Chọọchị nke Oge Gboo Ọ̀ Kụziri na Chineke Bụ Atọ n’Ime Otu?
Akụkụ 1—Jisọs na Ndị Na-eso Ụzọ Ya Hà Kụziri Ozizi Atọ n’Ime Otu?
Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya hà kụziri ozizi Atọ n’Ime Otu? Ndị ndú chọọchị nke ọtụtụ narị afọ ndị sochirinụ hà kụziri ya? Olee ụzọ o si malite? N’ihi gịnịkwa ka o ji dị mkpa ịmara eziokwu banyere nkwenkwe nke a? Malite n’Akụkụ nke 1 ná mbipụta nke a, Ụlọ Nche ga-atụle ajụjụ ndị a n’otu usoro isiokwu. Isiokwu ndị ọzọ dị n’usoro nke a ga-apụta site n’oge ruo n’oge ná mbipụta ndị na-abịa n’ihu.
NDỊ nakweere Bible dị ka Okwu Chineke ghọtara na ha nwere ya dị ka ibu ọrụ dịịrị ha ịkụziri ndị ọzọ ihe banyere Onye Okike ahụ. Ha ghọtakwara na isi ihe dị n’ihe ọ bụla ha na-ezi banyere Chineke aghaghị ibụ nnọọ eziokwu.
Chineke baara “ndị nkasi obi” Job mba n’ihi na ha emeghị nke ahụ. “Jehova sịrị Elifaz, bụ́ onye Timan, Iwe m dị ọkụ megide gị, megidekwa ndị enyi gị abụọ: n’ihi na unu ekwughị ihe ziri ezi banyere m, dị ka ohu m, bụ́ Job, kwuworo.”—Job 42:7.
Pọl onyeozi, mgbe ọ na-ekwu okwu banyere mbilite n’ọnwụ, kwuru na ‘a ga-ahụ na anyị bụ ndịàmà ụgha nke Chineke’ ma ọ bụrụ na anyị akụzie ihe na-abụghị eziokwu banyere ihe omume nke Chineke. (1 Ndị Kọrint 15:15) Ebe ọ dị otú a n’ihe banyere ozizi mbilite n’ọnwụ, lee ka o si bụrụ ihe kwesiri nnọọ ekwesi na anyị aghaghị ilezi anya nke ọma mgbe anyị na-achọ ịkụzi ihe banyere onye Chineke bụ!
Ozizi Atọ n’Ime Otu
Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ chọọchị nile nke Krisendọm na-akụzi na Chineke bụ Atọ n’Ime Otu. Akwụkwọ bụ The Catholic Encyclopedia kpọrọ ozizi Atọ n’Ime Otu “ozizi bụ isi nke okpukpe ndị Kraịst,” na-akọwa ya n’ụzọ dị otú a:
“N’ịdị n’otu nke Chiatọ ahụ, e nwere Ndị Atọ, bụ́ Nna, Ọkpara, na Mmụọ Nsọ, Ndị Atọ ndị a dịkwa iche n’ezie otu site n’ebe ibe ya nọ. Otú a, n’okwu nke Ụkpụrụ Okwukwe Athanasius: ‘Nna ahụ bụ Chineke, Ọkpara ahụ bụ Chineke, Mmụọ Nsọ ahụ bụkwa Chineke, ma e nweghị Chineke atọ dịnụ kama ọ bụ otu Chineke.’ . . . Ndị ahụ na-adịrucha ebighị ebi, harakwa nhata: ha nile bụ ndị a na-ekeghị eke, bụrụkwa ndị nwere ike nile.”1
Akwụkwọ bụ The Baptist Encyclopædia nyere nkọwa yiri nke ahụ. Ọ na-asị:
“[Jisọs] bụ . . . Jehova nke na-adịru mgbe ebighị ebi . . . Mmụọ Nsọ ahụ bụ Jehova . . . E debere Ọkpara ahụ na Mmụọ Nsọ ahụ n’ọnọdụ ha nnọọ nhata, ha na Nna ahụ. Ọ bụrụ na ọ bụ Jehova, ha bụkwa.”2
Ọbụbụọnụ A Bụrụ Ndị Mmegide
N’afọ 325 O.A., otu nzukọ kansụl ndị bishọp nke zukọrọ na Nicea n’Asia Minor guzobere otu ụkpụrụ okwukwe nke kwupụtara na Ọkpara Chineke bụ “ezi Chineke” dịkwa ka Nna ahụ bụ “ezi Chineke.” Otu akụkụ nke ụkpụrụ okwukwe ahụ na-asị:
“Ma n’ihe banyere ndị ahụ na-asị, E nwere [oge] mgbe [Ọkpara ahụ] na-adịghị adị, na, Tupu a mụọ ya Ọ dịghị adị, na O sikwa n’ihe na-adịghị adị wee malite ịdị adị, ma ọ bụ ndị na-ekwu na e ji ụdị ihe dị iche mee Ọkpara Chineke, ma ọ bụ na e kere ya eke, ma ọ bụ na a pụrụ ịgbanwegharị ya agbanwegharị—Chọọchị Katọlik na-abụ ndị dị otú a ọnụ.”3
Otú a, onye ọ bụla nke kwere na Ọkpara Chineke abụghị onye na-adị ebighị ebi ya na Nna ahụ ma ọ bụkwanụ na e kere Ọkpara ahụ eke, bụ onye a na-edo iche maka amamikpe ebighị ebi. Mmadụ pụrụ nnọọ iji anya nke uche ya hụ nrụgide nke a mere ka ọ dịkwasị ìgwè ndị nkịtị ikwekọ na ya.
