-
“Amamihe nke Sitere n’Elu” Ọ̀ Na-arụ Ọrụ ná Ndụ Gị?Bịaruo Jehova Nso
-
-
11 Gịnị ka i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ị chọpụta na i mejọwo onye gị na ya na-efekọ ofufe? Jizọs sịrị: “Ya mere, ọ bụrụ na ị na-ewega onyinye gị n’ebe ịchụàjà, i wee cheta n’ebe ahụ na o nwere ihe nwanne gị nwere megide gị, hapụ onyinye gị n’ebe ahụ n’ihu ebe ịchụàjà, pụọkwa; buru ụzọ mee ka gị na nwanne gị dị n’udo, mgbe ahụkwa, mgbe ị bịaghachiworo, nye onyinye gị.” (Matiu 5:23, 24) Ị pụrụ itinye ndụmọdụ ahụ n’ọrụ site n’ibu ụzọ jekwuru nwanna gị. Na-eburu gịnị n’obi? ‘Ime ka gị na ya dị n’udo.’b Iji mezuo nke ahụ, ọ pụrụ ịdị mkpa ka i kweta na i mejọrọ ya, ọ bụghị ikwu na i mejọghị ya. Ọ bụrụ na i jekwuru ya n’ebumnobi nke ime ka gị na ya dịghachi n’udo ma nọgide na-enwe echiche ahụ, o yiri ka a pụrụ idozi nghọtahie ọ bụla, rịọ mgbaghara dị ka o kwesịrị, ma gosi mgbaghara. Mgbe i mere ihe nile ị pụrụ ime iji mee udo, ị na-egosi na amamihe Chineke na-eduzi gị.
-
-
“Amamihe nke Sitere n’Elu” Ọ̀ Na-arụ Ọrụ ná Ndụ Gị?Bịaruo Jehova Nso
-
-
b Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ ‘mee ka gị na ya dị n’udo’ sitere na ngwaa pụtara “‘ịgbanwe ihe, inyerịta ihe,’ n’ihi ya kwa, ‘ikpezi.’” Ya mere ebumnobi gị bụ ịgbanwe, iwepụ iwe n’obi onye ahụ e mejọrọ, ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee.—Ndị Rom 12:18.
-