-
Onyinye A Na-enye Ndị EzeỤlọ Nche—2015 | Mach 1
-
-
Onyinye A Na-enye Ndị Eze
“Ndị na-agụ kpakpando, bụ́ ndị si n’ebe ọwụwa anyanwụ, . . . meghekwara igbe akụ̀ ha wee nye ya onyinye, ya bụ, ọlaedo na frankinsens na mea.”—Matiu 2:1, 11.
Ọ BỤRỤ na ị chọrọ inye eze obodo unu ma ọ bụ onye ọzọ a ma ama onyinye, gịnị ka ị ga-enye ya? N’oge ochie, e weere ihe ndị na-esi ísì ọma otú e si were ọlaedo, nke na a na-eji ha enye ndị eze onyinye.a Ọ bụ ya mere ihe abụọ na-esi ísì ọma ji dịrị n’onyinye ahụ ndị na-agụ kpakpando nyere “eze ndị Juu.”—Matiu 2:1, 2, 11.
Mmanụ bọlsọm
Baịbụl gwakwara anyị na mgbe eze nwaanyị Shiba bịara ileta Sọlọmọn, o nyere ya “ọlaedo dị otu narị talent na iri abụọ na mmanụ bọlsọm dị nnọọ ukwuu na nkume dị oké ọnụ ahịa; ọ dịghị mmanụ bọlsọm ha ka nke ahụ eze nwaanyị Shiba buteere Eze Sọlọmọn.”b (2 Ihe E Mere 9:9) E nwekwara ndị eze ndị ọzọ na-ewetara Sọlọmọn mmanụ bọlsọm iji gọọrọ ya ọfọ ọma.—2 Ihe E Mere 9:23, 24.
Gịnị mere e ji achọsi ihe ndị a na-esi ísì ọma ike mgbe ahụ, ha ana-adakwa ọnụ? Ọ bụ n’ihi na e nwere ọtụtụ ihe ndị e ji ha eme. Dị ka ihe atụ, a na-eji ha eme ihe ndị e ji achọ mma, jiri ha efe ofufe, jirikwa ha akwadebe ozu maka olili. (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Ihe A Na-eji Ihe Ndị Na-esi Ísì Ọma Eme n’Oge Ochie.”) E wezụgakwa na a na-achọsi ha ike, ihe ọzọ mere ihe ndị ahụ na-esi ísì ọma ji ada ọnụ bụ na a na-emefu nnukwu ego iji tụbata ha.
ỊGAFE ỌZARA AREBIA
Kashịa
N’oge ochie, ụfọdụ osisi ndị e si na ha emepụta ihe ndị na-esi ísì ọma dị na Ndagwurugwu Jọdan. Ma, a na-atụbata ihe ndị ọzọ na-esi ísì ọma atụbata. E nwere ọtụtụ ihe na-esi ísì ọma e kwuru okwu ha na Baịbụl. Ụfọdụ n’ime ha a kacha mara bụ okooko safrọn, ahịhịa alo, mmanụ bọlsọm, sinamọn, frankinsens, na mea. E nwekwara ihe ndị na-esi ísì ọma e ji eme ka nri dịkwuo ụtọ, dị ka, kọmin, mkpá akwụkwọ mint, na mkpá akwụkwọ dil.
Olee ebe e si enweta ihe ndị a na-esi ísì ọma? E si na Chaịna, India, na Siri Lanka enweta ahịhịa alo, osisi kashịa, na sinamọn. Ebe e si enweta mea na frankinsens bụ n’osisi ndị dị n’ọzara malite n’ebe ndịda Arebia ruo Somalịa dị n’Afrịka. Ma, ọ bụ naanị n’India ka e si enweta ihe e ji eme mmanụ nad nke a na-akpọkwa mmanụ spaịknad.
Okooko safrọn
A na-esi Arebia ebubata ọtụtụ ihe ndị a na-esi ísì ọma n’Izrel. Otu akwụkwọ kwuru banyere ihe ndị a na-esi ísì ọma kwuru na n’ihe dị ka n’agbata puku afọ anọ na puku afọ atọ gara aga, ọ bụ ndị Arebia kacha esi ná mba ndị dị n’Eshia eburu ngwá ahịa aga ná mba ndị dị na Yurop. Na Negev, bụ́ obodo dị n’ebe ndịda Izrel, e nwere ihe ndị gosiri na ndị a na-agba ahịa ihe ndị na-esi ísì ọma na-esi n’obodo ahụ agafe. Ihe ndị ahụ bụ ụlọ ndị mgbe ochie, ebe ndị e wusiri ike ndị agha na-anọ, na ebe dị iche iche ndị ahịa na-akwụsịtụ ezuru ike. Ndị na-arụ n’isi ụlọ ọrụ òtù UNESCO kwuru na otú e si rụọ ebe ndị ahụ ‘gosiri na ndị a na-esi n’ebe ndịda Arebia ebu ahịa aga n’obodo ndị dị nso n’Oké Osimiri Mediterenian na-enweta ezigbo ego n’ahịa a ha na-agba.’
Otu akwụkwọ a na-akpọ The Book of Spices kwuru, sị: “Ihe ndị na-esi ísì ọma na-adị ntakịrị, dị ọnụ, dịkwa ụkọ. A na-achọsikwa ha ike.”
Ndị ahịa a na-ebu ihe ndị a na-esi ísì ọma aga n’ebe dị iche iche n’Arebia. Ha na-aga ihe dị ka otu puku kilomita na narị asatọ iji gazuo ebe ndị a. (Job 6:19) Baịbụl kọrọ gbasara ndị Ishmel si Gilied buru ngwá ahịa ha, bụ́ ihe ndị na-esi ísì ọma, na-aga Ijipt. Ha bu “mmanụ labdanọm na mmanụ bọlsọm na ụgbụgbọ osisi nke nwere esó.” (Jenesis 37:25) Ụmụ Jekọb resịrị ndị ahịa a Josef nwanne ha ka ọ gaa gbawa ohu.
-