-
Mụta Ihe n’Ilu Jizọs Tụrụ Banyere TalentỤlọ Nche—2015 | Mach 15
-
-
AJỌ OHU DỊ UMENGWỤ
14, 15. Ihe Jizọs kwuru ọ̀ pụtara na ọtụtụ ndị e tere mmanụ ga-abụ ajọ ohu dị umengwụ? Kọwaa.
14 N’ilu ahụ, ohu nke ikpeazụ gara zoo talent ya n’ala kama iji ya zụọ ahịa ma ọ bụ nye ya ndị na-echekwa ego. Ihe a o mere adịghị mma n’ihi na ọ kpachaara anya mee ihe ghọrọ nna ya ukwu ahịa. Nna ya ukwu kpọrọ ya “ajọ ohu dị umengwụ” ma nara ya talent ahụ, nye ya ohu ahụ nwere talent iri. A tụpụrụ ohu a na-abaghị uru “n’ọchịchịrị dị n’èzí.” “N’ebe ahụ ka ọ ga-akwa ákwá ma taa ikikere ezé.”—Mat. 25:24-30; Luk 19:22, 23.
15 Ebe ọ bụ na otu n’ime ndị ohu atọ ahụ zoro talent ya n’ala, ọ̀ pụtara na Jizọs na-ekwu na e kee ndị na-eso ụzọ ya ụzọ atọ, otu ụzọ ga-abụ ajọ ohu dị umengwụ? Mbanụ. Chegodị ihe ndị ọzọ Jizọs kwuru. N’ilu ọ tụrụ gbasara ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, o kwuru banyere ajọ ohu nke tiri ndị ohu ibe ya ihe. Ihe ahụ o kwuru apụtaghị na ọ na-ebu amụma na ụfọdụ ndị ohu ya ga-abụ ajọ ohu. Kama, o ji ya dọọ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi aka ná ntị ka ha ghara ịkpa àgwà ka ajọ ohu ahụ. Otú ahụkwa ka ọ dị n’ilu Jizọs tụrụ gbasara ụmụ agbọghọ iri na-amaghị nwoke. Ihe o kwuru apụtaghị na e kee ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ ụzọ abụọ, na otu ụzọ ga-eme ka ụmụ agbọghọ ise ahụ dị nzuzu. Kama, o ji ya dọọ ndị e tere mmanụ aka ná ntị banyere ihe nwere ike ime ma ọ bụrụ na ha akwụsị iche nche ma ghara ịdị njikere.f N’ihi ya, n’ilu ahụ Jizọs tụrụ banyere talent, ihe ọ na-ekwu abụghị na ọtụtụ ndị e tere mmanụ n’oge ikpeazụ a ga-abụ ajọ ohu dị umengwụ. Kama, Jizọs na-adọ ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ aka ná ntị ka ha na-arụsi ọrụ ike, ya bụ, ka ha jiri talent ha “zụọ ahịa” ma ghara ime ka ajọ ohu ahụ.—Mat. 25:16.
-