Nọrọ na Nche Megide Ezi Omume Onwe Onye!
NA NARỊ afọ mbụ, ndị Farisii nwere aha ọma nke ịbụ ndị ezi omume na-efe Chineke ofufe. Ha ji ịdị uchu na-amụ Akwụkwọ Nsọ ma na-ekpe ekpere mgbe mgbe. Ụfọdụ ndị lere ha anya dị ka ndị dị nro ma nwee ezi uche. Onye Juu na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Josephus dere, sị: “Ndị Farisii hụrịtara onwe ha n’anya ma na-azụlite mmekọrịta ịdị n’otu n’ebe ọha mmadụ nọ.” Ka a sịkwa ihe mere na ha bụ ma eleghị anya ndị a kasị akwanyere ùgwù ma na-asọpụrụ n’ọha mmadụ ndị Juu n’oge ahụ!
Otú ọ dị, taa okwu ahụ bụ́ “nke ndị Farisii” na okwu ndị ọzọ yiri ya bụcha okwu mkparị, okwu ndị ya na ime nsọ nsọ, ezi omume onwe onye, onye dịkarịrị ibe ya ná nsọ, ime oké nsọ, na ozi egbugbere ọnụ bụ otu ihe. N’ihi gịnị ka ndị Farisii ji tụfuo aha ọma ha?
Ọ bụ n’ihi na, n’adịghị ka ihe ka ọtụtụ ná ndi Juu, Jisọs Kraịst abụghị onye ọdịdị a na-ahụ anya nke ndị Farisii duhiere. O ji ha tụnyere “ili e teworo nzụ, nke na-egosi onwe ha dị ka ihe ọma n’ìhè, ma n’ime ha jupụtara n’ọkpụkpụ nke ndị nwụrụ anwụ, na adịghị ọcha nile.”—Matiu 23:27.
Ọ bụ ezie na ha kpere ogologo ekpere mgbe ha na-eguzo n’ebe ọha mmadụ nọ, ma nke a bụ nanị ka ndị ọzọ hụ ha, dị ka Jisọs kwuru. Ofufe ha bụ nanị ihe omume efu. Ha na-agakarị n’ebe a ma ama mgbe a na-eri nri anyasị nakwa n’ihu oche n’ụlọ nzukọ. Ọ bụ ezie na iwu ji ndị Juu nile ịdụnye ihe n’ọnụ ọnụ uwe ha, ndị Farisii nwara ịdọrọ mmasị ndị mmadụ site n’ịdụnye ihe dịfere ogologo ókè n’ọnụ ọnụ uwe ha. Ha na-eji mpako egosipụta obere akpa akwụkwọ nsọ ha e mere ka ha dị obosara bụ́ ndị na-eyi ọgwụ nchebe. (Matiu 6:5; 23:5-8) Ihu abụọ ha, anyaukwu ha, na mpako ha mesịrị n’ikpeazụ wetara ha mmechuihu.
Jisọs kwupụtara ọjụjụ Chineke jụrụ ndị Farisii, sị: “Ndị ihu abụọ, Aịsaịa buru amụma nke ọma banyere unu, sị, Ndị nke a na-asọpụrụ m n’egbugbere ọnụ ha; ma obi ha dị anya n’ebe M nọ. Ma ha na-ebiri m isiala n’efu, na-ezi ihe mmadụ nyere n’iwu ka ha bụrụ ozizi ha.” (Matiu 15:7-9) Ezi omume ha bụ n’ezie ezi omume onwe onye. N’ụzọ a ga-aghọta, Jisọs dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị, sị: “Na-ezenụ ihe ndị Farisii, bụ́ ihe na-eko achịcha.” (Luk 12:1) Taa, anyị onwe anyị kwa aghaghị ‘izere’ ezi omume onwe onye ma ọ bụ iche nche megide ịghọ ndị ihu abụọ nke okpukpe.
N’ime nke ahụ, anyị kwesịrị ịghọta na mmadụ adịghị aghọ onye ezi omume n’anya onwe ya n’otu ụbọchị. Kama nke ahụ, ọchịchọ nke a na-egbebata nwayọọ nwayọọ ruo ogologo oge ụfọdụ. Ọbụna n’amaghị ama mmadụ pụrụ inweta àgwà ahụ na-adịghị mma nke ndị Farisii.
