anwa iwuliteghachi ụlọ oké ifufe bibiri, onye na-ewu ụlọ aghaghị ikpebi ma a pụrụ iwugharị ya. N’otu aka ahụ, tupu a na-eme mgbalị iwuliteghachi mmekọrịta nke ekwesịghị ntụkwasị obi tisara, di na nwunye—karịsịa onye nke kwesịrị ntụkwasị obi—ga-achọ ịtụle ihe site n’ezi uche banyere ohere e nwere maka mkpachi anya na ntụkwasị obi e weghachiri eweghachi n’alụmdi na nwunye ahụ.
Otu ihe a ga-atụle bụ ma onye ahụ mejọrọ ọ̀ na-egosi ezi nchegharị ka ọ bụ, kama nke ahụ, ọ̀ ka nọgidere na-akwa iko “n’obi ya.” (Matiu 5:27, 28) Ọ bụ ezie na ọ na-ekwe nkwa ịgbanwe, ọ̀ na-ala azụ ịkwụsị mmekọrịta ya rụrụ arụ ozugbo? (Ọpụpụ 20:14; Levitikọs 20:10; Deuterọnọmi 5:18) Ọ̀ ka nwere anya na-eme mwagharị? Ọ̀ na-ata nwunye ya ụta maka ịkwa iko ya? Ọ bụrụ otú ahụ, mgbalị iweghachi ntụkwasị obi n’alụmdi na nwunye ahụ yiri ihe na-agaghị enwe isi. N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na ọ kwụsị mmekọ rụrụ arụ ahụ, nakwere ibu ọrụ maka ihe ọjọọ ya, ma na-egosi na aka ya ga-adị n’ụzọ zuru ezu n’iwuliteghachi alụmdi na nwunye ahụ, nwunye ya pụrụ ịhụ ihe ndabere maka inwe olileanya na n’otu ụbọchị a pụrụ iweghachi ezi ntụkwasị obi.—Matiu 5:29.
Ọzọkwa, onye nke kwesịrị ntụkwasị obi ọ̀ pụrụ ịgbaghara? Nke a apụtaghị na ọ gaghị ekwupụta mmetụta ya nke obi ụfụ miri emi banyere ihe merenụ ma ọ bụ na ọ ga-eme ka a ga-asị na ọ dịghị ihe gbanwerenụ. Ọ pụtara na ọ ga-agbalị, ka oge na-aga, ịghara ịnọgide na-enwe obi iwe miri emi. Ụdị mgbaghara ahụ na-ewe oge ma ọ pụrụ inye aka iguzobe ihe ndabere siri ike a ga-ewukwasịghachi alụmdi na nwunye ahụ na ya.
Ikpopụsị “Ngwongwo na Ngwongwo” Ndị Ahụ
Mgbe onye nke kwesịrị ntụkwasị obi kpebiworo ịzọpụta alụmdi na nwunye ha, olee nzọụkwụ ndị ọzọ di na nwunye pụrụ iwere? Dị ka a na-aghaghị ikpopụ ngwongwo na ngwongwo dị gburugburu ebe obibi oké ifufe mebiri nke ọjọọ ya, a ghaghị ikpopụsị “ngwongwo na ngwongwo” gbara alụmdi na nwunye ahụ gburugburu. A pụrụ imezu nke a ruo n’ókè ụfọdụ ma ọ bụrụ na di na nwunye ahụ ekwupụta mmetụta ha nye onwe ha. Ilu 15:22 na-asị: “Mmebi echiche nile dị mgbe izu nzuzo na-adịghị.” Okwu Hibru a sụgharịrị “izu nzuzo” na-egosi ichi anya, a kpọkwara ya “ìgwè na-akpachi anya” n’Abụ Ọma 89:7, (NW). Ya mere ọ ga-agụnye, ọ bụghị nanị mkparịta ụka elu elu, kama nkwurịta okwu eziokwu, sitere n’obi ebe mmadụ abụọ ahụ na-ekpughe mmetụta ha ndị kasị omimi.—Ilu 13:10.
