Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Jerusalem—“Obodo nke Eze Ukwu Ahụ”
    Ụlọ Nche—1998 | Ọktoba 15
    • Jerusalem—“Obodo nke Eze Ukwu Ahụ”

      “Aṅụla iyi . . . n’ebe Jerusalem dị, n’ihi na ọ bụ obodo nke Eze ukwu ahụ.”—MATIU 5:34, 35.

  • Jerusalem—“Obodo nke Eze Ukwu Ahụ”
    Ụlọ Nche—1998 | Ọktoba 15
    • Ebe ‘Ocheeze Jehova’ Dị

      4, 5. Olee otú aka Devid si dị n’inyere Jerusalem aka ikere òkè dị mkpa ná mmezu nke nzube Chineke?

      4 Na narị afọ nke 11 T.O.A., Jerusalem ghọrọ ebe na-ewu ewu n’ụwa dị ka isi obodo nke mba nọ ná ntụkwasị obi, nke nọkwa n’udo. Jehova Chineke mere ka e tee nwa okorobịa bụ́ Devid mmanụ dị ka eze nke mba oge ochie ahụ—bụ́ Israel. N’inwe isi ọchịchị na Jerusalem, Devid na ụmụ ya ndị bụụrụ eze bịara nọkwasị “n’ocheeze nke alaeze Jehova,” ma ọ bụ “n’ocheeze Jehova.”—1 Ihe E Mere 28:5; 29:23.

      5 Nwoke ahụ na-atụ egwu Chineke bụ́ Devid—onye Israel sitere n’ebo Juda—napụtara Jerusalem site n’aka ndị Jebus na-ekpere arụsị. N’oge ahụ, obodo ahụ nọchiri nanị otu ugwu a na-akpọ Zaịọn, ma aha ahụ na Jerusalem n’onwe ya ghọrọ otu ihe. Ka oge na-aga, Devid mere ka e bubata igbe ọgbụgba ndụ Chineke na Israel n’ime Jerusalem, bụ́ ebe e debere ya n’ụlọikwuu. Ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ Chineke agwawo onye amụma ya bụ́ Mosis okwu site n’igwe ojii n’elu Igbe ahụ dị nsọ. (Ọpụpụ 25:1, 21, 22; Levitikọs 16:2; 1 Ihe E Mere 15:1-3) Igbe ahụ nọchitere anya ọnụnọ Chineke, n’ihi na Jehova n’ezie bụ Eze Israel. Ya mere, n’echiche gbara mkpị, a pụrụ ikwu na Jehova Chineke sitere n’obodo Jerusalem chịa.

      6. Olee nkwa Jehova kwere banyere Devid na Jerusalem?

      6 Jehova kwere Devid nkwa na alaeze nke ụlọ ya bụ́ ndị eze, nke Zaịọn, ma ọ bụ Jerusalem nọchitere anya ya, agaghị agwụ agwụ. Nke a pụtara na nwa Devid ga-abụ onye o ruuru ịchị isi ruo mgbe ebighị ebi dị ka Onye Chineke E Tere Mmanụ—bụ́ Mesaịa, ma ọ bụ Kraịst.a (Abụ Ọma 132:11-14; Luk 1:31-33) Bible na-ekpughekwa na onye nketa a na-adịgide adịgide nke ‘ocheeze Jehova’ ga-achị mba nile, ọ bụghị nanị Jerusalem.—Abụ Ọma 2:6-8; Daniel 7:13, 14.

      7. Olee otú Eze Devid si kwalite ofufe dị ọcha?

      7 Mgbalị ndị e mere iji kwatuo onye Chineke e tere mmanụ, bụ́ Eze Devid n’ọchịchị, kụrụ afọ n’ala. Kama nke ahụ, e meriri mba ndị iro, a gbasapụkwara ókèala nile nke Ala Nkwa ahụ ruo na nsọtụ ha Chineke tụziri. Devid ji ọnọdụ a mee ihe iji kwalite ofufe dị ọcha. Ọtụtụ n’ime abụ ọma Devid tokwara Jehova dị ka onye bụ́ Eze n’ezie na Zaịọn.—2 Samuel 8:1-15; Abụ Ọma 9:1, 11; 24:1, 3, 7-10; 65:1, 2; 68:1, 24, 29; 110:1, 2; 122:1-4.