N’afọ 381 O.A., nzukọ kansụl ọzọ zukọrọ na Constantinople wee kwupụta na e kwesịrị ife mmụọ nsọ ahụ ofufe, nyekwa ya otuto dị ka a na-enye Nna na Ọkpara ahụ. Mgbe otu afọ gasịrị, na 382 O.A., nzukọ synod ọzọ zukọrọ na Constantinople wee mesie ya ike na mmụọ nsọ ahụ bụ chi zuru ezu.4 N’otu afọ ahụ, n’ihu otu nzukọ kansụl zukọrọ na Rom, Pope Damasus wepụtara otu nchịkọta ozizi ndị chọọchị ahụ ga-akatọ. Ihe odide ahụ, nke a kpọrọ Nnukwu Akwụkwọ nke Damasus, gụnyere okwu ndị na-esonụ:
“Ọ bụrụ na onye ọ bụla agọpụ na Nna ahụ na-adịru ebighị ebi, na Ọkpara ahụ na-adịru ebighị ebi, na Mmụọ Nsọ ahụ na-adịrukwa ebighị ebi: ọ bụ onye na-emegide okwukwe.”
“Ọ bụrụ na onye ọ bụla agọpụ na Ọkpara Chineke bụ ezi Chineke, dị ka Nna ahụ bụ ezi Chineke, na-enwe ike nile, na-ama ihe nile, harakwa ka Nna ahụ, ọ bụ onye na-emegide okwukwe.”
“Ọ bụrụ na onye ọ bụla agọpụ na Mmụọ Nsọ ahụ . . . bụ ezi Chineke . . . nwee ike nile marakwa ihe nile, . . . ọ bụ onye na-emegide okwukwe.”
“Ọ bụrụ na onye ọ bụla agọpụ na ndị atọ ahụ, bụ́ Nna ahụ, Ọkpara ahụ, na Mmụọ Nsọ ahụ, bụ ndị n’ezie, ndị ha nhata, ndị na-adịru ebighị ebi, na-enwe ihe nile n’ime onwe ha ma ndị a na-ahụ anya ma ndị a na-adịghị ahụ anya, na ha nwere ike nile, . . . ọ bụ onye na-emegide okwukwe.”
“Ọ bụrụ na onye ọ bụla ekwuo na [Ọkpara ahụ onye] e mere ka ọ ghọọ anụ ahụ anọghị n’eluigwe n’otu mgbe ahụ ọ nọkwa n’elu ala: ọ bụ onye na-emegide okwukwe.”
“Ọ bụrụ na onye ọ bụla, ọ bụ ezie na ọ na-ekwu na Nna ahụ bụ Chineke, Ọkpara ahụ bụkwa Chineke, na Mmụọ Nsọ ahụ bụkwa Chineke, . . . ma o kwughị na ha bụ otu Chineke, . . . ọ bụ onye na-emegide okwukwe.”5
Ndị ọkà mmụta bụ ndị Jesuit, ndị sụgharịrị ihe ndị a site na Latin denyere okwu nke a: “Ihe àmà gosiri na Pope St. Celestine nke Mbụ (422-432) lere ụkpụrụ ndị a a nakweere anya dị ka iwu; a pụrụ ile ha anya dị ka nkọwa nke okwukwe.”6 Onye ọkà mmụta bụ Edmund J. Fortman kwukwara na nnukwu akwụkwọ ahụ bụ “ezi ozizi atọ n’ime otu nke guzosiri ike.”7
Ọ bụrụ na ị bụ onye òtù nke chọọchị nke nakweere ozizi Atọ n’Ime Otu, okwu ndị a hà na-akọwa okwukwe gị? Ị̀ matakwara na ikwere n’ozizi Atọ n’Ime Otu dị ka chọọchị dị iche iche si akụzi ya chọrọ gị n’aka ikwere na Jisọs nọ n’eluigwe n’otu mgbe ahụ ọ nọ n’elu ala? Ozizi nke a yiri ihe onye chọọchị nke narị afọ nke anọ, bụ́ Athanasius dere n’akwụkwọ ya bụ On the Incarnation:
“Okwu ahụ [Jisọs] abụghị onye e jibidoro n’ime anụ ahụ Ya, ọnụnọ Ya n’anụ ahụ egbochighịkwa Ya ịnọ n’ebe ọzọ n’otu mgbe ahụ. Mgbe O bupụrụ anụ ahụ Ya gaa n’ebe ọzọ, Ọ kwụsịghị iduzi eluigwe na ala site n’Uche na ike Ya. . . . Ọ ka bụkwa Isi Iyi nke ndụ nye eluigwe na ala dum, ọ nọ anọ n’akụkụ ya nile, ma nọrọkwa n’ebe na-abụghị ozuzu ya.”8
Ihe Ozizi Atọ n’Ime Otu ahụ Pụtara
Ụfọdụ ndị ekwubiwo na nanị ikwu na Jisọs bụ onye a ga-efe ofufe, bụrụkwa chi bụ nanị ihe ozizi Atọ n’Ime Otu ahụ pụtara. Nye ndị ọzọ, ikwere n’Atọ n’Ime Otu pụtara nanị ikwere ná Nna ahụ, Ọkpara na mmụọ nsọ ahụ.
Otú ọ dị, ileru ụkpụrụ okwukwe dị iche iche nke Krisendọm anya nke ọma na-ekpughe otú o si bụrụ na echiche ndị ahụ ezughị nnọọ ezu ma e jiri ha tụnyere ozizi ahụ n’ụzọ e siri hazie ya. Nkọwa ndị ọnụ na-eru n’okwu nyere ya na-eme ka ọ pụta ìhè na ozizi Atọ n’Ime Otu abụghị echiche dị mfe. Kama nke ahụ, ọ bụ usoro echiche dị iche iche ndị dị mgbagwoju anya, ndị a chịkọtaworo ruo ogologo oge, tụhịkọtakwa nke ọ bụla na ibe ya.
Site n’ụzọ e si ghọta ozizi Atọ n’Ime Otu ahụ mgbe e mesịrị nzukọ Kansụl nke Constantinople n’afọ 381 O.A., site ná Nnukwu Akwụkwọ nke Damasus na 382 O.A., site n’Ụkpụrụ Okwukwe Athanasius nke bịara mgbe oge ụfọdụ gasịrị, sitekwa n’akwụkwọ ndị ọzọ, anyị pụrụ ịghọta nke ọma ihe Krisendọm bu n’uche banyere ozizi Atọ n’Ime Otu ahụ. Ọ gụnyere echiche ndị a guzopụtara ìhè:
1. E kwuru na e nwere ndị atọ bụ chi—Nna ahụ, Ọkpara ahụ, na mmụọ nsọ—n’ime Chiatọ ahụ.
2. E kwuru na nke ọ bụla n’ime ndị atọ a dị iche iche na-adịru ebighị ebi, ọ dịghị nke bu ibe ya ụzọ ma ọ bụ nke so ibe ya n’azụ.
