-
“Ihe Ndị A Aghaghị Ịpụta”Ụlọ Nche—1999 | Mee 1
-
-
Ndị Dị Ndụ Mgbe ahụ Ga-ahụ Ya
11. Gịnị ka Jisọs kwuru banyere “ọgbọ a”?
11 Ọtụtụ ndị Juu chere na usoro ofufe ha, nke hiwere isi n’ụlọ nsọ ahụ, ga-adịgide ruo oge dị anya. Ma Jisọs sịrị: “Site n’ahụ osisi fig mụtanụ . . . ya: mgbe ọ bụla alaka ya dịwara nro ugbu a, putekwa akwụkwọ ndụ ya, unu mara na mgbe okpomọkụ dị nso; otú a unu onwe unu kwa, mgbe ọ bụla unu ga-ahụ ihe ndị a nile, maranụ na Ọ nọ nso, n’ọnụ ụzọ. N’ezie asị m unu, Ọgbọ a agaghị agabiga ma ọlị, ruo mgbe ihe ndị a nile ga-eme. Eluigwe na ụwa ga-agabiga, ma okwu nile nke m agaghị agabiga ma ọlị.”—Matiu 24:32-35, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.
12, 13. Olee otú ndị na-eso ụzọ Jisọs ga-esiworị ghọta aka o zoro n’ebe “ọgbọ a” dị?
12 N’afọ ndị bu 66 O.A. ụzọ, ndị Kraịst ga-ahụworị ọtụtụ n’ime akụkụ ndị bu ụzọ nke ihe ịrịba ama ahụ ọtụtụ ihe mejupụtara ka ha na-emezu—agha, ụnwụ nri, ọbụna nkwusa sara mbara nke ozi ọma Alaeze ahụ. (Ọrụ 11:28; Ndị Kọlọsi 1:23) Otú ọ dị, olee mgbe ọgwụgwụ ihe nile ga-eru? Gịnị ka Jisọs bu n’uche mgbe ọ sịrị: “Ọgbọ a [Grik, ge·ne·aʹ] agaghị agabiga”? Mgbe mgbe Jisọs akpọwo ọgbọ ndị Juu na-emegide ya, gụnyere ndị ndú okpukpe, “ajọ ọgbọ nke na-akwakwa iko.” (Matiu 11:16; 12:39, 45; 16:4; 17:17; 23:36) Ya mere, mgbe o kwukwara ọzọ banyere “ọgbọ a” n’Ugwu Olive, ihe àmà na-egosi na o bughị n’uche agbụrụ ndị Juu dum n’akụkọ ihe mere eme nile; o bughịkwa ụmụazụ ya n’uche, ọ bụ ezie na ha bụ “ọgbọ ndị a họpụtaworo.” (1 Pita 2:9) Jisọs adịghịkwa ekwu na “ọgbọ a” bụ oge.
13 Kama nke ahụ, Jisọs bu ndị mmegide bụ́ ndị Juu n’uche bụ́ ndị ga-ahụ mmezu nke ihe ịrịba ama ahụ o nyere. Banyere izo aka e zoro ‘n’ọgbọ a’ na Luk 21:32, Prọfesọ Joel B. Green na-asị: “N’Oziọma nke Atọ ahụ, ‘ọgbọ a’ (na nkebi ahịrịokwu ndị yiri ya) egosipụtawo mgbe nile otu ìgwè ndị mmadụ bụ́ ndị na-eguzogide nzube Chineke. . . . [Ọ na-ezo aka] n’ebe ndị ji isi ike gbakụta nzube Chineke azụ nọ.”b
14. Ahụmahụ dị aṅaa ka “ọgbọ” ahụ nwere, ma olee otú ihe ọ pụtaara ndị Kraịst si dị iche?
14 Ajọ ọgbọ nke ndị mmegide bụ́ ndị Juu bụ́ ndị pụrụ ịhụ ihe ịrịba ama ahụ ka ọ na-emezu ga-ahụkwa ọgwụgwụ ahụ. (Matiu 24:6, 13, 14) Ha mekwara otú ahụ! Na 70 O.A., ndị agha Rom lọghachiri, n’okpuru idu ndú Titus, bụ́ nwa Eze Ukwu Vespasian. Ahụhụ ndị Juu ndị a nọchibigidere ọzọ n’obodo ahụ tara fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe a na-agaghị ekwere ekwere.c Onye ji anya ya hụ ihe merenụ bụ́ Flavius Josephus na-akọ na ka ọ na-erule mgbe ndị Rom bibiri obodo ahụ, ihe dị ka 1,100,000 ndị Juu anwụọlarị, a dọkwaara ihe dị ka 100,000 n’agha, nke ihe ka ukwuu n’ime ha ga-anwụ n’ụzọ dị egwu n’oge na-adịghị anya n’agụụ ma ọ bụ n’ebe ndị a na-ekiri ihe na Rom. N’ezie, mkpagbu nke 66-70 O.A. bụ nke kasịnụ Jerusalem na usoro ihe ndị Juu hụtụworo ma ọ bụ nke ha ga-ahụ. Lee ka nke ahụ si dị iche n’ihe ọ pụtaara ndị Kraịst bụ́ ndị ṅara ntị n’amụma ịdọ aka ná ntị Jisọs ma si na Jerusalem pụọ mgbe ndị agha Rom laghachisịrị azụ na 66 O.A.! A ‘zọpụtara,’ ma ọ bụ chebe ndị Kraịst e tere mmanụ bụ́ “ndị a họpụtara,” na 70 O.A.—Matiu 24:16, 22.
-
-
“Ihe Ndị A Aghaghị Ịpụta”Ụlọ Nche—1999 | Mee 1
-
-
b Ọkà mmụta bụ́ onye Britain bụ́ G. R. Beasley-Murray na-ekwu, sị: “Nkebi ahịrịokwu ahụ bụ́ ‘ọgbọ a’ ekwesịghị ịbụrụ ndị ntụgharị ihe isi ike. Ọ bụ ezie na genea n’asụrụ Grik mbụ pụtara ọmụmụ, ụmụ, n’ihi ya kwa pụta agbụrụ, . . . na [Septuagint nke Grik] a kasị jiri ya sụgharịa okwu Hibru bụ dôr, bụ́ nke pụtara afọ ndụ, oge ndụ nke ihe a kpọrọ mmadụ, ma ọ bụ ọgbọ n’echiche nke ndị dị ndụ mgbe ahụ. . . . N’okwu ndị a sịrị na Jisọs kwuru, okwu ahụ yiri ka o nwere ụzọ ihe abụọ ọ pụtara: n’otu akụkụ ọ na-ezo aka mgbe nile n’ebe ndị oge ya nọ, n’akụkụ nke ọzọ kwa ọ na-apụta nkatọ a na-ekwughị hoo haa mgbe nile.”
-