-
Olee Otú E Si Na-ekwusa Ozi Ọma?Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
ISI NKE 21
Olee Otú E Si Na-ekwusa Ozi Ọma?
N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-eji Alaeze ya wepụ nsogbu niile na-echi anyị ọnụ n’ala. Mmadụ niile kwesịrị ịnụ ozi ọma a na-eme obi ụtọ. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha gaa kwusaara mmadụ niile ozi ọma a. (Matiu 28:19, 20) Olee otú Ndịàmà Jehova si eme ihe a Jizọs kwuru?
1. Olee otú ihe e kwuru na Matiu 24:14 si na-emezu taa?
Jizọs buru amụma, sị: ‘A ga-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ebe niile n’ụwa.’ (Matiu 24:14) Obi dị Ndịàmà Jehova ụtọ na ha na-ekwusara ndị ọzọ ozi ọma. Anyị na-ekwusa ozi ọma a n’ụwa niile n’ihe karịrị otu puku asụsụ. E kwesịrị ịgbasi mbọ ike n’ọrụ a na-abụghị obere ọrụ. E kwesịkwara ịhazi ya nke ọma. E nweghị otú anyị ga-esi rụọ ya ma ọ bụrụ na Jehova anaghị enyere anyị aka.
2. Olee mbọ ndị anyị na-agba ka anyị nwee ike izi ndị mmadụ ozi ọma?
Anyị na-aga ebe ọ bụla anyị ga-ahụ ndị mmadụ zie ha ozi ọma. Anyị na-ezi ndị mmadụ ozi ọma “n’ụlọ n’ụlọ” otú ahụ Ndị Kraịst oge mbụ mere. (Ọrụ Ndịozi 5:42) Otú a a haziri ahazi anyị si ezi ozi ọma na-eme ka anyị nwee ike izi ọtụtụ nde mmadụ ozi ọma n’afọ ọ bụla. Ebe ọ bụ na ndị mmadụ anaghị anọ n’ụlọ mgbe niile, anyị na-aga n’ebe ha na-anọkarị zie ha ozi ọma. Anyị na-achọ oge ọ bụla dabara adaba anyị ga-eji gwa ndị mmadụ gbasara Jehova na ihe ndị ọ chọrọ ime.
3. Ònye kwesịrị ịna-ekwusa ozi ọma?
Onye ọ bụla bụ́ ezigbo Onye Kraịst kwesịrị ịna-ekwusa ozi ọma. Anyị ejighị ikwusa ozi ọma egwu egwu. Anyị na-ekwusa ozi ọma a ruo otú ọnọdụ anyị kwere anyị, n’ihi na anyị ma na o nwere ike ịzọ ndị mmadụ ndụ. (Gụọ 1 Timoti 4:16.) A naghị akwụ anyị ụgwọ maka ozi ọma a anyị na-ekwusa, n’ihi na Baịbụl sịrị: “Unu natara n’efu, na-enyenụ n’efu.” (Matiu 10:7, 8) Ọ bụghị mmadụ niile na-ege ntị ma anyị ziwe ha ozi ọma. Ma, anyị anaghị akwụsị ikwusa ozi ọma n’ihi na anyị ma na o so n’otú anyị si efe Jehova, ọ na-emekwa ya obi ụtọ.
MỤTAKWUO IHE
Chọpụtakwuo mbọ dị iche iche Ndịàmà Jehova na-agba ka ha nwee ike ikwusara ndị mmadụ ozi ọma n’ụwa niile. Chọpụtakwa otú Jehova si enyere anyị aka.
Ebe dị iche iche a na-ekwusa ozi ọma n’ụwa: (A) Kosta Rika, (B) Amerịka, (CH) Bene, (D) Taịland, (E) Yap, (F) Swidin
4. Anyị na-agbasi mbọ ike ka anyị zie mmadụ niile ozi ọma
Ndịàmà Jehova na-agba mbọ pụrụ iche ka ha zie ndị mmadụ ozi ọma n’agbanyeghị ebe ha nọ. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Gịnị masịrị gị n’ụdị mbọ Ndịàmà Jehova na-agba ka ha zie ndị mmadụ ozi ọma?
Gụọnụ Matiu 22:39 na Ndị Rom 10:13-15. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Olee otú ozi ọma anyị na-ekwusa si egosi na anyị hụrụ ndị mmadụ n’anya?
Olee otú i chere obi na-adị Jehova ma ọ hụ ndị na-ekwusa ozi ọma? —Leruonụ anya n’amaokwu nke 15.
5. Anyị na Chineke na-arụkọ ọrụ
E nwere ọtụtụ akụkọ na-egosi na ọ bụ Jehova na-eduzi ozi ọma a anyị na-ekwusa. Dị ka ihe atụ, na Niu Ziland, mgbe otu nwanna nwoke aha ya bụ Paul nọ na-ekwusa ozi ọma n’otu ehihie, ọ hụrụ otu nwaanyị. Mgbe nwaanyị ahụ nọ na-ekpe ekpere n’ụtụtụ ụbọchị ahụ, ọ kpọrọ Chineke aha ya bụ́ Jehova ma rịọ ya ka o mee ka mmadụ bịa zie ya ozi ọma. Paul kwuru, sị: “Awa atọ o kpechara ekpere a, m bịara n’ụlọ ya.”
Gụọnụ 1 Ndị Kọrịnt 3:9. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee otú ihe ndị mere eme, dị ka nke a mere na Niu Ziland, si egosi na ọ bụ Jehova na-eduzi ozi ọma a anyị na-ekwusa?
Gụọnụ Ọrụ Ndịozi 1:8. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Gịnị mere o ji bụrụ na o nweghị ebe anyị ji azụ aga n’ozi ọma anyị na-ekwusa ma ọ bụrụ na Jehova anaghị enyere anyị aka?
Ị̀ ma ihe a?
Anyị gaa ọmụmụ ihe n’etiti izu ọ bụla, a na-akụziri anyị otú anyị ga-esi na-ezi ozi ọma. Ọ bụru na e nwetụla mgbe ị bịara ọmụmụ ihe anyị a, olee ihe i chere gbasara otú e si akụziri anyị ikwusa ozi ọma?
6. Anyị na-erube isi n’iwu Chineke nyere anyị ka anyị na-ekwusa ozi ọma
N’oge Ndị Kraịst oge mbụ, ndị mmadụ nọ na-anwa ka ndị na-eso ụzọ Jizọs kwụsị ikwusa ozi ọma. Ndị Kraịst oge mbụ a gbasiri mbọ ike ka ha ghara ịkwụsị ikwusa ozi ọma. Ha gbalịrị “iji ihe iwu kwuru kwado izisa ozi ọma.” (Ndị Filipaị 1:7) Ndịàmà Jehova na-emekwa otú ahụ n’oge a.a
Gụọnụ Ọrụ Ndịozi 5:27-42. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Gịnị mere na anyị agaghị akwụsị ikwusa ozi ọma?—Leruonụ anya n’amaokwu nke 29, 38, na 39.
MMADỤ NWERE IKE ỊJỤ GỊ ihe mere Ndịàmà Jehova ji aga n’ụlọ n’ụlọ na-ezi ndị mmadụ ozi ọma.
Gịnị ka ị ga-aza onye ahụ?
NCHỊKỌTA
Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha gaa ebe niile n’ụwa kwusaa ozi ọma. Jehova na-enyere anyị aka n’ozi ọma anyị na-ekwusa.
Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ
Olee otú e si ekwusa ozi ọma n’ụwa niile?
Olee otú ozi ọma anyị na-ekwusa si egosi na anyị hụrụ ndị mmadụ n’anya?
Ì chere na ozi ọma anyị na-ekwusa na-eme ka obi na-atọ anyị ụtọ? Gịnị mere i ji chee otú ahụ?
IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
Chọpụta otú Ndịàmà Jehova si ekwusa ozi ọma n’obodo ndị mepere emepe.
Ụzọ Pụrụ Iche E Si Ezi Ozi Ọma n’Ebe Ndị Na-ekwo Ekwo na Paris (5:11)
Olee otú Ndịàmà Jehova sirila nyere ndị gbara ọsọ ndụ aka?
Jiri anya gị hụ ụdị obi ụtọ mmadụ na-enwe ma ọ na-ekwusa ozi ọma mgbe niile.
Chọpụta okwu ndị gbara ọkpụrụkpụ anyị meriri n’ụlọikpe, ndị nyere aka mee ka a na-ekwusakwu ozi ọma.
a Ọ bụ Jehova gwara anyị ka anyị na-ekwusa ozi ọma, n’ihi ya, Ndịàmà Jehova anaghị eche ka ndị ọchịchị nye ha ikike tupu ha ekwusawara ndị mmadụ ozi ọma.
-
-
Ime Baptizim Ga-abara Gị Ezigbo UruNa-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
ISI NKE 23
Ime Baptizim Ga-abara Gị Ezigbo Uru
Jizọs kwuru na Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ime baptizim. (Gụọ Matiu 28:19, 20.) Ma, gịnị bụ baptizim? Oleekwa ihe dị iche iche mmadụ ga-eme tupu e mee ya baptizim?
1. Gịnị bụ baptizim?
Okwu Grik e si na ya nweta “ime baptizim” pụtara “imikpu” mmadụ n’ime mmiri. Mgbe e mere Jizọs baptizim, e mikpuru ya n’ime mmiri n’Osimiri Jọdan. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo na “o si na mmiri na-apụta” mgbe e mechara ya baptizim. (Mak 1 :9, 10) Otú ahụ ka e sikwa eme ezigbo Ndị Kraịst baptizim n’oge a. A na-emikpu ha ma ọ bụkwanụ tinye ha n’ime mmiri.
2. Gịnị ka mmadụ ime baptizim na-egosi?
Mmadụ ime baptizim na-egosi na onye ahụ enyefeela Jehova Chineke onwe ya. Olee otú mmadụ si enyefe Chineke onwe ya? Tupu mmadụ emee baptizim, ọ ga-ebu ụzọ kpee ekpere gwa Jehova na ya chọrọ ịna-efe ya ruo mgbe ebighị ebi. Ọ ga-ekwe Jehova nkwa na ya ga na-efe naanị ya nakwa na ime uche ya ga-abụ ihe kacha ya mkpa ná ndụ. Ọ ‘ga-ajụ onwe ya,’ na-eme ihe ndị Jizọs kụziri, na-emekwa ka ya. (Matiu 16:24) Inyefe Chineke onwe ya na ime baptizim ga-eme ka ya na Jehova na ndị ọzọ na-efe Jehova ịdị n’ezigbo mma kwe omume.
3. Olee ihe dị iche iche mmadụ ga-eme tupu o mee baptizim?
Tupu i mee baptizim, ị ga-ebu ụzọ mụọ gbasara Jehova, nweekwa okwukwe siri ike n’ebe ọ nọ. (Gụọ Ndị Hibru 11:6.) Ị ga na-ahụkwu Jehova n’anya ka ị na-amụtakwu gbasara ya nakwa ka okwukwe gị n’ebe ọ nọ na-esikwu ike. O doro anya na ị ga-achọ ịna-ekwusa ozi ọma gbasara ya, na-ebikwa ndụ otú dị ya mma. (2 Timoti 4:2; 1 Jọn 5:3) Ọ bụrụ na mmadụ amalite ‘ịna-eme ihe otú ndị na-efe Jehova kwesịrị ịna-eme iji na-eme ya obi ụtọ,’ o nwere ike ikpebi na ya ga-enyefe Chineke onwe ya nakwa na ya ga-eme baptizim.—Ndị Kọlọsi 1:9, 10.a
MỤTAKWUO IHE
Chọpụta ihe anyị nwere ike ịmụta na baptizim Jizọs mere. Chọpụtakwa otú mmadụ ga-esi kwadebe maka ime baptizim.
4. Ihe anyị ga-amụta na baptizim Jizọs mere
Gụọnụ Matiu 3:13-17 ka unu hụ ihe ndị ọzọ gbasara baptizim Jizọs mere. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Jizọs ọ̀ bụ nwa ọhụrụ mgbe o mere baptizim?
Olee otú e si mee ya baptizim? È fesara ya mmiri, okwu agwụ?
Ọ bụ mgbe Jizọs mechara baptizim ka ọ malitere ịrụ ọrụ pụrụ iche Chineke zitere ya n’ụwa ka ọ rụọ. Gụọnụ Luk 3:21-23 na Jọn 6:38. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Mgbe Jizọs mechara baptizim, olee ọrụ kacha ya mkpa?
5. Ị ga-emeli baptizim ma i kpebie ime ya
Inyefe Chineke onwe gị na ime baptizim nwere ike ịdị gị ka ihe ị na-agaghị emeli. Ma, oge ga-eru mgbe obi ga-esi gị ike na ị ga-enyefeli Chineke onwe gị, meekwa baptizim. Unu chọọ ịhụ ụfọdụ n’ime ndị mere ụdị ihe a, kpọnyenụ VIDIO a.
Gụọnụ Jọn 17:3 na Jems 1:5. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee ihe nwere ike inyere mmadụ aka ka ọ dị njikere ime baptizim?
6. Anyị na-esoro n’ezinụlọ Jehova ma anyị mee baptizim
Anyị mee baptizim, anyị na-esoro n’ezinụlọ zuru ụwa ọnụ nke dị n’otu. N’agbanyeghị na Ndịàmà Jehova niile merela baptizim si n’obodo dị iche iche, sikwa n’ezinụlọ dị iche iche, ha niile kweere otu ihe, na-emekwa ihe Baịbụl kwuru. Gụọnụ Abụ Ọma 25:14 na 1 Pita 2:17. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Mmadụ mee baptizim, olee otú adịm ná mma ya na Jehova nakwa adịm ná mma ya na ndị ọzọ na-efe Jehova na-abịa dịrị?
ỤFỌDỤ NA-ASỊ na ha adịbeghị njikere ime baptizim.
Ọ bụrụ na ị na-ekwu ụdị ihe a, ì chere na ime baptizim ka ga-abara gị uru?
NCHỊKỌTA
Jizọs kwuru na Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ime baptizim. Ka mmadụ nwee ike ime baptizim, onye ahụ ga-ebu ụzọ nwee ezigbo okwukwe n’ebe Jehova nọ, na-eme ihe dị ya mma, nyefeekwa ya onwe ya.
Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ
Gịnị bụ baptizim? Oleekwa uru ime baptizim ga-abara mmadụ?
Olee otú mmadụ inyefe Jehova onwe ya si gbasa onye ahụ ime baptizim?
Gịnị na gịnị ka mmadụ ga na-eme tupu o mee baptizim?
IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
Chọpụta ihe baptizim bụ nakwa ihe ọ na-abụghị.
Leruo anya n’ihe dị iche iche mmadụ ga-eme tupu o mee baptizim.
“Ịhụ Jehova n’Anya Ga-eme Ka I Mee Baptizim” (Ụlọ Nche, Mach 2020)
Gụọ isiokwu a ka ị hụ ihe mere otú nwoke ji kpebie ime baptizim.
“Ha Chọrọ Ka M Jiri Aka M Chọpụta nke Bụ́ Eziokwu” (Ụlọ Nche, Febụwarị 1, 2013)
Chọpụta uru ime baptizim ga-abara gị nakwa otú ị ga-esi kwadebe maka ya.
“È Kwesịrị Ime M Baptizim?” (Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ —Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2, isi nke 37)
a Ọ bụrụ na mmadụ emebuola baptizim mgbe ọ na-aga chọọchị, ọ ga-eme baptizim ọzọ. Maka gịnị? Ọ bụ maka na chọọchị ahụ anaghị akụzi eziokwu dị na Baịbụl.—Gụọ Ọrụ Ndịozi 19:1-5 nakwa Isi 13 n’akwụkwọ a.
-