Omume Ịka Ndị Ọzọ Elu
Gịnị bụ ụfọdụ àgwà ndị anyị na-aghaghị ‘izere’? Ndị bụ ndị ezi omume n’anya onwe ha ‘na-ekwukarị okwu, na-eguzokarịkwa, ma na-elekarị anya dị ka a ga-asị na ha emetụbeghị ihe ọjọọ,’ ka akwụkwọ bụ́ Encyclopædia of Religion and Ethics na-akọwa. Ndị bụ ndị ezi omume n’anya onwe ha na-etukwa ọnụ ma na-ebuli onwe ha elu, nke bụ́ nsogbu gbara ọkpụrụkpụ ndị Farisii nwere.
Jisọs ji otu ilu kọwaa àgwà nke a nke ndị Farisii: “Ndị ikom abụọ rịgoro n’ụlọ ukwu Chineke ikpe ekpere; otu n’ime ha bụ onye Farisii, ibe ya bụ onye ọna ụtụ. Onye Farisii guzoro na-ekpe ekpere nye onwe ya otú a, sị, Chineke, ekelee m Gị, na adịghị m ka ndị fọdụrụ n’etiti mmadụ, ndị na-apụnara mmadụ ihe, ndị ajọ omume, ndị na-akwa iko, ma ọ bụ dị ka ọbụna onye ọna ụtụ a. Ana m ebu ọnụ ugbo abụọ n’izu ụbọchị asaa; ana m enye otu ụzọ n’ụzọ iri n’ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke m natara.” N’ụzọ dị iche onye ọna ụtụ ahụ ji obi umeala kweta njehie ya ma ghọọ onye ezi omume karịa onye Farisii ahụ na-etu ọnụ. Ndị Jisọs tụụrụ ilu a bụ ndị ahụ “tụkwasịrị obi n’onwe ha na ha bụ ndị ezi omume, ndị kpọkwara ndị nile fọdụrụ ihe efu.”—Luk 18:9-14.
Dị ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè anyị pụrụ mgbe ụfọdụ iche na anyị ka ndị ọzọ mma n’ihi ikike ebumpụta ụwa ma ọ bụ ihe ndabara ọma anyị. Ma ndị Kraịst kwesịrị iwepụ ụdị echiche ndị ahụ ngwa ngwa. Ị pụrụ inwe ọtụtụ afọ nke ahụmahụ n’ibi ndụ ndị Kraịst. Ị pụrụ ịbụ onye nkụzi Bible nwere nkà. Ma ọ bụ ma eleghị anya ị pụrụ ikwu na e tewo gị mmanụ isoro Kraịst chịa achịa n’eluigwe. Ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ na-enweta ihe ùgwù ndị pụrụ iche dị ka ndị ozi oge nile, ndị okenye, ma ọ bụ ndị ohu na-eje ozi. Jụọ onwe gị, ‘Mmetụta dị aṅaa ka Jehova ga-enwe ma ọ bụrụ na mụ ejiri ihe o nyere m mere ihe mgbakwasị ụkwụ maka inwe echiche ịka ndị ọzọ elu?’ N’ezie, nke a ga-ewute ya.—Ndị Filipaị 2:3, 4.
Mgbe onye Kraịst na-egosipụta mmụọ nke ịka ukwuu n’ihi ikike ime ihe, ihe ùgwù dị iche iche, ma ọ bụ ịchịisi ndị Chineke nyere ya, n’ezie ọ na-apụnara Chineke otuto na ekele nke nanị Ya kwesịrị ịnata. N’ụzọ doro anya Bible na-adụ onye Kraịst ọdụ ka ọ ghara “ịtụkwasị uche n’onwe ya karịa nke o kwesịrị ịtụkwasị uche.” Ọ na-agba anyị ume, sị: “Na-atụkwasịnụ uche n’otu ihe ahụ n’ebe ibe unu nọ. Unu atụkwasịla uche n’ihe dị elu, kama ka ndị ọnọdụ ha dị ala na-adọrọ unu iso ha. Unu enwela uche n’anya onwe unu.”—Ndị Rom 12:3, 16.
“Unu Ekpela Ikpe”
Dị ka otu akwụkwọ ihe ọmụma Bible si kwuo, onye bụ onye ezi omume n’anya onwe ya “na-ele onwe ya anya dị ka onye ziri ezi n’omume ma ọ bụ onye nọ n’ezi nguzo n’ebe Chineke nọ n’ihi ịrapara n’ihe iwu ndị ahụ chọrọ kpọmkwem n’echebaraghị mmụọ ha echiche.” Akwụkwọ ọzọ na-akọwa ndị bụ ndị ezi omume n’anya onwe ha dị ka “ndị na-ekpe okpukpe gafee ókè bụ́ ndị na-eji oge ha nile na-achọpụta ajọ omume n’ime ndị ọzọ.”
Ikpe mara ndị Farisii na nke a. Mgbe e mesịrị iwu ha mmadụ mere yiri ihe dị mkpa karịa iwu na ụkpụrụ Chineke. (Matiu 23:23; Luk 11:41-44) Ha mere onwe ha ndị ikpe, nweekwa ọchịchọ ịkatọ onye ọ bụla na-erughị ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nke ezi omume onwe onye ha. Omume ha nke ịka ndị ọzọ elu na ùgwù onwe onye gafere ókè mere ka e nwee mkpa nke ịchịkwa ndị ọzọ. Ha ịbụ ndị na-enweghị ike ịchịkwa Jisọs were ha iwe, ya mere ha mere atụmatụ nzuzo igbu ya.—Jọn 11:47-53.
Lee otú o si bụrụ ihe na-adịghị eme obi ụtọ isoro onye na-esetịpụ onwe ya dị ka onye ikpe nọrọ, bụ́ onye na-ele anya maka njehie mgbe nile, na-enyocha ma na-achọ ịmata ihe onye ọ bụla nọ ya n’akụkụ na-eme. N’ezie, o nweghị onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ nke nwere ikike ịmanye ndị ọzọ ịnakwere echiche na ụkpụrụ nke ya onwe ya mere. (Ndị Rom 14:10-13) Ndị Kraịst nwere ezi nguzo na-aghọta na ọtụtụ akụkụ nke ndụ a na-adị kwa ụbọchị bụ ihe onye ọ bụla n’otu n’otu ga-emere mkpebi. Ndị ahụ nwere ọchịchọ ịbụ ndị nwere ụkpụrụ izu okè ma na-achọ ihe gafere ókè n’aka ndị mmadụ karịsịa aghaghị izere ikpe ndị ọzọ ikpe.
N’eziokwu, e nyere ọgbakọ ndị Kraịst ike inwe ihe nduzi ndị ga-etinye ihe n’ịga were were nke nzukọ elu ala Jehova. (Ndị Hibru 13:17) Ma ụfọdụ agbanweela ihe nduzi ndị a ma ọ bụ gbakwụnye ụkpụrụ nke ha. N’otu ebe ndị mmụta nile n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke aghaghị iyiri suit ma kpọchie jaket ha mgbe ha na-eme ihe omume. Onye mmụta ọ bụla na-emeghị nke ahụ agaghị eru eru inye okwu ndị ọzọ n’ọdịnihu. Kama iti ụdị iwu ndị ahụ na-adịghị nro, ọ̀ bụ na ọ bụghị ihe ezi uche dị na ya karị ma kwekọọ na mmụọ nke Okwu Chineke inye nduzi obi ọma, nke onwe onye dị ka a chọrọ?—Jemes 3:17.
Ezi omume onwe onye pụkwara ịkwalite echiche nke na ọ bụrụ na onye Kraịst na-enwe ọtụtụ ihe isi ike onwe onye, ọ ghaghị ịbụ na o nwere ihe kọrọ ya n’ime mmụọ. Nke ahụ bụ kpọmkwem ihe Elifaz, Bildad, na Zofa ndị bụ́ ndị ezi omume n’anya onwe ha chere banyere Job kwesịrị ntụkwasị obi. Ha enweghị ihe ọmụma zuru ezu banyere ọnọdụ ahụ, ya mere ọ bụ mpako n’ebe ha nọ ibo Job ebubo ime ihe ọjọọ. Jehova nyere ha ntaramahụhụ maka ha ile ọnwụnwa nile nke Job anya n’ụzọ na-ezighị ezi.—Lee Job, isi nke 4, 5, 8, 11, 18, 20.
Ịnụ Ọkụ n’Obi nke Na-ekwesịghị Ekwesị
Mgbe mgbe ezi omume onwe onye na ịnụ ọkụ n’obi bụ ụmụnne. Pọl onyeozi kwuru banyere ndị Juu ji okpukpe kpọrọ ihe dị ka ndị “na-anụ ọkụ n’obi n’ebe Chineke nọ, ma ọ bụghị dị ka mmazu si dị. N’ihi na, ebe ha na-amaghị ezi omume Chineke, na-achọkwa ụzọ ime ka ezi omume nke aka ha guzoo, ha edoghị onwe ha n’okpuru ezi omume Chineke.” (Ndị Rom 10:2, 3) Dị ka onye Farisii, Pọl n’onwe ya anụwo ọkụ n’obi n’ụzọ gafere ókè, ọ bụ ezie na ịnụ ọkụ n’obi ya bụ nke na-ekwesịghị ekwesị, ọ dabereghị n’ezi omume Jehova.—Ndị Galetia 1:13, 14; Ndị Filipaị 3:6.
N’ụzọ kwesịrị ekwesị Bible na-adụ ọdụ, sị: “Abụbigala onye ezi omume ókè; emekwala onwe gị onye mabigara ihe ókè: n’ihi gịnị ka ị ga-emebi onwe gị?” (Eklisiastis 7:16) N’ọgbakọ, onye Kraịst pụrụ ịmalite ịdị uchu, ma ịdị uchu na ịnụ ọkụ n’obi ya pụrụ ịghọ ezi omume onwe onye. Mgbe amamihe mmadụ na-edu ya karịa ezi omume Jehova, ịnụ ọkụ n’obi okpukpe pụrụ imerụ ndị ọzọ ahụ. N’ụzọ dị aṅaa?
Dị ka ihe atụ, ndị mụrụ ụmụ pụrụ iji ọrụ n’aka gabiga ókè n’igbo mkpa ime mmụọ nke ndị ọzọ, mgbe ha na-emekwa nke a ha pụrụ ileghara mkpa nke ezinụlọ nke onwe ha anya. Ma ọ bụ ndị mụrụ ụmụ pụrụ ịdị na-anụ ọkụ n’obi gafee ókè, na-achọ ihe n’aka ụmụ ha karịa ka ha pụrụ ime. (Ndị Efesọs 6:4; Ndị Kọlọsi 3:21) Mgbe ụfọdụ ụmụaka na-enweghị ike iru ihe ndị ahụ ezi uche na-adịghị na ha a chọrọ ha n’aka, ha na-emeghachi omume na nke a site n’ibi ụdị ndụ abụọ. Nne ma ọ bụ nna nwere ezi uche ga-atụle ebe ikike nke ezinụlọ ya jedebere ma mee nhazigharị ndị kwesịrị ekwesị.—Tụlee Jenesis 33:12-14.
Ịnụ ọkụ n’obi gafere ókè pụkwara ịnapụ anyị akọ, mmetụta ọmịiko, na ịdị nro, ihe ndị dịcha mkpa ná mmeso anyị na-emeso ndị ọzọ. Mmadụ pụrụ ịrụsi ọrụ ike iji mee ka ọdịmma Alaeze gaa n’ihu. Otú ọ dị, ịnụ ọkụ n’obi ya gafere ókè pụrụ imerụ ndị mmadụ ahụ mgbe ọ na-eme nke ahụ. Pọl kwuru, sị: “A sịkwa na enwere m onyinye ibu amụma, matakwa ihe omimi nile na ihe ọmụma nile; a sịkwa na enwere m okwukwe nile, nke mere m ga-enwe ike ibubiga ugwu, ma enweghị m ịhụnanya, abụghị m ihe ọ bụla. A sịkwa na eweere m ihe nile m nwere zụọ ndị ogbenye, a sịkwa na araara m ahụ m nye ka e wee ree m ọkụ, ma enweghị m ịhụnanya, ọ baghịrị m uru ọ bụla.”—1 Ndị Kọrint 13:2, 3.
Chineke Na-enye Ndị Dị Umeala n’Obi Ihu Ọma Ya
Dị ka ndị Kraịst ọ dị anyị mkpa ịmata ihe iyi egwu nke ezi omume onwe onye tupu ya amalite. Anyị aghaghị izere àgwà nke ịka ndị ọzọ elu, omume nke ikpe ndị ọzọ ikpe, na ịnụ ọkụ n’obi kpuru ìsì nke dabeere n’amamihe mmadụ.
Ka anyi ‘na-ezere’ àgwà ndị Farisii, kama ịdị na-ekpe ndị ọzọ ikpe dị ka ndị bụ ndị ezi omume n’anya onwe ha, ọ ga-aka mma ilekwasị anya n’ọchịchọ na mmasị anyị. N’eziokwu, Jisọs kpere ndị Farisii ikpe ma katọọ ha dị ka “ụmụ ajụala” kwesịrị mbibi ebighị ebi. Ma Jisọs pụrụ ịma ihe dị n’obi ndị mmadụ. Anyị apụghị.—Matiu 23:33.
Ka anyị chọọ ezi omume Chineke, ọ bụghị nke onwe anyị. (Matiu 6:33) Nanị mgbe ahụ ka anyị pụrụ inwe ihu ọma Jehova, n’ihi na Bible na-adụ anyị nile ọdụ, sị: “Were obi dị umeala kee onwe unu dị ka ákwà, ijerịtara ibe unu ozi: n’ihi na Chineke na-edo Onwe ya imegide ndị mpako, ma Ọ na-enye ndị dị umeala n’obi amara.”—1 Pita 5:5.