3. A na-ekwu na nke ọ bụla pụrụ ime ihe nile, ọ dịghị nke ka ibe ya ukwuu ma ọ bụ dị ala karịa ibe ya.
4. E kwuru na nke ọ bụla nwere amamihe nile, na-ama ihe nile.
5. A na-ekwu na nke ọ bụla bụ ezi Chineke.
6. Otú ọ dị, a na-ekwu na e nweghị Chineke atọ, kama ọ bụ nanị otu Chineke.
O doro anya na ozizi Atọ n’Ime Otu bụ usoro echiche dị mgbagwoju anya nke gụnyere ma ọ dịghị ihe ọzọ echiche ndị dị mkpa, gụnyekwa ọbụna ihe ndị ọzọ, dị ka a na-ekpughe mgbe e nyochasịrị akụkụ ha dị iche iche nke ọma. Ma ọ bụrụ na anyị atụlee echiche ndị bụ isi ndị a dị n’elu, ọ na-apụta ìhè na ọ bụrụ na e wepụ nke ọ bụla, ihe fọdụrụnụ abụghịzikwa Atọ n’Ime Otu nke Krisendọm. Iji hụ ihe nile nke ọma, akụkụ ya ndị a nile aghaghị ịdị adị.
Site ná nghọta nke a ka mma nke okwu ahụ bụ “Atọ n’Ime Otu,” anyị pụrụ ịjụ ajụjụ ugbu a, sị: Ọ̀ bụ ozizi nke Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya? Ya bụrụ otú ahụ, ọ gaara adịworị n’ụzọ zuru ezu ma doo anya n’ime narị afọ mbụ nke Oge Anyị. Ebe ọ bụkwa na a na-achọta ihe ha kụziri n’ime Bible, mgbe ahụ ozizi Atọ n’Ime Otu ahụ bụ ozizi Bible ma ọ bụkwa na ọ bụghị. Ọ bụrụ na ọ bụ, e kwesịrị ịkụzi ya n’ụzọ doro anya n’ime Bible.
Ọ bụghị ihe ezi uche dị n’ime ya iche na Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya ga-akụziri ndị mmadụ banyere Chineke ma ghara ịgwa ha onye Chineke bụ, karịsịa ebe ọ bụ na ọ ga-achọ ụfọdụ ndị kwere ekwe n’aka ịtụfu ndụ ha n’ihi Chineke. N’ihi ya, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya gaara enyeworị ịkụzi ozizi nke a dị oké mkpa nlebara anya kasị dịrị mkpa.
Nyochaa Akwụkwọ Nsọ
N’Ọrụ Ndị Ozi isi 17, amamokwu 11, a kpọrọ ndị mmadụ ndị ‘dị mma n’obi’ n’ihi na ha “na-enyocha ihe nile e deworo n’akwụkwọ nsọ kwa ụbọchị, ma ihe ndị a [hà] dị otú a,” bụ́ ihe ndị Pọl onyeozi kụziri. A gbara ha ume iji Akwụkwọ nsọ mee ihe iji kwadoo ozizi ndị ahụ nke ọbụna onyeozi. I kwesịrị ime otu ihe ahụ.
Buru n’uche na ihe ndị e dere n’Akwụkwọ nsọ bụ “ihe si n’obi Chineke pụta,” na a ga-ejikwa ha mee ihe “iji mee ka uche mmadụ guzozie, na iji zụpụta nzụpụta nke dị n’ezi omume: ka onye nke Chineke wee zuo okè, onye e meworo ka o zuo okè ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla.” (2 Timoti 3:16, 17) Ya mere, Bible zuru okè n’okwu banyere ozizi. A sị na ozizi Atọ n’Ime Otu bụ eziokwu, o kwesịrị ịdị n’ime ya.
Anyị na-akpọ gị òkù inyocha Bible, karịsịa 27 akwụkwọ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, iji hụ n’onwe gị ma Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya hà kụziri ihe banyere Atọ n’Ime Otu. Ka ị na-eme nnyocha, jụọ onwe gị, sị:
1. M̀ pụrụ ịhụ akụkụ akwụkwọ nsọ ọ bụla nke kwuru banyere “Atọ n’Ime Otu”?
2. M̀ pụrụ ịhụ akụkụ akwụkwọ nsọ ọ bụla nke kwuru na ihe mejupụtara Chineke bụ ndị atọ dị iche iche, Nna, Ọkpara na mmụọ nsọ, ma na ha atọ bụ nanị otu Chineke?
3. M̀ pụrụ ịhụ akụkụ akwụkwọ nsọ ọ bụla nke kwuru na Nna ahụ, Ọkpara na mmụọ nsọ hà nhata n’ụzọ nile, dị ka n’ịdịru ebighị ebi, ike, ọnọdụ, na amamihe?
Otú ọ bụla i si chọgharịa ya, ị gaghị ahụ ọbụna otu akụkụ akwụkwọ nsọ nke jiri okwu ahụ bụ Atọ n’Ime Otu mee ihe, ị gaghị ahụkwa nke ọ bụla kwuru na Nna ahụ, Ọkpara, na mmụọ nsọ hà nhata n’ụzọ nile, dị ka n’ịdịru ebighị ebi, ike, ọnọdụ, na amamihe. Ọ dịghị ọbụna otu akụkụ akwụkwọ nsọ nke kwuru na Ọkpara ahụ na Nna ahụ hà nhata n’ụzọ ndị ahụ—a sịkwa na e nwere akụkụ akwụkwọ nsọ dị otú ahụ, ọ gaghị eguzobe Atọ n’Ime Otu, kama ya karịsịa, ọ bụ “abụọ n’ime otu.” Ọ dịghị ebe ọ bụla Bible gosiri na mmụọ nsọ ahụ na Nna ahụ hà nhata.
Ihe Ọtụtụ Ndị Ọkà Mmụta Na-ekwu
Ọtụtụ ndị ọkà mmụta, gụnyere ndị na-ezi ozizi Atọ n’Ime Otu, nakweere na e nweghị ozizi Atọ n’Ime Otu n’ezie n’ime Bible. Dị ka ihe atụ, Akwụkwọ bụ The Encyclopedia of Religion na-asị:
“Ndị nkọwa akwụkwọ nsọ na ndị ọkà mmụta okpukpe nke oge a ekwekọwo na Bible Hibru enweghị ozizi nke Atọ n’Ime Otu . . . Ọ bụ ezie na Bible Hibru ahụ na-egosipụta Chineke dị ka nna nke Israel, na-ejikwa okwu dị iche iche eme ihe maka Chineke dị ka Okwu (davar), Mmụọ (ruah), Amamihe (hokhmah), na Ọnụnọ (shekhinah), ọ ga-agabiga ebumnuche na mmụọ nke Agba Ochie ahụ ijikọ echiche nke a na ozizi atọ n’ime otu nke e mesịrị nwee n’ikpeazụ.
“N’ịga n’ihu, ndị nkọwa akwụkwọ nsọ na ndị ọkà mmụta okpukpe kwekọrọ na Agba Ọhụrụ ahụ enweghị ozizi ọ bụla pụtara ìhè nke Atọ n’Ime Otu. Chineke Nna bụ isi iyi nke ihe nile dị adị (Pantokrator) bụrụkwa nna nke Jisọs Kraịst; ‘Nna’ abụghị ùtú aha nke onye nke mbụ n’ime Atọ n’Ime Otu ahụ kama ọ bụ aha ọzọ dịịrị Chineke. . . .
“N’ime Agba Ọhụrụ ọ dịghị ihe ọ bụla na-egositụ ma ọlị echiche nke ụdị nke Chineke n’usoro nkà ihe ọmụma dị elu (‘atọ n’ime otu nke dị nanị n’uche’), Agba Ọhụrụ enweghịkwa ụdị okwu e ji akọwa ya n’ozizi nke e nwere mgbe oge ụfọdụ gasịrị (hupostasis, ousia, substantia, subsistentia, prosōpon, persona). . . . Ọ bụ ihe a na-adịghị arụ ụka na a pụghị iji ihe àmà nke akwụkwọ nsọ nanị guzobe ozizi ahụ.”9
N’ihe banyere eziokwu dị n’akụkọ ihe mere eme banyere okwu a, akwụkwọ bụ The New Encyclopædia Britannica na-asị:
“Ma okwu ahụ bụ Atọ n’Ime Otu ma ozizi ahụ kpọmkwem adịghị nke ọ bụla pụtara n’Agba Ọhụrụ . . .
“Ozizi ahụ malitere nke nta nke nta eri ọtụtụ narị afọ gara aga sitekwa n’ọtụtụ esemokwu. . . .