      8, 9. Olee otú ezi ofufe e nwere na Jerusalem si gbasaa n’okpuru ọchịchị nke Eze Solomọn?

      8 N’oge ọchịchị nke nwa Devid bụ́ Solomọn, ofufe Jehova ruru ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu. Solomọn gbasapụrụ Jerusalem gaa n’ebe ugwu ịgụnye ugwu Moraịa (ebe Dome of the Rock nke oge a dị). N’elu ugwu a, o nwere ihe ùgwù nke iwu ụlọ nsọ dị ebube iji nye Jehova otuto. E debere igbe ọgbụgba ndụ ahụ n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile nke ụlọ nsọ ahụ.—1 Ndị Eze 6:1-38.

      9 Mba Israel nwere udo ka ha ji obi ha nile kwadoo ofufe Jehova, nke hiwere isi na Jerusalem. N’ịkọwa ọnọdụ a n’ụzọ mara mma, Akwụkwọ Nsọ na-asị: “Juda na Israel dị ọtụtụ, dị ka ájá nke dị n’akụkụ oké osimiri n’ịba ụba, na-eri ihe, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, na-aṅụrịkwa ọṅụ. . . . [Solomọn] nwekwara udo site n’ofé ọzọ nile dị ya gburugburu. Juda na Israel wee biri ná ntụkwasị obi, nwoke ọ bụla n’okpuru osisi vine ya na n’okpuru osisi fig ya.”—1 Ndị Eze 4:20, 24, 25.

      10, 11. Olee otú nkà mmụta ihe ochie si kwadoo ihe Bible na-ekwu banyere Jerusalem mgbe Solomọn chịrị?

      10 Nchọpụta ihe mgbe ochie na-akwado ihe ndekọ a nke ọchịchị Solomọn nwere ọganihu. N’akwụkwọ ya bụ́ The Archaeology of the Land of Israel, Prọfesọ Yohanan Aharoni na-ekwu, sị: “Akụ̀ na ụba ndị sọbatara n’obí eze site n’akụkụ nile, na azụmahịa ndị na-aga nke ọma . . . wetara mgbanwe dị ngwa na nke dị ịrịba ama n’akụkụ nile nke ọnọdụ ihe onwunwe. . . . Mgbanwe n’ọnọdụ ihe onwunwe . . . bụ nke a pụrụ ịchọpụta, ọ bụghị nanị n’ihe okomoko kamakwa karịsịa n’ihe nkụwa dị iche iche. . . . Ọdịdị nke ihe a kpụrụ akpụ na nnụcha ya kawanyere mma n’ụzọ dị ukwuu.”

      11 N’otu aka ahụ, Jerry M. Landay dere, sị: “N’okpuru Solomọn, ọnọdụ ihe onwunwe Israel gakwuru n’ihu n’ime iri afọ atọ karịa ka ọ dị n’ime narị afọ abụọ ndị bu ụzọ. Anyị na-achọta n’ebe e nwere ihe ochie dịrị n’oge Solomọn ihe ndị fọdụrụ n’oké ihe owuwu, obodo ukwu ndị nwere nnukwu mgbidi, mgbasapụ nke ógbè ebe obibi bụ́ ndị nwere ụlọ obibi ndị e wuru nke ọma nke ndị aka ji akụ, ọganihu dị ukwuu na nkà nke ọkpụ ite na usoro mmepụta ihe ya. Anyị na-achọtakwa ihe ndị fọdụrụ n’ihe ndị e ji aka mee ndị na-anọchi anya ihe ndị e mepụtara n’ebe ndị dị anya, bụ́ ihe àmà nke azụmahịa siri ike nke mba na mba.”—The House of David.

      Site n’Udo Gaa n’Ịtọgbọrọ n’Efu

      12, 13. Olee otú o si bụrụ na a nọgideghị na-akwalite ezi ofufe na Jerusalem?

      12 Udo na ọganihu nke Jerusalem, bụ́ obodo nke ebe nsọ Jehova dị, bụ isiokwu kwesịrị ekwesị maka ekpere. Devid dere, sị: “Rịọnụ arịrịọ banyere udo Jerusalem: ndị na-ahụ gị n’anya ga-anọ n’udo. Ka udo dị n’ékpè gị nile, ka ịnọ n’udo dịkwa n’ụlọ gị nile dị elu. N’ihi ụmụnne m na ndị enyi m, biko, ka m kwuo okwu, sị, Ka udo dị n’ime gị.” (Abụ Ọma 122:6-8) Ọ bụ ezie na Solomọn nwere ihe ùgwù nke iwu ụlọ nsọ ahụ dị ebube n’obodo ahụ nọ n’udo, o mesịrị lụọ ọtụtụ nwunye ndị na-ekpere arụsị. N’oge agadi ya, ha rabanyere ya n’ịkwalite ofufe nke chi ụgha dị iche iche nke oge ahụ. Ndapụ n’ezi ofufe a nwere mmetụta na-emerụ emerụ n’ahụ mba ahụ dum, na-anapụ ya na ndị bi n’ime ya ezi udo.—1 Ndị Eze 11:1-8; 14:21-24.

      13 Ná mmalite ọchịchị nke nwa Solomọn bụ́ Rehoboam, ebo iri nupụrụ isi ma guzobe alaeze ebe ugwu nke Israel. N’ihi ikpere arụsị ha, Chineke kwere ka ndị Asiria kwatuo alaeze ahụ. (1 Ndị Eze 12:16-30) Alaeze ebo abụọ nke ndịda nke Juda nọgidere na-ehiwe isi na Jerusalem. Ma ka oge na-aga ha onwe ha gbakụtakwara ofufe dị ọcha azụ, ya mere Chineke kwere ka ndị Babilọn bibie obodo isi ike ahụ na 607 T.O.A. Ruo afọ 70 ndị Juu a dọtara n’agha hụsiri anya dị ka ndị e ji eji na Babilọn. Mgbe ahụ, site n’ebere Chineke, e kwere ka ha laghachi Jerusalem ma weghachi ezi ofufe.—2 Ihe E Mere 36:15-21.

      14, 15. Olee otú Jerusalem si nwetaghachi òkè bụ́ isi mgbe ndọrọ n’agha Babilọn gasịrị, ma olee mgbanwe e mere?

      14 Mgbe afọ 70 nke ịtọgbọrọ n’efu gasịrị, ahịhịa aghaghị itochiworị ụlọ ndị ahụ mebiri emebi. A kwaturu mgbidi Jerusalem, na-enwe oghere dị ukwuu ebe ọnụ ụzọ ámá na ụlọ elu ndị na-akwagide mgbidi ahụ guzobu. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị Juu ahụ na-alọghachinụ nwere obi ike. Ha wuru ebe ịchụàjà n’ebe ahụ ụlọ nsọ mbụ dịbu ma malite ịchụrụ Jehova àjà kwa ụbọchị.

      15 Nke a bụ mmalite dị mma, ma ọ dịghịkwa mgbe ọ bụla Jerusalem ahụ e weghachiri eweghachi ga-abụ isi obodo nke alaeze nke nwa Eze Devid ga-anọ n’ocheeze ya. Kama nke ahụ, onye ọchịchị nke ndị meriri Babilọn họpụtara chịrị ndị Juu, ha aghaghịkwa ịtụ ụtụ isi nye ndị nwe ha bụ́ ndị Peasia. (Nehemaịa 9:34-37) Ọ bụ ezie na ọ nọ n’ọnọdụ ịbụ ‘nzọda n’ala,’ Jerusalem ka bụkwa otu obodo n’ụwa nile nke Jehova Chineke nwere mmasị pụrụ iche n’ebe ọ dị. (Luk 21:24) Dị ka ebe bụ́ isi maka ofufe dị ọcha, ọ nọchitekwara anya ikike Chineke nwere igosipụta ọbụbụeze ya n’elu ụwa site n’aka nwa Eze Devid.

      Ndị Agbata Obi Na-ekpe Okpukpe Ụgha Megidere Ya

      16. N’ihi gịnị ka ndị Juu ahụ lọghachiri site na Babilọn ji kwụsị mwughachi ha na-ewughachi Jerusalem?

      16 N’oge na-adịghị anya, ndị Juu ahụ lọghachiworo Jerusalem site ná ndọrọ n’agha tọrọ ntọala ụlọ nsọ ọhụrụ. Ma ndị agbata obi na-ekpe okpukpe ụgha zigaara Eze Ataksakses nke Peasia akwụkwọ ozi nkatọ, na-azọrọ na ndị Juu ga-enupụ isi. N’aka nke ya, Ataksakses machibidoro iwu ihe ọzọ na Jerusalem. Cheedị echiche ma ọ bụrụ na i biri n’obodo ahụ laa azụ n’oge ahụ, ị gaara echeworị ihe ọdịnihu ga-abụrụ ya. Dị ka o mesịrị dapụta, ndị Juu kwụsịrị iwu ụlọ nsọ ma tinye isi n’ịchụ ihe onwunwe nke aka ha.—Ezra 4:11-24; Hagaị 1:2-6.

