Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 7/1 p. 4-7
  • Olee Otú Jisọs Pụrụ Isi Gbanwee Ndụ Gị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Otú Jisọs Pụrụ Isi Gbanwee Ndụ Gị?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ozizi Ya
  • Ihe Ndị O Mere
  • Àjà Ya
  • Jizọs Kraịst—Ònye Ka Ọ Bụ?
    Jizọs Kraịst—Ònye Ka Ọ Bụ?
  • Ònye Bụ Jisọs Kraịst?
    Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?
  • Jizọs Kraịst Ònye Ka Ọ Bụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Ọ Hụrụ Ndị Mmadụ n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 7/1 p. 4-7

Olee Otú Jisọs Pụrụ Isi Gbanwee Ndụ Gị?

JISỌS KRAỊST bụ Onye Ozizi Ukwu nke biri na Palestine ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 2,000 gara aga. A maara ihe dị nnọọ nta banyere oge ọ bụ nwata. Otú ọ dị, ọ bụ ihe a nwapụtara nke ọma na mgbe ọ gbara ihe dị ka afọ 30, ọ malitere ozi ya iji “gbaara eziokwu àmà.” (Jọn 18:37; Luk 3:21-23) Ndị na-eso ụzọ anọ bụ́ ndị dekọrọ akụkọ ndụ ya lekwasịrị anya n’afọ atọ na ọkara ndị sochirinụ.

N’oge ije ozi ya, Jisọs Kraịst nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu nke pụrụ ịbụ ihe ngwọta nye ọtụtụ nsogbu nke ụwa. Gịnị ka ọ bụ? Jisọs sịrị: “Iwu ọhụrụ ka M na-enye unu, ka unu hụrịta ibe unu n’anya; dị ka M hụrụ unu n’anya, ka unu onwe unu hụrịtakwa ibe unu n’anya.” (Jọn 13:34) Ee, ihe ngwọta nye ọtụtụ nsogbu nke ihe a kpọrọ mmadụ bụ ịhụnanya. N’oge ọzọ, mgbe a jụrụ Jisọs iwu nke kasịnụ, ọ zara, sị: “Ị ga-ewere obi gị dum, werekwa mkpụrụ obi gị dum, werekwa uche gị dum, hụ Onyenwe anyị Chineke gị n’anya. Nke a bụ ihe ukwu na ihe mbụ e nyere n’iwu. Ihe nke abụọ nke yiri ya bụ nke a, Ị ga-ahụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.”—Matiu 22:37-40.

Jisọs gosiri anyị site n’okwu na n’omume ụzọ anyị ga-esi hụ Chineke na mmadụ ibe anyị n’anya. Ka anyị tụlee ihe atụ ole na ole ma hụ ihe anyị pụrụ ịmụta n’aka ya.

Ozizi Ya

N’otu n’ime ozizi a kasị mara amara n’akụkọ ihe mere eme, Jisọs Kraịst gwara ụmụazụ ya, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịbụ ohu nke nna abụọ: n’ihi na ọ ga-akpọ otu onye n’ime ha asị, hụ ibe ya n’anya; ma ọ́ bụghị otú a ọ ga-ejide otu, lelịa ibe ya anya. Unu apụghị ịbụ ohu Chineke na akụ̀.” (Matiu 6:24) Ozizi Jisọs banyere ibute Chineke ụzọ ná ndụ anyị ọ̀ ka dị irè taa, bụ́ mgbe ọtụtụ mmadụ kweere na ego na-egbo mkpa nile? N’eziokwu, ego dị anyị mkpa iji gboo mkpa anyị. (Eklisiastis 7:12) Ma, ọ bụrụ na anyị ekwe ka “akụ̀” bụrụ nna anyị ukwu, “ịhụ ego n’anya” ga-achịkwa anyị, na-achịkwa ndụ anyị nile. (1 Timoti 6:9, 10) Ọtụtụ ndị dabara n’ọnyà a emesịwo tụfuo ezinụlọ ha, ahụ ike ha, na ọbụna ndụ ha.

N’aka nke ọzọ, ilegara Chineke anya dị ka Nna Ukwu anyị na-eme ka ndụ anyị nwee nzube. Dị ka Onye Okike, ọ bụ Isi Iyi nke ndụ, n’ihi ya kwa, nanị ya ruru eru ịnara ofufe anyị. (Abụ Ọma 36:9; Mkpughe 4:11) A na-akwali ndị mụtara banyere àgwà ya ma bịa hụ ya n’anya idebe iwu ya. (Eklisiastis 12:13; 1 Jọn 5:3) Site n’ime otú ahụ, anyị na-abara onwe anyị uru.—Aịsaịa 48:17.

N’Ozizi Elu Ugwu ahụ, Jisọs kụzikwaara ndị na-eso ụzọ ya otú ha ga-esi gosipụta ịhụnanya n’ebe mmadụ ibe ha nọ. Ọ sịrị: “Ya mere ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke unu na-achọ ka mmadụ na-eme unu, na-emekwanụ mmadụ otú a, unu onwe unu.” (Matiu 7:12) Okwu ahụ bụ́ “mmadụ” nke Jisọs ji mee ihe n’ebe a gụnyere ọbụna ndị iro mmadụ. N’otu ozizi ahụ, ọ sịrị: “Na-ahụnụ ndị iro unu n’anya, na-ekpekwa ekpere nye ndị na-esogbu unu.” (Matiu 5:43, 44) Ọ̀ bụ na ịhụnanya dị otú ahụ agaghị edozi ọtụtụ nsogbu anyị na-eche ihu taa? Onye ndú ndị Hindu bụ́ Mohandas Gandhi chere otú ahụ. E hotara ya dị ka onye kwuru, sị: “Mgbe [anyị] ga-ekwenyekọ n’ozizi nile nke Kraịst ziri n’ime Ozizi Elu Ugwu nke a, anyị ga-edoziwo nsogbu nile . . . nke ụwa dum.” Ozizi Jisọs banyere ịhụnanya pụrụ idozi ọtụtụ n’ime nsogbu nke ihe a kpọrọ mmadụ, ma ọ bụrụ na e tinye ya n’ọrụ.

