Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w11 3/1 p. 2-3
  • Amụma nke Dị Oké Mkpa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Amụma nke Dị Oké Mkpa
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ànyị Na-ebi “n’Ụbọchị Ikpeazụ”?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Mak 1:15—“Alaeze Chineke Abịala Nso”
    Amaokwu Baịbụl Ndị A Kọwara
  • Ọgwụgwụ Ụwa Ọ̀ Dịla Nso?
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Ndịozi Jizọs Ajụọ Ya Ihe Ga-abụ Ihe Ịrịba Ama
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
w11 3/1 p. 2-3

Amụma nke Dị Oké Mkpa

“A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.”—MATIU 24:14.

NDỊ ọkà mmụta okpukpe kweere na amaokwu ahụ dị ezigbo mkpa. Ọ dị mkpa n’ihi na ọrụ ọ na-ekwu maka ya ga-abụ ọrụ zuru ụwa ọnụ. Ọ dịkwa mkpa n’ihi na o gosiri ọrụ Ndị Kraịst kwesịrị ịna-arụ, bụ́ ọrụ ikwusa ozi ọma a ga-ebu ụzọ rụọ iji maa ọkwa ọbịbịa nke ihe dị egwu ga-emetụta ụwa niile nke Jizọs kpọrọ “ọgwụgwụ.”

Amụma ahụ e buru n’amaokwu ahụ na-emezu taa. O metụtara gị n’ihi na ozi ọma ahụ o kwuru okwu ya ga-akpọ ndị mmadụ òkù ma dọọ ha aka ná ntị. Ọ na-enye gị ohere ịhọrọ otu n’ime ụzọ ihe abụọ: Ịnabata Alaeze Chineke ma ọ bụ imegide ya. Nke ọ bụla ị họọrọ ga-emetụta nnọọ ndụ gị.

Ka anyị tụlee oge e kwuru ihe dị n’amaokwu ahụ. Ụbọchị ole na ole tupu a kpọgbuo Jizọs, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya ma jụọ ya banyere ọdịnihu. Ha chọrọ ịma mgbe a ga-ehiwe Alaeze Chineke, bụ́ nke Jizọs kwuru banyere ya ọtụtụ ugboro. Ha chọkwara ịmara banyere “ọgwụgwụ usoro ihe a,” ma ọ bụ “ọgwụgwụ ụwa,” dị ka ụfọdụ nsụgharị si dee ya.—Matiu 24:3, Baịbụlụ nke International Bible Society.

Mgbe Jizọs na-aza ha ajụjụ ahụ, o buru amụma na a ga-enwe nnukwu agha, ụnwụ nri, ọrịa na-efe efe, na oké ala ọma jijiji. O kwukwara na mmebi iwu ga-amụba, na ndị nkụzi okpukpe ụgha ga-eduhie ọtụtụ ndị, nakwa na a ga-akpọ ezi Ndị Kraịst asị ma kpagbuo ha. Ihe a niile bụ akụkọ ọjọọ.—Matiu 24:4-13; Luk 21:11.

Ma, e nwekwara ozi ọma. Jizọs kwuziri okwu ndị ahụ e dere n’elu, bụ́ okwu kpaliri ọtụtụ ndị ime ihe kemgbe ọtụtụ narị afọ ma mee ka ha chee echiche. Ọ bụ ezie na ndị mmadụ kwetara na okwu ndị ahụ Jizọs kwuru dị mkpa, ha ekwekọrịtaghị n’ihe ọ pụtara. Olee kpọmkwem ihe bụ́ ozi ọma a? Gịnị bụ Alaeze ahụ? Olee mgbe amụma a ga-emezu, oleekwa ndị ga-emezu ya? Oleekwa ihe bụ́ “ọgwụgwụ” ahụ? Ka anyị hụ.

[Foto dị na peeji nke 2, 3]

Ihe odide Wọshịntịn Nke Oziọma Matiu, Mak, Luk na Jọn e depụtaghachiri edepụtaghachi. E dere Matiu 24:14 ka ọ gbaa okpotokpo

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’akwụkwọ bụ́ Facsimile of the Washington Manuscript of the Four Gospels in the Freer Collection 1912

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya