Echiche nke Bible
Ezi Ndị Kraịst Hà Pụrụ Ịtụ Anya Nchebe Chineke?
IJI bugara ndị ofufe ibe ha ihe enyemaka, ndị Kraịst, mgbe ha kpesịrị ekpere, ji ụgbọ ala mee njem n’ìgwè gafee n’otu ebe agha tisasịrị, ebe a pụrụ igbu ha ma eleghị anya. Ha gafere n’udo, bụ́ nke tụrụ ìgwè ndị agha ahụ na-alụ agha n’anya. Mmụọ ozi Chineke ò chebere ha?
E gburu otu di na nwunye jeworo ozi dị ka ndị ozi ruo ọtụtụ afọ mgbe otu ụgbọ elu daruru ala n’ike n’ebe ha na-eme nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Gịnị mere na mmụọ ozi Chineke eduzighị ha ma ọ bụ ụgbọ elu ahụ gaa n’ebe ọzọ n’oge ahụ kpọmkwem?—Tụlee Ọrụ 8:26.
N’ịtụle ihe omume ndị a, anyị pụrụ ịjụ, sị: N’ihi gịnị ka ụfọdụ ndị Kraịst ji anwụ mgbe ha na-eme uche Chineke, ebe ndị ọzọ, ndị nọ n’ọnọdụ ihe ize ndụ ọtụtụ mgbe, na-adị ndụ? Ndị Kraịst hà pụrụ ịtụ anya nchebe Chineke, karịsịa na “mgbe ikpeazụ” ndị a dị oké egwu?—2 Timoti 3:1.
Nzube nke Nchebe Chineke
Jehova Chineke ekwewo nkwa ịgọzi na ichebe ndị ya. (Ọpụpụ 19:3-6; Aịsaịa 54:17) O mere otú ahụ n’ụzọ pụtara ìhè na narị afọ mbụ, mgbe ọgbakọ ndị Kraịst ka dị na nwa ọhụrụ ya. E nwere ụdị ọrụ ebube dị iche iche. Jisọs mụbara ihe oriri iji zụọ ọtụtụ puku mmadụ; ya na ụmụazụ ya gwọrọ ụdị ọrịa na nrịanrịa dị iche iche, chụpụ ndị mmụọ karịrị mmadụ ike n’ahụ ndị mmụọ ọjọọ ji, ọbụna kpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ. N’okpuru nduzi Chineke ọgbakọ ọhụrụ ahụ toro ma bụrụ nke e mere ka o guzosie ike. Ma, n’agbanyeghị nkwado nile doro anya Chineke nyere, ọtụtụ ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi nwụrụ ihe a pụrụ ịkpọ ọnwụ nnwụchu.—Tụlee Abụ Ọma 90:10.
Tụlee ihe banyere Jemes na Jọn, ụmụ Zebedi. Ịbụ ndị a họọrọ dị ka ndị ozi, ha, tinyere Pita, so n’ime ndị enyi chikarịsịrị anya nke Kraịst.a Ma e gburu Jemes n’ihi okwukwe ya n’afọ 44 O.A., ebe nwanne ya nwoke bụ́ Jọn dịrị ndụ ruo ná ngwụsị nke narị afọ mbụ. O doro anya na ha abụọ na-eme uche Chineke. N’ihi gịnị ka e jiri kwere ka Jemes nwụọ, ebe Jọn dịịrị ndụ?
Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile nwere nnọọ ike ịzọpụta ndụ Jemes. N’ezie, n’oge na-adịghị anya mgbe e gbusịrị Jemes n’ihi okwukwe ya, mmụọ ozi Jehova napụtara Pita n’aka ọnwụ. N’ihi gịnị ka mmụọ ozi ahụ ji ghara ịnapụta Jemes?—Ọrụ 12:1-11.
E Ji Ya Mee Ihe ná Mmezu nke Nzube Chineke
Iji ghọta ihe mere e ji enye nchebe Chineke, anyị aghaghị ịghọta na a na-enye ya ọ bụghị nanị iji mee ka ndị mmadụ n’otu n’otu dịrị ndụ ka ogologo kama iji chebe ihe dị oké mkpa karị, mmezu nke nzube Chineke. Dị ka ihe atụ, nlanarị nke ọgbakọ ndị Kraịst n’ozuzu ya bụ ihe e ji n’aka n’ihi na e jikọtara ya n’ụzọ chiri anya ná mmezu nke nzube ahụ. Otú ọ dị, Kraịst gwara ndị na-eso ụzọ ya n’ezoghị ọnụ na ha dị ka mmadụ n’otu n’otu pụrụ iche ọnwụ ihu n’ihi okwukwe ha. Mgbe o kwusịrị nke a, Jisọs kwusiri okwu ike banyere, ọ bụghị mgbapụta n’ụzọ ọrụ ebube, kama ‘ntachi obi ruo ọgwụgwụ.’ (Matiu 24:9, 13) Eziokwu bụ na e chebere ụfọdụ ndị, ma ghara ichebe ndị ọzọ adịghị egosi na Chineke na-ele mmadụ anya n’ihu. Ọ bụ nanị na Chineke ji onye nọ n’ọnọdụ kasị mma rụọ ọrụ iji mezuo nzube ya, bụ́ nke ga-emesịa bara ihe nile a kpọrọ mmadụ uru.
Ebe ọ bụ na ọnwụ nnwụchu n’ozi Chineke bụ n’ezie ihe kwere omume, ndị Kraịst kwesịrị inwe otu àgwà ziri ezi ahụ ndị Hibru atọ ahụ kwesịrị ntụkwasị obi nwere bụ́ ndị a mara ikpe ọnwụ maka ife Chineke ofufe. Ha gwara eze Babilọn, sị: “A sị na ọ dị ụzọ ọ bụla Chineke ahụ Onye anyị onwe anyị na-efe pụrụ ịnapụta anyị, ọ bụ n’oké ọkụ nke na-enwu ajọ onwunwu na n’aka gị, eze, ka Ọ ga-anapụta anyị. Ma a sị na Ọ pụghị ịnapụta anyị, ka ị mara, eze, na chi gị nile ka anyị na-agaghị adị na-efe, ọ bụkwa onyinyo ọlaedo ahụ nke i guzobeworo ọtọ ka anyị na-agaghị akpọ isiala nye.”—Daniel 3:17, 18.
Jehova chebere ndụ Pita na Jọn n’ihi òkè gbara ọkpụrụkpụ ha na-ekere ná mmezu nke nzube ya. E ji Pita mee ka ọgbakọ ahụ “guzosie ike” site n’ịrụ ọrụ ọzụzụ atụrụ, bụ́ nke gụnyere ide akwụkwọ abụọ nke Bible ndị e dere site n’ike mmụọ nsọ. (Luk 22:32) Jọn dere akwụkwọ ise nke Bible, bụrụkwa ‘idé’ n’ọgbakọ mbụ ahụ.—Ndị Galetia 2:9; Jọn 21:15-23.
O kweghị omume ibu ụzọ kwuo otú Jehova si ekpebi kpọmkwem mgbe na ụzọ ọ ga-esi tinye aka ná ndụ ndị ohu ya. Nanị ihe a pụrụ ikwu n’enweghị obi abụọ bụ na Kraịst kwere nkwa ịnọnyere ụmụazụ ya “ụbọchị nile, ruo ọgwụgwụ oge a.” (Matiu 28:20) Kpọmkwem, ọ ‘ga-anọnyere anyị’ site ná nduzi ndị mmụọ ozi na-eduzi ọrụ nkwusa ahụ. (Matiu 13:36-43; Mkpughe 14:6) E wezụga ihe àmà ndị a a na-akparaghị òkè, anyị apụghị ibu ụzọ mata kpọmkwem otú a ga-esi gosipụta enyemaka Chineke ma ọ bụ onye pụrụ inweta nchebe Chineke. Gịnị ma ọ bụrụ na onye Kraịst echee na ya enwewo nchebe na nduzi Chineke? Ebe ọ bụ na a pụghị ịnwapụta ma ọ bụ ịgbagha nke a n’ụzọ zuru ezu, ọ dịghị onye kwesịrị ikpe nzọrọ ndị sitere n’ezi obi nke onye dị otú ahụ ikpe.
Chineke Ọ̀ Dị Obi Ọjọọ?
Eziokwu ahụ bụ na Chineke na-ekwe ka ndị Kraịst nwụọ ọ̀ na-egosi na ọ dịtụ obi ọjọọ? Ọ dịghị ma ọlị. (Eklisiastis 9:11) Jehova na-arụ ọrụ iji chebe ndụ anyị, ọ bụghị nanị ruo afọ ma ọ bụ iri afọ ole na ole kama ruo mgbe agwụghị agwụ. Site n’ebe ka elu ọ nọ, ọ na-eji nkà arụ ọrụ dị iche iche maka ọdịmma ebighị ebi nke ndị mmadụ n’otu n’otu bụ́ ndị hụrụ ya n’anya ma ọ bụ ndị na-abịaru ya nso. (Tụlee Matiu 18:14.) Mmezu nke nzube ya ga-apụta mwepụ zuru ezu nke ihe ọ bụla anyị taworo ahụhụ ya n’usoro ihe nke a—ọbụna ọnwụ. Ụzọ Chineke si eme ihe dị mgbagwoju anya ma zuo okè nke na a kpaliri Pọl onyeozi iti mkpu, sị: “Aa! omimi nke akụ̀ nke amamihe na nke ihe ọmụma kwa nke Chineke! lee otú a na-enweghị ike ịchọpụta ikpe Ya nile, otú a na-enweghịkwa ike ịtụpụta ụzọ Ya nile!”—Ndị Rom 11:33.
Ebe ọ bụ na ọ dịghị ihe pụrụ ikewapụ anyị n’ịhụnanya Chineke, ajụjụ onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ịjụ abụghị ‘M̀ ga-enwe nchebe Chineke?’ kama ‘M̀ nwere ngọzi Jehova?’ Ọ bụrụ na anyị nwere ya, Ọ ga-enye anyị ndụ ebighị ebi—n’agbanyeghị ihe mere anyị n’usoro ihe nke a. E jiri ya tụnyere agwụghị agwụ nke ndụ zuru okè, ahụhụ ọ bụla—ọbụna ọnwụ—n’usoro ihe nke a ga-eyi ihe ‘nwa oge, dịkwa mfe.’—2 Ndị Kọrint 4:17.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Pita, Jemes, na Jọn hụrụ nnwogha nke Jisọs (Mak 9:2) na mbilite n’ọnwụ nke nwa nwanyị nta Jaịrọs (Mak 5:22-24, 35-42); ha nọ nso n’Ogige Getsemane n’oge ule Jisọs n’onwe ya (Mak 14:32-42); ha kwa, tinyere Andru, jụrụ Jisọs ajụjụ banyere mbibi Jerusalem, ọnụnọ ya n’ọdịnihu, na ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a.—Matiu 24:3; Mak 13:1-3.