-
Eze Alaeze Chineke Na-eme Ka Ndị Ya Dị ỌchaAlaeze Chineke Amalitela Ịchị!
-
-
1-3. Gịnị ka Jizọs mere mgbe ọ hụrụ ka a na-eme ihe na-adịghị mma n’ụlọ nsọ Chineke?
MGBE Jizọs nọ n’ụwa, o ji ụlọ nsọ Jeruselem kpọrọ ihe n’ihi na ọ ma ihe ọ nọchiri anya ya. O teela a nọwara n’ụlọ nsọ ahụ na-efe Jehova ofufe. Ma, e kwesịrị ịnọ ebe ahụ na-efe Jehova Chineke anyị dị nsọ ofufe otú ọ chọrọ. N’abalị iri n’ọnwa Naịsan, afọ 33, Jizọs batara n’ụlọ nsọ ahụ ma hụ ka ndị mmadụ kpachaara anya na-eme ihe Chineke kpọrọ asị. Chegodị otú obi dị Jizọs mgbe ọ hụrụ ha. Gịnịdị ka ha nọ na-eme?—Gụọ Matiu 21:12, 13.
2 E nwere ogige ndị Jentaịl n’ụlọ nsọ ahụ. Ọ bụ ebe ahụ ka ụfọdụ ndị chọrọ ịzụrụ ihe ha ga-eji chụọrọ Jehova àjà na-aga azụrụ ya. Ma ndị na-eresị ha ihe ndị ahụ ma ndị na-agbanwere ha ego na-erigbu ha.a Mgbe Jizọs hụrụ ihe a na-emenụ, ‘ọ chụpụrụ ndị niile na-ere ma na-azụ ahịa n’ime ụlọ nsọ ahụ, o kpukwara tebụl nke ndị na-agbanwe ego ihu n’ala.’ (Tụlee Nehemaya 13:7-9.) Ọ katọrọ ndị anyaukwu a maka otú a ha si jiri ụlọ Nna ya mere “ọgba nke ndị na-apụnara mmadụ ihe.” Ihe a Jizọs mere gosiri na o jighị ụlọ nsọ ahụ egwu egwu, ọ makwa ihe ọ nọchiri anya ya. Ọ chọsiri ike ka a na-efe Nna ya ofufe otú kwesịrị ekwesị n’ụlọ nsọ ahụ.
-
-
Eze Alaeze Chineke Na-eme Ka Ndị Ya Dị ỌchaAlaeze Chineke Amalitela Ịchị!
-
-
a E nwere ụdị ego ndị Juu si ebe ọzọ bịa Jeruselem na-eji akwụ ụtụ isi ha kwa afọ. Ndị na-agbanwe ego na-ana ha ego mgbe ha na-agbanwere ha ego kịrịkịrị ha ji bịa. Ihe ọzọ bụkwa na, ndị Juu a si esi bịa na-azụ anụmanụ ha na-eji achụrụ Chineke àjà. Jizọs kpọrọ ma ndị na-agbanwere ha ego ma ndị na-eresị ha anụmanụ ndị ahụ “ndị na-apụnara mmadụ ihe.” Ọ ga-abụ na ihe mere o ji kpọọ ha aha a bụ n’ihi na ha na-ana ha ego karịrị akarị.
-