Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Jiri Obi Gị Niile Na-akwado Ụmụnna Kraịst
    Ụlọ Nche—2015 | Mach 15
    • 4 N’afọ 1881, otu Ụlọ Nche kwuru na ọ bụ Jizọs bụ “Nwa nke mmadụ,” ya bụ, “eze ahụ.” Ndị Mmụta Baịbụl n’oge ahụ ghọtara na ndị Jizọs kpọrọ “ụmụnna m” bụ ma ndị ga-eso ya chịa ma ụmụ mmadụ niile ga-ebi n’ụwa mgbe ha ga-ezu okè. Ha chere na ọ bụ n’otu puku afọ Kraịst ga-achị ka ọ ga-ekewapụ atụrụ n’ebe ewu nọ. Ha chekwara na ihe ga-eme ka a kpọọ ndị mmadụ atụrụ bụ na ha rubeere iwu Chineke isi ma hụ ndị mmadụ n’anya.

      5. N’afọ 1923, olee otú Chineke si nyere ndị ya aka ịghọtakwu ilu ahụ Jizọs tụrụ gbasara atụrụ na ewu?

      5 Jehova mechara nyere ndị ya aka ịghọtakwu ilu ahụ. Ụlọ Nche Bekee nke October 15, 1923, kwuru na “Nwa nke mmadụ” bụ Jizọs. Ma o ji amaokwu Baịbụl ụfọdụ kọwaa na ụmụnna Jizọs n’ilu ahụ bụ naanị ndị ga-eso Jizọs chịa, kwuokwa na atụrụ ahụ bụ ndị nwere olileanya ibi n’ụwa mgbe Alaeze Kraịst ga na-achị. Oleekwanụ mgbe ọ ga-ekewapụ atụrụ n’ebe ewu nọ? Ụlọ Nche ahụ kwuru na ụmụnna Kraịst ga-eso ya nọrọ n’eluigwe na-achị n’otu puku afọ ahụ. N’ihi ya, ọ bụghị mgbe ahụ ka ndị ahụ ga-ebi n’ụwa ga-enyere ha aka ma ọ bụ leghara ha anya. Ọ bụ ya mere o ji bụrụ na a ga-ekewapụ atụrụ n’ebe ewu nọ tupu otu puku afọ ahụ Kraịst ga-achị. Ụlọ Nche ahụ kwukwara na ihe mere Jizọs ga-eji kpọọ ndị mmadụ atụrụ bụ na ha kwetara na Jizọs bụ Onyenwe ha, nweekwa olileanya na Alaeze Chineke ga-eme ka ihe dị mma.

  • Jiri Obi Gị Niile Na-akwado Ụmụnna Kraịst
    Ụlọ Nche—2015 | Mach 15
    • 7. Olee otú anyị si ghọtakwuo ilu ahụ ugbu a?

      7 Taa, anyị aghọtakwuola ilu ahụ Jizọs tụrụ banyere atụrụ na ewu. Anyị ma na “Nwa nke mmadụ” ma ọ bụ “Eze” ahụ bụ Jizọs. Ndị ọ kpọrọ “ụmụnna m” bụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị e tere mmanụ, bụ́ ndị ga-eso ya chịa n’eluigwe. (Rom 8:16, 17) “Atụrụ” na “ewu” nọchiri anya ndị mmadụ si ná mba niile. Ha abụghị ndị e tere mmanụ. Oleekwanụ mgbe a ga-ekpe ha ikpe? Ọ bụ mgbe ọ ga-afọ obere ka oké mkpagbu ahụ ga-amalite n’oge na-adịghị anya gwụchaa. Gịnị mere a ga-eji kpọọ ụfọdụ atụrụ ma ọ bụ ewu? Ọ bụ n’ihi otú ha si meso ndị e tere mmanụ, ya bụ, ụmụnna Jizọs ndị ka nọ n’ụwa. Ebe ọ bụ na ọgwụgwụ ụwa a adịla nso, obi dị anyị ezigbo ụtọ na Jehova ji nwayọọ nwayọọ nyere anyị aka ịghọta ilu a na ilu ndị ọzọ dị na Matiu isi 24 na 25.

  • Jiri Obi Gị Niile Na-akwado Ụmụnna Kraịst
    Ụlọ Nche—2015 | Mach 15
    • 9 Anyị kwesịrị ibu ụzọ cheta na Jizọs ji ilu ahụ akụzi ihe. O doro anya na ọ naghị ekwu banyere atụrụ na ewu nkịtị. N’ihi ya, ọ naghị ekwu na onye ọ bụla bụ́ atụrụ ga-enye ụmụnna ya nri, yiwe ha uwe, lekọta ha, ma ọ bụ gaa hụ ha n’ụlọ mkpọrọ. Kama, ọ na-ekwu otú ndị ahụ bụ́ atụrụ ga-esi meso ụmụnna ya. O kwuru na ndị bụ́ atụrụ bụ “ndị ezi omume” n’ihi na ha ghọtara na Ndị Kraịst e tere mmanụ ka nọ n’ụwa bụ ụmụnna Kraịst, jirikwa obi ha niile na-akwado ha n’oge ikpeazụ a dị oké egwu.—Mat. 10:40-42; 25:40, 46; 2 Tim. 3:1-5.

      10. Olee otú ndị bụ́ atụrụ si emere ụmụnna Kraịst ihe ọma?

      10 Ihe ọzọ anyị ga-echebara echiche bụ ihe Jizọs na-ekwu mgbe ọ tụrụ ilu ahụ. Ọ na-ekwu banyere ihe ndị ga-egosi na ọgwụgwụ eruola nso. (Mat. 24:3) Ná mmalite, Jizọs kwuru na otu n’ime ihe ịrịba ama ndị ahụ bụ na a ga-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke “n’elu ụwa dum mmadụ bi.” (Mat. 24:14) Tupu o kwuo banyere atụrụ na ewu, ọ tụrụ ilu banyere talent. Dị ka anyị mụrụ n’isiokwu bu nke a ụzọ, Jizọs tụrụ ilu ahụ iji kụziere “ụmụnna” ya e tere mmanụ na ha kwesịrị iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma. Ma, ndị e tere mmanụ nọ n’ụwa dị naanị ole na ole. Ọrụ ha ga-arụ buru ibu, ya bụ, ikwusara “mba niile” ozi ọma tupu ọgwụgwụ eruo. Ilu ahụ Jizọs tụrụ banyere atụrụ na ewu gosiri na e nwere ndị ga-enyere ndị e tere mmanụ aka. N’ihi ya, otu n’ime ụzọ ndị bụ́ atụrụ si emere ụmụnna Kraịst ihe ọma bụ ịkwado ha n’ọrụ ikwusa ozi ọma. Ma, olee otú ha ga-esi na-akwado ha? Ọ̀ bụ naanị ịna-enye ha onyinye na ịna-agba ha ume, ka è nwere ihe ọzọ ha kwesịrị ịna-eme?

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya