-
Gịnị Mere Otú Ndịàmà Jehova Si Eme Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị Ji Dị Iche n’Otú Chọọchị Ndị Ọzọ Si Eme Ya?Ajụjụ Ndị Mmadụ Na-ajụkarị Gbasara Ndịàmà Jehova
-
-
Ihe mere ụfọdụ ndị ji kwere na achịcha na mmanya ahụ na-aghọ ahụ́ na ọbara Jizọs bụ n’ihi otú Baịbụl ụfọdụ si sụgharịa ihe ahụ Jizọs kwuru. Dị ka ihe atụ, n’ọtụtụ Baịbụl, e dere na Jizọs kwuru banyere mmanya ahụ, sị: “Nke a bụ ọbara m.” (Matiu 26:28) Ma, otú ọzọ e nwere ike isi sụgharịa ihe ahụ Jizọs kwuru bụ “Nke a pụtara ọbara m,” “Nke a nọchiri anya ọbara m,” ma ọ bụ “Nke a bụ ihe e ji dochie anya ọbara m.”e Jizọs ji ihe atụ kwuo okwu mgbe ahụ otú ahụ o si ejikwa ihe atụ akụzi ihe.—Matiu 13:34, 35.
-