Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w24 Febụwarị p. 31
  • Ị̀ Maara?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Maara?
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Mere Anyị Ga-eji Dị Nsọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Ị̀ Na-eme Ka “Ọta Ukwu Bụ́ Okwukwe” Gị Dị Otú O Kwesịrị?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
  • Ònye Chepụtara Baịbụl?
    Teta!—2008
  • Jiri Ndụ Kpọrọ Ihe
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
w24 Febụwarị p. 31
Ebe Ezra ji akwụkwọ mpịakọta na-eto Jehova n’ihu ndị Izrel.

Ị̀ Maara?

Olee ihe mere Baịbụl ji ekwughachi otu ihe?

MGBE ụfọdụ, ndị dere Baịbụl na-ekwughachi otu ihe. Ka anyị lee ihe atọ o nwere ike ịbụ ya mere ha ji mee otú ahụ.

Oge e dere Baịbụl. N’Izrel oge ochie, ọtụtụ ndị enweghị akwụkwọ Iwu Mosis. Mgbe ha kacha anụ ka a na-agụpụtara ha Iwu ahụ bụ ma ha gbakọta n’ụlọikwuu. (Diut. 31:10-12) Ọ ga-abụ na e nwere ihe ndị na-eme ka uche ìgwè mmadụ ahụ gbakọtara pụọ n’ihe a na-agụpụtara ha. Ha na-akwụkwa ọtọ ruo awa ụfọdụ. (Nehe. 8:2, 3, 7) N’ụdị oge ndị ahụ, ikwughachi isi ihe nwere ike ime ka ọ dịrị ndị mmadụ mfe icheta ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru ma mee ya. Ọ ga-abụ na ikwughachi okwu ụfọdụ kacha nyere ha aka icheta ụmụ irighiri ihe dị n’iwu Chineke nyere ha.​—Lev. 18:4-22; Diut. 5:1.

Otú e si ede ihe. E kee ihe dị na Baịbụl ụzọ iri, ihe dị ka otu ụzọ n’ime ha bụ abụ, dị ka Abụ Ọma, Abụ Solomọn, na Abụ Ákwá. Mgbe ụfọdụ, a na-ekwughachi otu ihe n’abụ. Ọ na-eme ka e cheta isiokwu abụ ahụ, na-enyekwara onye na-ege ya aka ibute okwu ndị dị na ya n’isi. Dị ka ihe atụ, lee ihe e kwuru n’Abụ Ọma 115:9-11. Ebe ahụ sịrị: “Unu ndị Izrel, tụkwasịnụ Jehova obi. Ọ bụ ya na-enyere unu aka, bụrụkwa ọta unu. Ezinụlọ Erọn, tụkwasịnụ Jehova obi. Ọ bụ ya na-enyere unu aka, bụrụkwa ọta unu. Unu ndị na-atụ egwu Jehova, tụkwasịnụ Jehova obi. Ọ bụ ya na-enyere unu aka, bụrụkwa ọta unu.” Ị̀ chọpụtara otú ikwughachi okwu ndị ahụ si nyere ndị na-abụ abụ ahụ aka ime ka eziokwu bara ezigbo uru bamie n’obi ha nakwa n’uche ha?

Iji mee ka okwu ndị gbara ọkpụrụkpụ pụta ìhè. Mgbe ụfọdụ, ndị dere Baịbụl na-ekwughachi okwu ụfọdụ dị mkpa. Dị ka ihe atụ, mgbe Jehova nyere ụmụ Izrel iwu ka ha ghara iri ọbara, o mere ka Mosis kwughachi ya ọtụtụ ugboro. Chineke chọrọ ka ụmụ Izrel mara na ndụ anụmanụ dị n’ọbara ya, ya bụ, na ọbara na-anọchi anya ndụ. (Lev. 17:11, 14) Mgbe e mechara, mgbe ndịozi na ndị okenye nọ na Jeruselem degaara Ndị Kraịst akwụkwọ ozi gbasara ihe ha kwesịrị izere ka ihe ha na-amasị Chineke, ha kwughachiri na ọ dị mkpa ka ha ghara iri ọbara.​—Ọrụ 15:20, 29.

Ọ bụ eziokwu na e kwughachiri ihe ụfọdụ na Baịbụl, mana ọ pụtaghị na Jehova chọrọ ka anyị na-ekwughachi ihe dị na Baịbụl mgbe niile. Dị ka ihe atụ, Jizọs sịrị: “Mgbe ị na-ekpe ekpere, ekwughachila otu ihe ugboro ugboro.” (Mat. 6:7) O kwuziri ihe ndị anyị nwere ike ikpe ekpere gbasara ha. (Mat. 6:9-13) N’ihi ya, ọ bụ eziokwu na anyị anaghị ekwughachi otu ihe ugboro ugboro ma anyị kpewe ekpere, anyị nwere ike ikpe ekpere gbasara otu ihe ọtụtụ ugboro.​—Mat. 7:7-11.

N’ihi ya, ọ dabara adaba na Okwu Chineke kwughachiri okwu ụfọdụ. Ọ bụ otu n’ime ụzọ Onye Ozizi Kachanụ si akụziri anyị otú anyị ga-esi baara onwe anyị uru.​—Aịza. 48:17, 18.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya