Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ezi Omume Abụghị Site n’Omenala A Kụziri n’Okwu Ọnụ
    Ụlọ Nche—1990 | Ọktoba 1
    • 12. (a) Mgbanwe dị aṅaa n’ụzọ ọ na-esikarị ezo aka n’Akwụkwọ Nsọ Hibru ka Jisọs mere n’Ozizi Elu Ugwu ya, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị? (b) Gịnị ka anyị na-amụta site n’ojiji nke isii e jiri okwu ahụ bụ “E kwuru, sị” mee ihe?

      12 N’oge ndị mbụ Jisọs hotara okwu site n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, ọ sịrị: “E dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị.” (Matiu 4:4, 7, 10) Ma ugbo isii n’Ozizi Elu Ugwu ahụ, o wepụtara okwu ndị yiri ka hà sitere n’Akwụkwọ Nsọ Hibru site n’ikwu, sị: “E kwuru, sị.” (Matiu 5:21, 27, 31, 33, 38, 43) N’ihi gịnị? N’ihi na ọ na-ezo aka n’Akwụkwọ nsọ dị ka e si kọwaa ya n’ịdabere n’omenala ndị Farisii ndị megidere ihe ndị Chineke nyere n’iwu. (Deuterọnọmi 4:2; Matiu 15:3) E mere ka nke a pụta ìhè n’izo aka nke isii, bụkwa nke ikpeazụ Jisọs mere n’usoro nke a: “Unu nụrụ na e kwuru, sị, Hụ mmadụ ibe gị n’anya, kpọọkwa onyeiro gị asị.” Ma, ọ dịghị iwu Mosis nke sịrị, “Kpọọ onyeiro gị asị.” Ọ bụ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii kwuru otú ahụ. Nke ahụ bụ nkọwa ha nke Iwu ahụ nke ịhụ onye agbata obi gị n’anya—onye agbata obi gị bụ onye Juu, ọ bụghị ndị ọzọ.

  • Ezi Omume Abụghị Site n’Omenala A Kụziri n’Okwu Ọnụ
    Ụlọ Nche—1990 | Ọktoba 1
    • 14. Olee ụzọ Jisọs si nye anyị ndumọdụ ka anyị ghara ọbụna ịmalite ịgbaso ụzọ ahụ nke na-eduje n’ịkwa iko?

      14 Ihe ọzọ Jisọs kwuru bụ: “Unu nụrụ na e kwuru, sị, Akwala iko: ma mụ onwe m sị unu, na nwoke ọ bụla nke na-ele nwanyị anya ka agụụ ya wee gụọ ya, ọ kwasịwo ya iko n’obi ya ugbu a.” (Matiu 5:27, 28) Ọ̀ bụ na ị gaghị akwa iko? Ya bụrụ otu ahụ, amalitela ịgbaso ụzọ ahụ site n’ime ka echiche banyere ya dịgide n’obi gị. Chee obi gị nche, bụ ebe ihe ndị dị otú ahụ na-amalite. (Ilu 4:23; Matiu 15:18, 19) Jemes 1:14,15 na-adọ aka ná ntị, sị: “A na-anwa onye ọ bụla mgbe agụụ ihe ọjọọ nke aka ya na-adọkpụfu ya, e wee rafuo ya. Mgbe ahụ agụụ ihe ọjọọ ahụ, mgbe ọ tụrụworo ime, o wee mụpụta mmehie: mmehie ahụ, mgbe o tozuru okè, o wee mụpụta ọnwụ.” Mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ na-asị: ‘Amalitela ihe ị na-apụghị imecha.’ Ma n’ọnọdụ nke a, anyị kwesịrị ịsị: ‘Amalitela ihe ị na-apụghị ịkwụsị.’ Ụfọdụ ndị kwesịworo ntụkwasị obi ọbụna mgbe e yiri ha egwu mgbagbu ihu ọha emesịwo daba n’ọnyà aghụghọ nke omume mmekọahụ rụrụ arụ.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya