Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
“Ụlọ Nche” nke November 1, 1995, lekwasịrị anya n’ihe Jisọs kwuru banyere “ọgbọ a,” dị ka anyị na-agụ na Matiu 24:34. Nke a ọ̀ pụtara na e nwetụrụ ajụjụ banyere ma è guzobere Alaeze Chineke n’eluigwe na 1914?
Ntụle ahụ dị n’Ụlọ Nche enyeghị mgbanwe ọ bụla ma ọlị n’ozizi anyị bụ isi banyere 1914. Jisọs setịpụrụ ihe ịrịba ama nke ga-aka ọnụnọ ya n’ike Alaeze akara. Anyị nwere ihe àmà bara ụba na ihe ịrịba ama a anọwo na-emezu eri 1914. Eziokwu banyere agha, ụkọ nri, ihe otiti, ala ọma jijiji, na ihe àmà ndị ọzọ na-egosi na Jisọs anọwo na-eme ihe dị ka Eze nke Alaeze Chineke eri 1914. Nke a na-egosi na kemgbe ahụ anyị anọwo n’ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a.
Mgbe ahụ, gịnị ka Ụlọ Nche na-eme ka o doo anya? Ihe na-enye aka ịghọta ya bụ otú Jisọs si jiri okwu ahụ bụ́ “ọgbọ” mee ihe na Matiu 24:34. Ebe ahụ na-agụ, sị: “N’ezie asị m unu, Ọgbọ a agaghị agabiga ma ọlị, ruo mgbe ihe ndị a nile ga-eme.” Gịnị ka Jisọs bu n’uche site n’okwu ahụ bụ́ “ọgbọ,” ma n’ụbọchị ya ma na nke anyị?
Ọtụtụ akụkụ akwụkwọ nsọ na-emesi ya ike na Jisọs ejighị “ọgbọ” mee ihe n’ihe banyere ìgwè dị nta ma ọ bụ dị iche, nke pụtara nanị ndị ndú okpukpe Juu ma ọ bụ nanị ndị na-eso ụzọ ya na-eguzosi ike n’ihe. Kama nke ahụ, o jiri ya mee ihe n’ịkatọ ọha mmadụ nke ndị Juu bụ́ ndị jụrụ ya. Otú ọ dị, n’ụzọ na-enye obi ụtọ, ndị mmadụ n’otu n’otu pụrụ ime ihe Pita onyeozi gbara ume ya n’ụbọchị Pentikọst, chegharịanụ ma “zọpụtanụ onwe unu n’ọgbọ a dị mgbagọ.”—Ọrụ 2:40.
N’okwu ahụ, n’ụzọ doro anya Pita adịghị atụ aka kpọmkwem n’ebe afọ ndụ ma ọ bụ oge a kara aka dị, ọ dịghịkwa ejikọ “ọgbọ” ahụ na otu ụbọchị ọ bụla. O kwughị na e kwesịrị ịzọpụta ndị mmadụ pụọ n’ọgbọ ahụ nke a mụrụ n’otu afọ ahụ a mụrụ Jisọs ma ọ bụ ọgbọ ahụ a mụrụ na 29 O.A. Pita na-ekwu banyere ndị Juu na-ekweghị ekwe nke oge ahụ—ikekwe ụfọdụ ka bụ ndị na-eto eto, ndị ọzọ bụrụ okenye—bụ́ ndị nwere ohere ịnụ ozizi Jisọs, ndị hụworo ọrụ ebube ya ma ọ bụ nụ banyere ha, na ndị na-anabatabeghị ya dị ka Mesaịa.
Ihe àmà na-egosi na otú ahụ ka Pita si ghọta ojiji Jisọs jiri “ọgbọ” mee ihe mgbe ya na ndị ozi atọ ndị ọzọ so Jisọs nọrọ n’Ugwu Olive. N’ikwekọ n’okwu amụma Jisọs, ndị Juu nke oge ahụ—n’ụzọ bụ isi, ndị ha na Jisọs dịrị ndụ n’otu oge—gaje ịhụ ma ọ bụ ịnụ akụkọ agha, ala ọma jijiji, ụnwụ nri, na ihe àmà ndị ọzọ nke na ọgwụgwụ usoro ihe ndị Juu dị nso. N’eziokwu, ọgbọ ahụ agabigaghị tupu ọgwụgwụ ahụ abịa na 70 O.A.—Matiu 24:3-14, 34.
A ghaghị ikwenye na anyị ewereghị okwu Jisọs ahụ n’echiche ahụ mgbe nile. Ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-achọkarị ikwu kpọmkwem banyere ụbọchị ọgwụgwụ ahụ ga-abịa. Cheta na ọbụna ndị ozi chọrọ ka a kpọọ okwu aha karị, na-ajụ, sị: ‘Onyenwe anyị, ọ̀ bụ n’oge a ka Ị na-enyeghachi Israel alaeze?’—Ọrụ 1:6.
N’otu ụdị ezi nzube ahụ, ndị ohu Chineke n’oge ndị a agbalịwo inweta site n’ihe Jisọs kwuru banyere “ọgbọ” ụfọdụ ihe metụtara oge a kpọrọ aha nke a gbakọrọ site na 1914. Dị ka ihe atụ, otu ụzọ echiche abụrụwo na otu ọgbọ pụrụ ịnọ afọ 70 ma ọ bụ 80, nke ndị mejupụtara ya bụ ndị kataworo ahụ n’afọ ndụ iji ghọta ihe agha ụwa mbụ na ihe omume ndị ọzọ pụtara; otú a anyị pụrụ ịgbakọ n’ụzọ bụ isi otú ọgwụgwụ ahụ dịruru na nso.
N’agbanyeghị otú echiche ahụ si bụrụ nke nwere ezi ebumnobi, ò kwekọrọ na ndụmọdụ Jisọs gara n’ihu inye? Jisọs kwuru, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla matara ihe banyere ụbọchị na oge hour ahụ, ọbụna ndị mmụọ ozi nke eluigwe amataghị, Ọkpara ahụ amataghịkwa, kama ọ bụ nanị Nna m matara. . . . Ya mere, na-echenụ nche: n’ihi na unu amataghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa.”—Matiu 24:36-42.
Ya mere ihe ọmụma ọhụrụ ahụ dị n’Ụlọ Nche banyere “ọgbọ a” agbanweghị nghọta anyị nke ihe merenụ na 1914. Kama o nyere anyị nghọta ka doo anya banyere ojiji Jisọs ji okwu ahụ bụ́ “ọgbọ” mee ihe, na-enyere anyị aka ịhụ na ojiji o jiri ya mee ihe abụghị ihe ndabere nke ime ngụkọ—na-agụ site na 1914—otú anyị si nọrọ ọgwụgwụ nso.