      17, 18. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Jehova si hụ na e wughachiri Jerusalem?

      17 Ihe dị ka afọ 17 mgbe ha lọtasịrị, Chineke welitere ndị amụma bụ́ Hagaị na Zekaraịa iji gbazie echiche nke ndị ya. N’ịbụ ndị a kwaliri ichegharị, ndị Juu malitere iwughachi ụlọ nsọ ahụ. Ka ọ dị mgbe ahụ, Daraịọs abụrụwo eze Peasia. Ọ kwadoro iwu Eze Saịrọs ka e wughachi ụlọ nsọ Jerusalem. Daraịọs zigaara ndị agbata obi ndị Juu akwụkwọ ozi, na-adọ ha aka ná ntị ka ‘ha nọrọ n’ebe dị anya site na Jerusalem’ ma na-enye nkwado ego site n’ụtụ eze ka e wee rụtọpụ ọrụ ihe owuwu ahụ.—Ezra 6:1-13.

      18 Ndị Juu wuchara ụlọ nsọ ahụ n’afọ nke 22 mgbe ha lọtasịrị. Ị pụrụ ịghọta na ihe a dị ịrịba ama ga-abụ ihe a ga-eji oké nṅụrị ọṅụ meere ememe. Ma, ruo n’ókè dị ukwuu, Jerusalem na mgbidi ya ka bụkwa mkpọmkpọ ebe. E lebaara obodo ahụ anya dị mkpa “n’ụbọchị Nehemaịa, bụ́ onye na-achị ala, na nke Ezra, bụ́ onye nchụàjà, bụ́ odeakwụkwọ.” (Nehemaịa 12:26, 27) Ihe ama na-egosi na ka ọ na-erule n’ọgwụgwụ nke narị afọ nke ise T.O.A., e wughachichaala Jerusalem dị ka obodo bụ́ isi nke ụwa oge ochie.

      Mesaịa Apụta!

      19. Olee otú Mesaịa si kweta na Jerusalem nwere ọnọdụ pụrụ iche?

      19 Otú ọ dị, ka anyị mafere narị afọ ụfọdụ wee gaa n’ihe omume nke dị mkpa n’eluigwe na ala, bụ́ ọmụmụ Jisọs Kraịst. Mmụọ ozi Jehova Chineke agwala nne Jisọs bụ́ nwanyị na-amaghị nwoke, sị: “Onyenwe anyị Chineke ga-enyekwa Ya ocheeze nna Ya Devid: . . . alaeze Ya agaghị agwụkwa agwụ.” (Luk 1:32, 33) Ọtụtụ afọ mgbe nke a gasịrị, Jisọs ziri Ozizi Elu Ugwu ya a ma ama. N’ime ya, o nyere agbamume na ndụmọdụ n’ọtụtụ isiokwu. Dị ka ihe atụ, ọ gbara ndị na-ege ya ntị ume imezu nkwa ha kwere Chineke ma kpachara anya ịghara ịdaba n’ịṅụ iyi na-enweghị isi. Jisọs sịrị: “Unu nụrụ na a gwara ndị ochie, sị, Aṅụla iyi ụgha, kama nyeghachi Onyenwe anyị ihe nile ị ṅụrụ n’iyi: ma Mụ onwe m sị unu, Aṅụla iyi ma ọlị; ejila eluigwe ṅụọ, n’ihi na ọ bụ ocheeze Chineke; ejikwala ala, n’ihi na ọ bụ ihe mgbakwasị ụkwụ nke ụkwụ Ya; aṅụkwala iyi n’ebe Jerusalem dị, n’ihi na ọ bụ obodo nke Eze ukwu ahụ.” (Matiu 5:33-35) Ọ bụ ihe kwesịrị ịrịba ama na Jisọs kwetara na Jerusalem nwere ọnọdụ pụrụ iche—nke dịgideworo otú ahụ ruo ọtụtụ narị afọ. Ee, ọ bụ “obodo nke Eze ukwu ahụ,” bụ́ Jehova Chineke.

      20, 21. Mgbanwe dị aṅaa dị ịrịba ama mere n’àgwà nke ọtụtụ ndị bi na Jerusalem?

      20 Ka njedebe nke ndụ elu ala ya na-eru nso, Jisọs gosiri ndị bi na Jerusalem onwe ya dị ka Eze ha e tere mmanụ n’ezie. Ná nzaghachi nye ihe omume ahụ na-akpali akpali, ọtụtụ ndị tiri mkpu ọṅụ, sị: “Onye a gọziri agọzi ka Onye ahụ bụ Nke na-abịa n’aha Onyenwe anyị: Ihe a gọziri agọzi ka alaeze bụ nke na-abịa, alaeze nke nna anyị Devid.”—Mak 11:1-10; Jọn 12:12-15.

      21 Otú ọ dị, n’ihe na-erughị otu izu, ìgwè mmadụ ahụ kwere ka ndị ndú okpukpe nke Jerusalem tụgharịa ha imegide Jisọs. Ọ dọrọ aka ná ntị na obodo Jerusalem na mba ahụ dum ga-atụfu ọnọdụ ihu ọma ha nwere n’ihu Chineke. (Matiu 21:23, 33-45; 22:1-7) Dị ka ihe atụ, Jisọs kwupụtara, sị: “Jerusalem, Jerusalem, nke na-egbu ndị amụma, nke na-ewerekwa nkume atụ ndị e zitewooro ya! ọtụtụ mgbe ole ka M chọrọ ịchịkọ ụmụ gị, ọbụna dị ka nnekwu ọkụkọ na-achịkọ ụmụ ya n’okpuru nkù ya abụọ, ma unu achọghị! Lee, a na-ahapụrụ unu ụlọ unu ka ọ tọgbọrọ n’efu.” (Matiu 23:37, 38) N’oge Ememe Ngabiga na 33 O.A., ndị na-emegide Jisọs gburu ya n’èzí Jerusalem n’enweghị ihe o mere. Otú o sina dị, Jehova kpọlitere Onye ya E Tere Mmanụ n’ọnwụ, werekwa ndụ anwụghị anwụ nke ndị bụ́ mmụọ na Zaịọn nke eluigwe mee ka ọ dị ebube, bụ́ mmezu ihe nke anyị nile pụrụ irite uru na ya.—Ọrụ 2:32-36.

      22. Mgbe ọnwụ Jisọs gasịrị, nkọwa dị aṅaa ka ọtụtụ izo aka e zoro na Jerusalem nweworo?

      22 Site mgbe ahụ gaa n’ihu, a pụrụ ịghọta ihe ka ọtụtụ n’amụma ndị na-emezubeghị bụ́ ndị e buru banyere Zaịọn, ma ọ bụ Jerusalem, dị ka ndị metụtara ndokwa eluigwe ma ọ bụ ụmụazụ Jisọs e tere mmanụ. (Abụ Ọma 2:6-8; 110:1-4; Aịsaịa 2:2-4; 65:17, 18; Zekaraịa 12:3; 14:12, 16, 17) Ọtụtụ izo aka e zoro n’ebe “Jerusalem” ma ọ bụ “Zaịọn” dị bụ́ ndị e dere mgbe ọnwụ Jisọs gasịrị nwere echiche ihe atụ n’ụzọ doro anya, ha adịghịkwa ezo aka n’obodo ma ọ bụ ebe nkịtị ahụ. (Ndị Galetia 4:26; Ndị Hibru 12:22; 1 Pita 2:6; Mkpughe 3:12; 14:1; 21:2, 10) Ihe nnwapụta ikpeazụ nke na-egosi na Jerusalem abụghịzi “obodo nke Eze ukwu ahụ” bịara na 70 O.A. mgbe usuu ndị agha Rom bibiri ya, dị ka Daniel na Jisọs Kraịst buru n’amụma. (Daniel 9:26; Luk 19:41-44) Ma ndị dere Bible ma Jisọs n’onwe ya adịghị nke buru amụma banyere mweghachi ọzọ nke Jerusalem elu ala gaa n’ihu ọma pụrụ iche o nweburu n’ebe Jehova Chineke nọ.—Ndị Galetia 4:25; Ndị Hibru 13:14.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya