Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Olee Otú Ihe Ndị Kraịst Na-akụzi Si Abara Obodo Uru?
    Ụlọ Nche—2012 | Mee 1
    • E nwere ihe jikọrọ iwu ahụ Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya, ya bụ ka ha gaa mee ka ndị mmadụ bụrụ ‘ndị na-eso ụzọ ya,’ na ime ihe o buru ụzọ gwa ha, nke bụ́ na ha ga-abụ nnu na ìhè nke ụwa. (Matiu 5:13, 14) Gịnị jikọrọ ha? Oleekwa uru ikwusa ozi ọma ga-abara ndị mmadụ?

  • Olee Otú Ihe Ndị Kraịst Na-akụzi Si Abara Obodo Uru?
    Ụlọ Nche—2012 | Mee 1
    • Gịnịkwanụ banyere ihe ahụ Jizọs kwuru nke bụ́ na ndị na-eso ụzọ ya bụ ìhè nke ụwa? Otú ahụ ìhè anyanwụ si eme ka ọnwa na-eti n’abalị, ndị na-eso ụzọ Kraịst na-emekwa ka “ìhè” si n’aka Jehova Chineke na-enwu. Otú ha si eme ya bụ ikwusara ndị mmadụ ozi ọma na ịrụ ezi ọrụ.—1 Pita 2:12.

      Jizọs mekwara ka anyị ghọta otú mmadụ ịbụ ìhè na mmadụ ịbụ onye na-eso ụzọ ya si yie. O kwuru, sị: “Ndị mmadụ na-amụnye oriọna ma dọba ya, ọ bụghị n’okpuru nkata, kama n’elu ihe ndọba oriọna, ọ na-enwukwara ndị niile nọ n’ime ụlọ. Otú ahụ, meenụ ka ìhè unu na-enwu n’ebe ndị mmadụ nọ.” Ọ bụrụ na a mụnyere oriọna ma dọba ya n’elu ihe ndọba oriọna, mmadụ niile ga-ahụ ya nke ọma. Otú ahụ ka ndị mmadụ kwesịrị isi ahụ ozi ọma ezigbo Ndị Kraịst na-ekwusa na ọrụ ọma ha na-arụ. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Jizọs sịrị na ndị hụrụ ọrụ ọma ahụ ga-enye Chineke otuto, ọ bụghị Ndị Kraịst.—Matiu 5:14-16.

      Ọrụ Ndị Kraịst Niile Ga-arụ

      Mgbe Jizọs sịrị, “Unu bụ ìhè nke ụwa” na “meenụ ka ìhè unu na-enwu,” ọ bụ ndị na-eso ụzọ ya niile ka ọ na-agwa okwu ndị ahụ. Ọ bụghị mmadụ ole na ole nọ n’okpukpe dị iche iche ga-arụ ọrụ ahụ Jizọs nyere iwu ka a rụọ. Kama, ọ bụ Ndị Kraịst niile bụ “ìhè” ahụ. Nde Ndịàmà Jehova asaa, bụ́ ndị bi n’ihe karịrị narị ala abụọ na iri atọ na ise, ghọtara na ọ bụ ọrụ ha ikwusara ndị agbata obi ha ozi ọma ahụ Kraịst chọrọ ka ndị na-eso ụzọ ya kwusaa.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya