-
“Gwa Anyị, Olee Mgbe Ihe Ndị A Ga-eme?”Ụlọ Nche—2013 | Julaị 15
-
-
16. Olee amaokwu Baịbụl ndị ọzọ kwuru banyere ọbịbịa Jizọs?
16 Jizọs kwuru banyere ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ohu ahụ ma ọ bụrụ na nna ya ukwu abịarute wee hụ ya ka ọ na-eme otú ahụ.” N’ilu ahụ Jizọs tụrụ banyere ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke, o kwuru, sị: “Mgbe ha na-aga ịzụta mmanụ, nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ bịarutere.” N’ilu ọ tụrụ banyere talent, o kwuru, sị: “Mgbe ogologo oge gasịrị, nna ukwu nke ndị ohu ahụ lọtara.” N’ilu ahụ, nna ukwu ahụ sịrị: “Mgbe m lọtara, m gaara anata ihe m.” (Mat. 24:46; 25:10, 19, 27) Gịnị ka ọbịbịa Jizọs e kwuru okwu ya n’amaokwu anọ ndị a pụtara?
17. Gịnị ka anyị kwuburu banyere mbịarute Jizọs e kwuru okwu ya na Matiu 24:46?
17 N’oge gara aga, anyị kwuru n’akwụkwọ anyị na amaokwu anọ ndị ikpeazụ ahụ na-ekwu banyere mgbe Jizọs bịara n’afọ 1918. Dị ka ihe atụ, chegodị ihe Jizọs kwuru banyere “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche.” (Gụọ Matiu 24:45-47.) Anyị ghọtaburu na ‘mbịarute’ ahụ e kwuru okwu ya n’amaokwu nke iri anọ na isii mezuru mgbe Jizọs bịara n’afọ 1918 ka ọ mata otú ndị e tere mmanụ si arụ ọrụ o nyere ha. Anyị cheburu na ọ bụ n’afọ 1919 ka Jizọs mere ohu ahụ onye na-elekọta ihe niile o nwere. (Mal. 3:1) Ma, ọ bụrụ na anyị elebakwuo anya n’amụma ahụ Jizọs buru, anyị ga-achọpụta na e kwesịrị ịgbanwe ihe anyị ghọtara banyere mgbe ihe ụfọdụ Jizọs kwuru ga-emezu. Maka gịnị?
18. Ọ bụrụ na anyị elebakwuo anya n’ihe niile Jizọs kwuru n’amụma ahụ o buru, olee ihe anyị ga-aghọta banyere ọbịbịa ya?
18 ‘Ọbịbịa’ e kwuru okwu ya n’amaokwu ndị bu Matiu 24:46 ụzọ na-ekwu banyere mgbe Jizọs ga-abịa ikpe ndị mmadụ ikpe na ibibi ndị ajọ omume n’oké mkpagbu ahụ. (Mat. 24:30, 42, 44) Dị ka anyị tụlere na paragraf nke iri na abụọ, ‘ọbịbịa’ Jizọs e kwuru okwu ya na Matiu 25:31 bụ mgbe ahụ Jizọs ga-abịa ikpe ndị mmadụ ikpe n’ọdịnihu. N’ihi ya, ihe ahụ Jizọs kwuru na Matiu 24:46, 47 na ya ga-abịa mee ka ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-elekọta ihe niile o nwere ga-eme n’ọdịnihu, ya bụ, n’oké mkpagbu ahụ.f Ugbu a anyị lebachara anya n’ihe niile Jizọs kwuru n’amụma ahụ o buru, o doro anya na ugboro asatọ ndị ahụ o kwuru na ya ga-abịa bụ mgbe ọ ga-ekpe ndị mmadụ ikpe n’oké mkpagbu ahụ.
-
-
“Gwa Anyị, Olee Mgbe Ihe Ndị A Ga-eme?”Ụlọ Nche—2013 | Julaị 15
-
-
e Paragraf nke 15: E si n’okwu Grik bụ́ erʹkho·mai sụgharịta okwu ndị ahụ bụ́ ‘ọbịbịa’ na ‘ịbịarute.’
f Paragraf nke 18: Dị ka e kwuru, okwu Grik e si sụgharịta “abịarute” na Matiu 24:46 bụkwa otu okwu Grik ahụ e si sụgharịta “na-abịa” na “ga-abịa” na Matiu 24:30, 42, 44.
-