-
Ozizi Elu Ugwu Ahụ A Ma AmaJizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
-
-
Ọ sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha, n’ihi na alaeze eluigwe bụ nke ha. Obi ụtọ na-adịrị ndị na-eru uju, n’ihi na a ga-akasi ha obi. . . . Obi ụtọ na-adịrị ndị agụụ na-agụ, ndị akpịrị na-akpọkwa nkụ maka ezi omume, n’ihi na a ga-eme ka afọ ju ha. . . . Obi ụtọ na-adịrị ndị a kpagbuworo n’ihi ezi omume, n’ihi na alaeze eluigwe bụ nke ha. Obi ụtọ na-adịrị unu mgbe ndị mmadụ na-akọcha unu ma na-akpagbu unu . . . n’ihi m. Ṅụrịanụ ọṅụ, nweekwanụ obi ụtọ nke ukwuu.”—Matiu 5:3-12.
-
-
Ozizi Elu Ugwu Ahụ A Ma AmaJizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
-
-
Jizọs sịrị na ndị ọ na-agụsi agụụ ike ka ha na Chineke dịrị ná mma, ndị ọ na-ewute n’ihi na ha bụ ndị mmehie, nakwa ndị bịara mara Chineke ma na-efe ya ofufe, bụ ndị nwere obi ụtọ n’eziokwu. Ọ bụrụgodị na a kpọrọ ha asị ma ọ bụ na-akpagbu ha n’ihi na ha na-eme uche Chineke, ha nwere obi ụtọ n’ihi na ha ma na ha na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ, marakwa na ọ ga-enye ha ndụ ebighị ebi.
-