-
Ì Jikerewo Maka Ụbọchị Jehova?Ụlọ Nche—1997 | Mach 1
-
-
9. Gịnị ka Jisọs mere ka ọ pụta ìhè, dị ka e dekọrọ na Matiu 24:36?
9 A na-emezu ọrụ nkwusa Alaeze ahụ e buru amụma ya na akụkụ ndị ọzọ nke ihe àmà nke ọnụnọ Jisọs kpọmkwem ugbu a. N’ihi ya, ọgwụgwụ dị nso maka ajọ usoro ihe a. N’eziokwu, Jisọs kwuru, sị: “Ma ọ dịghị onye ọ bụla matara ihe banyere ụbọchị na oge hour ahụ, ọbụna ndị mmụọ ozi nke eluigwe amataghị, Ọkpara ahụ amataghịkwa, kama ọ bụ nanị Nna m matara.” (Matiu 24:4-14, 36) Ma amụma Jisọs pụrụ inyere anyị aka ijikere maka “ụbọchị na oge hour ahụ.”
-
-
Ì Jikerewo Maka Ụbọchị Jehova?Ụlọ Nche—1997 | Mach 1
-
-
14. Gịnị ka Jehova mesịrị gwa Noa, n’ihi gịnịkwa?
14 Ka ọ fọrọ nke nta ka a rụchaa ụgbọ ahụ, Noa pụrụ icheworị na Iju Mmiri ahụ dị nso, ọ bụ ezie na ọ maghị kpọmkwem mgbe ọ ga-ewere ọnọdụ. Jehova mesịrị gwa ya: “Ọ fọdụrụ ụbọchị asaa, Mụ onwe m gaje ime ka mmiri zosa n’ụwa ụbọchị [iri anọ] ehihie na abalị.” (Jenesis 7:4) Nke ahụ nyere Noa na ezinụlọ ya oge zuru nnọọ ezu ịkpọba ụdị anụmanụ nile n’ime ụgbọ ahụ ma banye na ya n’onwe ha tupu Iju Mmiri ahụ amalite. Ọ dịghị anyị mkpa ịmara ụbọchị na hour maka mmalite nke mbibi usoro ihe a; e nyefeghị anyị nlanarị nke ụmụ anụmanụ n’aka, ndị mmadụ ga-alanarị ya abanyewelarị n’ụgbọ ihe atụ ahụ, paradaịs ime mmụọ nke ndị Chineke.
-