Dị ka ihe atụ, n’ọnọdụ ụfọdụ onye nke kwesịrị ntụkwasị obi pụrụ inwe ajụjụ ndị ọzọ ịjụ di ya. Olee otú mmekọ ahụ si malite? Ogologo oge hà aṅaa ka ọ gara n’ihu? Olee onye ọzọ maara banyere ya? N’eziokwu, ọ ga-abụ ihe na-egbu mgbu di na nwunye ahụ ịkparịta ihe ndị a. Otú ọ dị, onye nke kwesịrị ntụkwasị obi pụrụ ịhụ ihe ọmụma dị otú ahụ dị ka ihe dị mkpa maka mweghachi nke ntụkwasị obi. Ọ bụrụ otú ahụ, ọ kachasị mma na onye nke na-ekwesịghị ntụkwasị obi zaghachiri n’obi eziokwu na nchebara echiche. O kwesịrị ịkọwa ihe n’ụzọ ịhụnanya na obiọma, na-ebu n’uche na nzube nke mkparịta ụka ahụ bụ iji gwọọ agwọ, ọ bụghị imerụ ahụ. (Ilu 12:18; Ndị Efesọs 4:25, 26) Ọ ga-adị ha abụọ mkpa iji akọ, njide onwe onye, na ige ntị ọmịiko mee ihe ka ha na-ekwupụta mmetụta ha banyere ihe merenụ.c—Ilu 18:13; 1 Ndị Kọrint 9:25; 2 Pita 1:6.
Ndị bụ Ndịàmà Jehova pụrụ ịchọ ịrịọ enyemaka site n’aka ndị okenye ọgbakọ. N’ezie, nye ndị Kraịst, a ghaghị ikwupụta mmehie ndị dị oké njọ dị ka ịkwa iko gwa ndị okenye, bụ́ ndị na-eche banyere ọdịmma ime mmụọ nke di na nwunye ahụ na nke ọgbakọ. Ọ pụrụ ịbụ na mgbe ya na ndị okenye nọkọrọ, onye ahụ kwara iko gosiri ezi nchegharị, n’ihi ya e wee hapụ ya ịnọgide n’ọgbakọ. N’ọnọdụ dị otú ahụ, ndị okenye pụrụ ịnọgide na-enyere di na nwunye ahụ aka.—Jemes 5:14, 15.
Mwuliteghachi
Mgbe di na nwunye ahụ jikọtasịrị mmetụta ha ruo n’ókè kwere mee, ha nọ n’ọnọdụ dị mma iwuliteghachi akụkụ ndị dị mkpa nke alụmdi na nwunye ha. Nkwurịta okwu sitere n’obi nọgidere na-adị mkpa. N’ebe ndị a chọpụtara adịghị ike, a ghaghị ime mgbanwe ndị kwesịrị ekwesị.
Mkpa ime mgbanwe ga-adịkwasịkarị n’isi onye nke mejọrọ. Otú ọ dị, onye nke kwesịrị ntụkwasị obi aghaghị ime ókè ya n’iwusi akụkụ ndị na-adịghị ike nke alụmdi na nwunye ahụ ike. Nke a apụtaghị na ịkwa iko ahụ si ya n’aka ma ọ bụ na a pụrụ ịgọpụrụ ya—e nweghị ezi ihe ngọpụ ọ bụla maka ime ụdị mmehie a. (Tụlee Jenesis 3:12; 1 Jọn 5:3.) Ihe ọ na-apụta bụ nanị na a pụrụ inwebu nsogbu n’alụmdi na nwunye ahụ bụ́ ndị ọ dị mkpa ka e dozie. Mwuliteghachi bụ ọrụ a na-agbakọ aka arụ. È nwere mkpa iwusi ihe ndị dị mkpa na ihe mgbaru ọsọ e nwekọrịtara ike? È legharawo ọrụ ime mmụọ anya? Usoro nke a nke ịchọpụta adịghị ike ndị pụtara ìhè na ime mgbanwe ndị dị oké mkpa dị mkpa n’iwuliteghachi alụmdi na nwunye e mebiri nke ọjọọ ya.
