Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ọgbọ nke 1914—N’ihi Gịnị Ka O Ji Dị Mkpa?
    Ụlọ Nche—1992 | Mee 1
    • Na narị afọ mbụ O.A., Jisọs kwuru na ihe ịrịba ama a na-ahụ anya ga-aka ọnụnọ ya a na-adịghị ahụ anya dị ka Eze ọhụrụ nke ụwa akara. A jụrụ ya, sị: “Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọbịbịa [“ọnụnọ,” New World Translation] gị, na nke ọgwụgwụ oge a?” Gịnị bụ azịza ya? “Mba ga-ebili imegide mba ọzọ, alaeze ga-ebilikwa imegide alaeze ọzọ: oké ụnwụ na ala ọma jijiji ga-adịkwa n’ebe dị iche iche. Ma ihe ndị a nile bụ mmalite ihe mgbu.”—Matiu 24:3, 7, 8.

      N’ụzọ kwekọrọ na nke ahụ, agha ahụ tiwapụrụ na 1914 bụ nke ajọ ụkọ nri sochiri, ebe ọ bụ na a kwụsịrị imepụta ihe oriri n’ụzọ e kwesịrị ruo ihe karịrị afọ anọ. Gịnị banyere ‘ala ọma jijiji ịdị n’ebe dị iche iche’? N’ime afọ iri sochiri 1914, ihe ruru ala ọma jijiji iri ndị na-eweta mbibi gburu ihe karịrị 350,000 ndị mmadụ. (Lee igbe.) N’ezie, ọgbọ 1914 nwere ahụmahụ nke “mmalite ihe mgbu.” Eri mgbe ahụkwa, ihe mgbu anọgidewo na-eme n’ụdị nke ọdachi ndị mmadụ na-akpataghị, ụnwụ nri, na ọtụtụ agha.

      Otú o sina dị, ozi banyere nguzobe e guzobere Alaeze Chineke na 1914 bụ ozi ọma n’ihi na Alaeze ahụ ga-azọpụta ụwa nke a pụọ ná mbibi. N’ụzọ dị aṅaa? Ọ ga-ewepụ okpukpe ụgha, nke na-eme omume ihu abụọ, ọchịchị rụrụ arụ, na ajọ mmetụta nke Setan na-enwe. (Daniel 2:44; Ndị Rom 16:20; Mkpughe 11:18; 18:4-8, 24) Ọzọkwa, ọ ga-ewebata ụwa ọhụrụ nke “ezi omume bi n’ime ha.”—2 Pita 3:13.

      N’oge na-adịghị anya mgbe Agha Ụwa Mbụ gasịrị, Ndị Mmụta Bible nwere obi eziokwu, dị ka e si mara Ndịàmà Jehova n’oge ahụ, malitere ịghọta ihe ùgwù ha nwere n’ihe banyere akụkụ ọzọ nke ihe ịrịba ama nke ọnụnọ Jisọs dị ka Eze. Jisọs Kraịst buru amụma, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.”—Matiu 24:14.

      Site n’ọnụ ọgụgụ dị ala na 1919, Ndịàmà Jehova anọgidewo na-agbasa “ozi ọma nke a” n’esepụghị aka. Dị ka ihe si na nke ahụ pụta, a na-achịkọta ọtụtụ nde ndị sitere n’ihe karịrị 200 ala ugbu a dị ka ndị Alaeze Chineke ga-achị. Leekwa ụdị ngọzi ndị na-echere ndị a a ga-achị achị! Alaeze ahụ ga-akwụsị agha, ụnwụ nri, imempụ, na mmegbu. Ọ ga-emeri ọbụna ọrịa na ọnwụ!—Abụ Ọma 46:9; 72:7, 12-14, 16; Ilu 2:21, 22; Mkpughe 21:3, 4.

      Tupu ọgbọ 1914 agabiga, ọrụ nke ikwusa banyere Alaeze ahụ ga-emezuworị ihe bụ nzube ya. “Mgbe ahụ,” ka Jisọs buru n’amụma, “mkpagbu ukwu ga-adị, nke ihe dị ka ya akadịghị site ná mmalite ụwa ruo mgbe a, ee e, ọ gaghị adịkwa ma ọlị. Ọ bụrụkwa na e meghị ụbọchị ahụ ka ha dị mkpirikpi, a gaghị azọpụta mmadụ ọ bụla: ma n’ihi ndị a họpụtara a ga-eme ka ụbọchị ahụ dị mkpirikpi.”—Matiu 24:21, 22.

  • Ọgbọ nke 1914—N’ihi Gịnị Ka O Ji Dị Mkpa?
    Ụlọ Nche—1992 | Mee 1
    • [Chaatị dị na peeji nke 7]

      Ala Ọma Jijiji Ndị Mere n’Afọ Iri Sochiri 1914

      Ụbọchị: Ebe O Mere: Ọnwụ:

      January 13, 1915 Avezzano, Italy 32,600

      January 21, 1917 Bali, Indonesia 15,000

      February 13, 1918 Kwangtung Province, China 10,000

      October 11, 1918 Puerto Rico (western) 116

      January 3, 1920 Veracruz, Mexico 648

      September 7, 1920 Reggio di Calabria, Italy 1,400

      December 16, 1920 Ningsia Province, China 200,000

      March 24, 1923 Szechwan Province, China 5,000

      May 26, 1923 Iran (northeastern) 2,200

      September 1, 1923 Tokyo-Yokohama, Japan 99,300

      Site n’ihe ndepụta ahụ bụ́ “Oké Ala Ọma Jijiji Ndị Mere n’Ụwa” n’akwụkwọ bụ Terra Non Firma, nke James M. Gere na Haresh C. Shah dere.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya