“Ọ Bụrụ na Nnu Atụfuwo Ụtọ Ya”
ALỤWORO ya agha. E jiriwo ya mee ihe dị ka ihe e ji azụrịta ahịa. Na China oge ochie ọ bụ nanị ọlaedo karịrị ya n’ịba uru. Ee, ihe a kpọrọ mmadụ elewo nnu anya eri oge dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa. Ruo taa, a na-ekwu na o nwere ihe na-agwọ ọrịa na ihe na-egbu njé ọrịa, e jikwa ya eme ihe gburugburu ụwa dị ka ihe na-ewepụta ụtọ nri nakwa dị ka ihe e ji echekwa ihe.
N’ihi ọtụtụ ihe a na-achọsi ike nnu nwere na ihe ndị e ji ya eme, ọ bụghị ihe ijuanya na e ji ya mee ihe n’ụzọ ihe atụ n’ime Bible. Dị ka ihe atụ, Iwu Mosis kwuru na a ga-etinyerịrị nnu n’àjà ọ bụla a chụụrụ Jehova n’ebe ịchụàjà. (Levitikọs 2:13) E meghị nke a iji mee ka àjà ndị ahụ tọkwuo ụtọ, kama o yikarịrị ka ọ bụ n’ihi na nnu na-anọchite anya enweghị mmebi ma ọ bụ ire ure.
N’Ozizi Elu Ugwu ya a ma ama, Jisọs Kraịst gwara ụmụazụ ya, sị: “Unu onwe unu bụ nnu nke ụwa.” (Matiu 5:13) Site n’ikwu ihe a, Jisọs na-enye echiche na ha ikwusara ndị ọzọ banyere Alaeze Chineke ga-enwe mmetụta na-echekwa echekwa, ma ọ bụ nke na-echebe ndụ, n’ahụ ndị na-ege ha ntị. N’ezie, a ga-echebe ndị tinyere okwu Jisọs n’ọrụ pụọ ná nretọ nke omume na nke ime mmụọ e nwere n’ógbè ndị ha bi ma na-eje ozi na ha.—1 Pita 4:1-3.
Otú ọ dị, Jisọs gara n’ihu inye ịdọ aka ná ntị a: “Ma ọ bụrụ na nnu atụfuwo ụtọ ya, . . . ọ dịghịkwa irè iji mee ihe ọ bụla ọzọ, ma ọ́ bụghị ka a tufuo ya n’èzí, mmadụ azọọ ya ụkwụ.” N’ikwu okwu ná nke a, ọkà mmụta Bible bụ́ Albert Barnes sịrị na nnu Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya maara “anaghị adị ọcha, ya na ahịhịa na ihe ndị si n’ala na-agwakọta.” Ya mere ọ bụrụ na nnu ahụ atụfuo ụtọ ya, “ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu nke ihe si n’ala” pụrụ ịfọdụ. “Nke a,” ka Barnes kwuru, “abaghị uru ọ bụla ma ọ́ bụghị . . . ịwụsa ya n’ebe ndị mmadụ si agafe, ma ọ bụ n’okporo ụzọ, dị ka anyị si awụsa ajịrịja nkume.”
N’ịṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị a, ndị Kraịst kwesịrị ịkpachara anya ịghara ịkwụsị ịgba àmà ihu ọha ha ma ọ bụ ịlaghachi n’ụzọ àgwà nke asọpụrụghị Chineke. Ma ọ́ bụghị ya, ha ga-ajọwanye njọ n’ụzọ ime mmụọ, ha pụkwara ịghọ ndị na-abaghị uru ọ bụla, dị ka ‘nnu nke tụfuworo ụtọ ya.’