Nlekọta Anya
Ọbụna ụlọ e wuru nke ọma na-achọ nlekọta anya mgbe mgbe. Mgbe ahụ, lee otú o si dị mkpa ilekọta mmekọrịta e wuliteghachiri anya. Di na nwunye ahụ agaghị ekwe ka ngabiga nke oge richapụ mkpebisi ike ha ijigide mkpebi ndị ọhụrụ ha. Kama ịbụ ndị e gburu mmụọ ha ma ọ bụrụ na ha enwee obere ihe ndọghachi azụ, dị ka ịdaghachi azụ n’àgwà enweghị ezi nkwurịta okwu, ha kwesịrị iwere nzọụkwụ dị ngwa iji merie ya ma nọgide na-aga n’ihu.—Ilu 24:16; Ndị Galetia 6:9.
Karịsịa, di na nwunye kwesịrị inye usoro ihe ime mmụọ ha ọnọdụ mbụ kachasị ukwuu, ghara ikwe ya ma ọlị, ma ọ bụ alụmdi na nwunye ha, iwere oche azụ nye ihe omume ọ bụla ọzọ. Abụ Ọma 127:1 na-asị: “Ọ bụrụ na Jehova ewughị ụlọ, n’efu ka ha dọgbuworo onwe ha n’ọrụ n’ime ya, bụ́ ndị na-ewu ya.” Ọzọkwa, Jisọs dọrọ aka ná ntị, sị: “Onye ọ bụla nke na-anụ okwu m ndị a, ma ọ dịghị eme ha, a ga-eji ya tụnyere nwoke nke bụ onye nzuzu, onye wuru ụlọ ya n’elu ájá: mmiri wee zoo, osimiri ruokwa, ifufe feekwa, wee tikwasị ụlọ ahụ; o wee daa: ọdịda ya dịkwa ukwuu.”—Matiu 7:24-27.
Ee, ọ bụrụ na a na-eleghara ụkpụrụ Bible anya n’ihi na ha siri ike idebe, alụmdi na nwunye ga-anọgide bụrụ nke e kpughere nye ule oké ifufe nke ikwesị ntụkwasị obi. Otú ọ dị, ọ bụrụ na di na nwunye ejigide ụkpụrụ Bible n’okwu nile, alụmdi na nwunye ha ga-enwe ngọzi Chineke. Ha ga-enwekwa mkpali kachasị dị ike nye ikwesị ntụkwasị obi alụmdi na nwunye—ọchịchọ ime ihe na-atọ Onye Malitere alụmdi na nwunye ụtọ, bụ́ Jehova Chineke.—Matiu 22:36-40; Eklisiastis 4:12.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a E nwere ezi ihe ndị mere mmadụ pụrụ iji họrọ ịgba onye òtù ọlụlụ kwara iko alụkwaghịm. Maka ntụle sara mbara nke okwu a, lee “Echiche nke Bible: Ịkwa Iko Ndị Lụrụ Di Ma Ọ Bụ Nwunye—Ịgbaghara Ka Ọ̀ Bụ Ịghara Ịgbaghara?” dị na mbipụta Teta! nke August 8, 1995.
b Anyị na-ewere nwoke dị ka onye nke na-ekwesịghị ntụkwasị obi. Otu njụta echiche na-eme atụmatụ na ndị ikom nwere okpukpu abụọ nke ọ̀tụ̀tụ̀ ekwesịghị ntụkwasị obi nke ndị inyom nwere. Otú ọ dị, ụkpụrụ ndị a tụlere dị irè n’ụzọ hà nhata mgbe onye nke aka ya dị ọcha bụ nwoke bụ́ onye Kraịst.
c Maka ihe ọmụma n’ige ntị nke ọma, lee Teta! nke April 8, 1994, peji nke 6-9, na December 8, 1994 (Bekee), peji nke 10-13.