“Ọ gwụlakwa na narị afọ nke anọ ka e jikọtara ịdị iche nke ndị atọ ahụ na ịdị n’otu ha bịa n’otu ozizi a ma ama nke ịbụ otu ma bụrụkwa ndị atọ.”10
Akwụkwọ New Catholic Encyclopedia kwuru okwu yiri nke ahụ banyere mmalite nke Atọ n’Ime Otu:
“Ndị nkọwa akwụkwọ nsọ na ndị ọkà mmụta okpukpe nke Bible, gụnyere ọnụ ọgụgụ nọgidere na-aba ụba nke ndị Roman Katọlik, matara na mmadụ ekwesịghị ikwu okwu banyere Ozizi Atọ n’Ime Otu n’Agba Ọhụrụ n’akọwaghị ihe ọ pụtara nke ọma. E nwekwara nghọta yiri nnọọ nke ahụ n’ebe ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme banyere ozizi ndị a chọrọ ka e kwere n’ajụghị ase na ndị ọkà mmụta okpukpe n’ihe banyere usoro na mgbe mmadụ kwuru okwu banyere Ozizi Atọ n’Ime Otu nke a na-akọwaghị ihe ọ pụtara nke ọma, onye ahụ ahapụwo oge mmalite nke ndị Kraịst wee gaa, n’ihe dị ka nkera anọ nke ikpeazụ nke narị afọ nke anọ. Ọ bụ nanị mgbe ahụ ka a malitere ịnabata ihe a pụrụ ịkpọ ozizi Atọ n’Ime Otu nke a kọwara nke ọma bụ́ ‘ndị atọ n’otu Chineke’ ná ndụ na echiche ndị Kristian. . . .
“Usoro ahụ adịghị egosipụta ihe a maara kpọmkwem n’oge mmalite; ọ bụ ihe sitere na narị afọ atọ nke mwulite ozizi.”11
A Kụziri “Ihe Yiri Ya”?
Ndị ozizi Atọ n’Ime Otu pụrụ ikwu na Bible na-ezi “ihe yiri” Atọ n’Ime Otu. Ma e mere nzọrọ nke a ogologo oge mgbe e desịworo Bible. Ọ bụ mgbalị e mere isi na Bible kpachata nkọwa nke ndị ndú okpukpe nke oge ikpeazụ kpebiri n’onwe ha na ọ ga-abụ ozizi.
Jụọ onwe gị, sị: N’ihi gịnị ka Bible ga-eji zie nanị “ihe yiri” ozizi ya nke kasị dịrị mkpa—onye Chineke bụ? Bible kwuru ihe doro anya n’ozizi ndị ọzọ bụ isi; n’ihi gịnị ka ọ na-emeghị otú ahụ na nke a, bụ́ nke kasị dịrị mkpa? Ọ̀ bụ na Onye Kere eluigwe na ala dum agaghị eme ka e dee akwụkwọ nke kwuru ihe doro anya banyere ọbụbụ ọ bụ Atọ n’Ime Otu ma ọ bụrụ na ọ dị otú ahụ?
Ihe mere na Bible adịghị akụzi atọ n’ime otu dị mfe: Ọ bụghị ozizi Bible. A sị na Chineke bụ Atọ n’Ime Otu, ọ bụ ihe e ji n’aka na ọ gaara eme ka o doo anya ka Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya wee nwee ike ịkụziri ya ndị ọzọ. A gaara edenyekwa ihe ọmụma ahụ dị mkpa n’ime Okwu Chineke nke sitere n’ike mmụọ nsọ. A garaghị ahapụrụ ya ụmụ mmadụ na-ezughị okè ịdọgburịta onwe ha banyere ya mgbe ọtụtụ narị afọ gasịrị.
Mgbe anyị nyochara ihe odide ndị na-akụzi Atọ n’Ime Otu na-enye dị ka ihe àmà nke bụ na Bible na-ezi “ihe yiri” Atọ n’Ime Otu, gịnị ka anyị na-ahụ? Ntụle e ji obi eziokwu mee na-egosipụta na akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ahụ e wepụtara adịghị ekwu banyere Atọ n’Ime Otu nke Krisendọm. Kama nke ahụ, ndị ọkà mmụta okpukpe na-agbalị ịfabanye n’ime akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ahụ echiche ha buwororịị ụzọ nwee banyere Atọ n’Ime Otu. Ma echiche ndị ahụ adịghị n’ime ihe odide akwụkwọ nsọ ndị ahụ. N’eziokwu, echiche ndị ahụ metụtara Atọ n’Ime Otu megidere àmà doro anya Bible dum na-agba.
