Ndụ na Ije Ozi Jisọs
Ha Enweghị Ike Ịmata Jisọs n’Ọnyà
JISỌS anọwo na-ezi ihe n’ụlọ ukwu ahụ, ọ ka gwasịkwara ndị iro ya bụ ndị okpukpe ihe atụ atọ nke na-ekpughe ajọ omume ha. Nke a kpasuru ndị Farisii iwe, ha wee gbaa izu ịmata ya n’ọnyà site n’ime ka o kwuo ihe ha pụrụ iji n’ihi ya jide ya. Ha gbarịtara izu nzuzo, wee dupụ ndị na-eso ụzọ ha, ha na ndị na-eso òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị Herod ịnwa ime ka o kwuhie ọnụ.
“Onye ozizi,” ka ndị ikom ndị a kwuru, “anyị amatawo na ị bụ onye eziokwu, na ị na-ezikwa ụzọ Chineke n’eziokwu, na ị dịghị asọkwa onye ọ bụla anya: n’ihi na ị dịghị ele mmadụ anya n’ihu. Ya mere, gwa anyị, gịnị bụ uche gị? Ò ziri ezi n’iwu ịtụ ụtụ nye Sisa, ma ọ bụ na ò zighị ezi?”
E megharịghị Jisọs anya site n’okwu ịja mma ụgha nke a. Ọ ghọtara na ọ bụrụ na ya asị, ‘Ee e, o zighị ezi n’iwu ịtụ ụtụ isi nke a,’ ikpe ikwu okwu megidere ọchịchị Rom ga-ama ya. Ma, ọ bụrụ na ọ sị, ‘Ee, unu kwesịrị ịtụ ụtụ isi nke a,’ ndị Juu, bụ́ ndị ọnụnọ ha nọ n’okpuru Rom na-amasịghị ga-akpọ ya asị. Ya mere ọ jụrụ, sị: “Gịnị mere unu na-anwa m, ndị ihu abụọ? Gosinụ m ego nke ụtụ.”
Mgbe ha wetaara ya otu mkpụrụ ego, ọ jụrụ, sị: “Ònye nwe onyinyo a na ihe a e dekwasịrị ya?”
“Sisa nwe,” ka ha zaghachiri.
“Ya mere, nyeghachinụ Sisa ihe nke Sisa, nyeghachikwanụ Chineke ihe nke Chineke.”
Mgbe ndị ikom ndị a nụrụ azịza nke a e ji ezi nkà zaa, ọ tụrụ ha n’anya. Ha wee pụọ hapụ ya.
Mgbe ha hụrụ na ndị Farisii enweghị ike ịchọta ihe ha ga-eji megide Jisọs, ndị Sadusii, bụ́ ndị na-asị na e nweghị mbilite n’ọnwụ dịnụ, bịakwutere ya, wee jụọ, sị: “Onye ozizi, Moses sịrị, Ọ bụrụ na nwoke anwụọ, n’enweghị ụmụ, nwanne ya nwoke ga-arụ ọrụ kwesịrị nwanne di n’ebe nwunye ya nọ, mee ka mkpụrụ topụtara nwanne ya. Ma ụmụnne ndị ikom asaa dị n’etiti anyị: nke mbụ lụrụ nwunye, wee nwụọ, ma ebe ọ na-enweghị mkpụrụ ọ hapụrụ nwunye ya nye nwanne ya; otú a ka nke abụọ mekwara, nke atọ kwa, ruo nke asaa. Mgbe ha nile nwụsịrị nwanyị ahụ nwụkwara. Ya mere, ná mbilite n’ọnwụ nwunye ònye n’etiti ha asaa ka ọ ga-abụ? N’ihi na ha nile nwere ya na nwunye.”
Ná nzaghachi, Jisọs sịrị: “Ọ́ bụghị n’ihi nke a ka unu ji hie ụzọ, na unu amataghị ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ, ma ọ bụ ike Chineke? N’ihi na mgbe ha ga-esi ná ndị nwụrụ anwụ bilie, ha alụghị nwunye, e nyeghịkwa ha n’ọlụlụ di; kama ha dị ka ndị mmụọ ozi dị n’eluigwe. Ma n’okwu banyere ndị nwụrụ anwụ, na a na-eme ka ha si n’ọnwụ bilie; ùnu agụghị n’akwụkwọ Moses, n’ebe e dere okwu banyere osisi nta, otú Chineke gwara ya, sị, Mụ onwe m bụ Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aịsak, na Chineke nke Jekọb? Ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ, kama ọ bụ nke ndị dị ndụ: unu onwe unu na-ehie ụzọ nke ukwuu.”
Ọzọkwa, azịza Jisọs juru ìgwè mmadụ ahụ anya. Ọbụna ụfọdụ n’etiti ndị odeakwụkwọ ahụ kwetara, sị: “Onye ozizi, i kwụrụ nke ọma.”
Mgbe ndị Farisii ahụ hụrụ na Jisọs emewo ka ndị Sadusii mechie ọnụ, ha bịakwutere ya n’otu ìgwè. Iji tinye ya n’ọnwụnwa gaa n’ihu, otu n’ime ha jụrụ, sị: “Onye ozizi, olee ihe dị ukwuu nke e nyere n’iwu n’ime iwu anyi?”
Jisọs zara, sị: “Nke mbụ bụ, Nụrụ, Israel; [Jehova, NW], bụ́ Chineke anyị, [Jehova, NW] bụ otu: ị ga-ahụkwa [Jehova, NW], bụ́ Chineke gị, n’anya, site n’obi gị dum, sitekwa ná mkpụrụ obi gị dum, sitekwa n’uche gị dum, sitekwa n’ike gị dum. Nke abụọ bụ nke a, ị ga-ahụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị. Ọ dịghị ihe ọzọ e nyere n’iwu nke [karịrị, NW] ndị a.” N’eziokwu, Jisọs kwụkwara, sị: “Iwu dum, na ndị amụma Chineke, na-ekokwasị n’ihe abụọ ndị a e nyere n’iwu.”
Otu onye odeakwụkwọ kwetara, sị: “Onye ozizi, n’ezie i kwuru nke ọma na ọ bụ otu; ọ dịghịkwa chi ọzọ dị ma ọ bụghị ya: na ịhụ ya n’anya site n’obi gị dum, sitekwa ná nghọta gị dum, sitekwa n’ike gị dum, na ịhụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị, ọ kachasị àjà nsuresị ọkụ nile na àjà ọzọ nile nke ukwuu.”
N’ịghọta na onye odeakwụkwọ ahụ azawo n’ụzọ amamihe, Jisọs gwara ya, si: “Ị nọghị ebe dị anya n’alaeze Chineke.”
Ruo ụbọchị atọ ugbu a—Sunday, Monday, na Tuesday—Jisọs anọwo na-ezi ihe n’ụlọ ukwuu ahụ. Ndị mmadụ ejiriwo obi ụtọ na-ege ya ntị, ma ndị ndú okpukpe ahụ ahụ na-agbakasị ka chọkwara igbu ya. Matiu 22:15-40; Mak 12:13-34; Luk 20:20-40.
◆ Izu nzuzo di aṅaa ka ndị Farisii gbara iji mata Jisọs n’ọnyà, gịnịkwa ka ọ ga-arụpụta ma ọ bụrụ na ọ zaa ee ma ọ bụ ee e?
◆ Oleekwa ụzọ Jisọs si mebie atụmatụ ndị Sadusii na-eme iji mata ya n’ọnyà?
◆ Mgbalị ọzọ dị aṅaa ka ndị Farisii mere iji nwaa Jisọs, gịnịkwa si na ya pụta?
◆ N’oge ije ozi ikpeazụ ya na Jerusalem, ụbọchị ole ka Jisọs ziri ihe n’ụlọ ukwu ahụ, oleekwa mmetụta nke a nwere?