A na-achọta otu ihe atụ nke ụdị ihe odide ndị ahụ na Matiu 28:19, 20. N’ebe ahụ e hotakọrọ Nna, Ọkpara na mmụọ nsọ. Ụfọdụ ndị na-ekwu na nke a na-ekwu “ihe yiri” Atọ n’Ime Otu. Ma gụọ amaokwu ndị ahụ n’onwe gị. Ọ̀ dị ihe ọ bụla dị n’ihe odide ahụ nke na-ekwu na ndị atọ ahụ bụ otu Chineke ndị hà nhata n’ịdị ebighị ebi, ike, ọnọdụ, na amamihe? Ee e, ọ dịghị. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ihe banyere ihe odide ndị ọzọ ndị hotakọrọ ndị atọ ahụ.
N’ihe banyere ndị na-ahụ ihe yiri Atọ n’Ime Otu na Matiu 28:19, 20 n’ojiji e jiri “aha” mee ihe n’ụdị na-egosi otu onye banyere Nna, Ọkpara, na mmụọ nsọ, biko jiri ya tụnyere ojiji e jiri “aha” mee ihe n’ụdị na-egosi otu onye banyere Abraham na Aịsak na Jenesis 48:16.—King James Version; New World Translation of the Holy Scriptures.
Ndị ozizi Atọ n’Ime Otu na-ezokwa aka na Jọn 1:1 ná nsụgharị ụfọdụ, ebe e kwuru okwu banyere “Okwu ahụ” dị ka onye ya “na Chineke” dị, bụrụkwa “Chineke.” Ma nsụgharị Bible ndị ọzọ na-ekwu na Okwu ahụ bụ “onye bụ chi” ma ọ bụ “onye yiri Chineke,” nke na-apụtakebeghị Chineke, kama onye dị ike. Ọzọkwa, amaokwu Bible ahụ na-ekwu na “Okwu ahụ” “na” Chineke dịrị. N’ụzọ ezi uche dị na ya, nke ahụ gosiri na ọ bụghị otu Chineke ahụ. N’agbanyeghịkwa ihe e kwubiri banyere “Okwu ahụ,” nke bụ eziokwu bụ na ọ bụ nanị ndị abụọ ka e hotara na Jọn 1:1, ọ bụghị ndị atọ. Ugboro ugboro, ihe odide nile e ji eme ihe na-akụ nnọọ afọ n’ala ná mgbalị a na-eme iji ha kwadoo ozizi Atọ n’Ime Otu ma ọ bụrụ na e jiri obi eziokwu nyochaa ha.a
Isi ihe ọzọ a ga-atụle bụ nke a: A sị na Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya kụziri ozizi Atọ n’Ime Otu, o doro anya na ndị chọọchị na-edu ndu, bụ́ ndị bịara ozugbo oge ha gasịrị gaara akụzikwa ya. Ma ndị ahụ, ndị a na-akpọ n’oge a Ndị Nna Chọọchị, hà kụziri ozizi Atọ n’Ime Otu? A ga-atụle ajụjụ nke a n’Akụkụ nke 2 n’usoro isiokwu a ná mbipụta na-abịa n’ihu nke Ụlọ Nche.
Ntụaka
1. The Catholic Encyclopedia, 1912, Mpịakọta nke 15, peji 47.
2. The Baptist Encyclopædia, nke William Cathcart lekọtara mbipụta ya, 1883, peji 1168, 1169.
3. A Short History of Christian Doctrine, nke Bernhard Lohse dere, Mbipụta 1980, peji 53.
4. N’otu akwụkwọ ahụ dị na nke 3, peji 64, 65.
5. The Church Teaches, nke John F. Clarkson, S.J., John H. Edwards, S.J., William J. Kelly, S.J., na John J. Welch, S.J., sụgharịrị, lekọtakwa mbipụta ya, 1955, peji 125-127.
6. N’otu akwụkwọ ahụ dị na nke 5, peji 125.
7. The Triune God, nke Edmund J. Fortman dere, Mbipụta 1982, peji 126.
8. On the Incarnation, nke Penelope Lawson sụgharịrị, Mbipụta 1981, peji 27, 28.
9. The Encyclopedia of Religion, Mircea Eliade, onye editọ ukwu, 1987, Mpịakọta nke 15, peji 54.
10. The New Encyclopædia Britannica, Mbipụta nke 15, 1985, Mpịakọta nke 11, Micropædia, peji 928.
11. New Catholic Encyclopedia, 1967, Mpịakọta nke 14, peji 295.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Maka ntụle zuru ezu karị nke ihe odide akwụkwọ nsọ ndị dị otú ahụ, lee akwụkwọ nta ahụ bụ Should You Believe in the Trinity?, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
[Foto dị na peeji nke 19]
Church at Tagnon, France