Ihe Ndị O Mere

Ọ bụghị nanị na Jisọs kụziri eziokwu ndị miri emi banyere ụzọ a pụrụ isi gosipụta ịhụnanya kama o mekwara ihe ọ kụziri. Dị ka ihe atụ, o butere ọdịmma ndị ọzọ ụzọ tupu nke ya. Otu ụbọchị Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya ji ọrụ n’aka n’inyere ndị mmadụ aka nke na ha enweghị ohere ọbụna iri nri. Jisọs hụrụ na ọ dị mkpa ka ndị na-eso ụzọ ya zuru ike nke nta, ọ kpọkwaara ha gaa n’ebe dara jụụ. Ma mgbe ha ruru ebe ahụ, ha hụrụ ìgwè mmadụ na-eche ha. Olee otú ị gaara esiwo meghachi omume mgbe ị hụrụ ìgwè mmadụ tụrụ anya ka ị rụọ ọrụ mgbe i chere na ọ dị mkpa ka i zurutụ ike? Jisọs ‘nwere ọmịiko n’ahụ ha,’ o wee “malite izi ha ọtụtụ ihe.” (Mak 6:34) Nchegbu a Jisọs nwere banyere ndị ọzọ kwaliri ya mgbe nile inyere ha aka.

Ọ bụghị nanị izi ihe ka Jisọs ziri ndị mmadụ. O nyekwaara ha aka n’ụzọ nkịtị. Dị ka ihe atụ, n’otu oge, o nyere ihe karịrị mmadụ 5,000 nri bụ́ ndị nọworo na-ege ya ntị ruo anyasị. N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, o nyere ìgwè mmadụ ọzọ buru ibu nri—nke ugbu a ihe karịrị mmadụ 4,000—ndị nọworo na-ege ya ntị ruo ụbọchị atọ, ndị na-enweghịkwa ihe fọdụrụnụ ha ga-eri. Na nke mbụ ahụ, o ji ogbe achịcha ise na azụ̀ abụọ mee ihe, ná nke abụọ kwa, ogbe achịcha asaa na obere azụ̀ ole na ole. (Matiu 14:14-22; 15:32-38) Hà bụ ọrụ ebube? Ee, ọ bụ onye na-arụ ọrụ ebube.

Jisọs gwọkwara ọtụtụ ndị na-arịa ọrịa. Ọ gwọrọ ndị ìsì, ndị ngwụrọ, ndị ekpenta, na ndị ntị chiri. Leenụ, ọbụna ọ kpọlitere ndị nwụrụ anwụ! (Luk 7:22; Jọn 11:30-45) N’otu oge, onye ekpenta rịọrọ ya, sị: “Ọ bụrụ na Ị na-achọ, Ị pụrụ ime ka m dị ọcha.” Olee otú Jisọs si meghachi omume? “O wee nwee ọmịiko, setịpụ aka Ya, metụ ya, sị ya, Ana m achọ; ka e mee ka ị dị ọcha.” (Mak 1:40, 41) Site n’ọrụ ebube ndị dị otú ahụ, Jisọs gosipụtara ịhụnanya o nwere n’ebe ndị na-ata ahụhụ nọ.

Ọ̀ na-esiri gị ike ikwere n’ọrụ ebube ndị Jisọs rụrụ? Ọ na-esiri ụfọdụ ike ikwere. Ma, cheta na Jisọs rụrụ ọrụ ebube ya n’ihu ọha. Ọbụna ndị na-emegide ya, bụ́ ndị nwara ịchọta ebe ha ga-ata ya ụta n’oge ọ bụla, apụghị ịgọpụ na ọ bụ onye na-arụ ọrụ ebube. (Jọn 9:1-34) Ọzọkwa, ọrụ ebube ya nile nwere nzube e ji rụọ ha. Ha nyeere ndị mmadụ aka ịmata ya dị ka Onye Chineke zitere.—Jọn 6:14.

N’ịrụ ọrụ ebube, Jisọs anọghị na-achọ ịdọta mmasị n’ebe ya onwe ya nọ. Kama nke ahụ, o nyere Chineke, bụ́ Isi Iyi nke ike ya, otuto. N’otu oge na Kapanaum, ọ nọ n’otu ụlọ ndị mmadụ jupụtara. Otu nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ chọrọ ka a gwọọ ya ma o nweghị ike ịbata. Ya mere ndị enyi ya si n’elu ụlọ budata ya n’elu ihe ndina. Mgbe ọ hụrụ okwukwe ha, Jisọs gwọrọ onye ahụ akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. N’ihi ya, ndị mmadụ “wee too Chineke” ma kwuo, sị: “Ọ dịghị mgbe ọ bụla anyị hụrụ ya otú a.” (Mak 2:1-4, 11, 12) Ọrụ ebube Jisọs wetaara Jehova, bụ́ Chineke ya, otuto, nyekwara ndị nọ ná mkpa aka.

Otú ọ dị, ịgwọ ndị ọrịa site n’ọrụ ebube abụghị ihe bụ́ isi n’ozi Jisọs. Otu onye dere akụkọ ndụ Jisọs kọwara, sị: “E dewo ihe ndị a n’akwụkwọ, ka unu wee kwere na Jisọs bụ Kraịst ahụ, Ọkpara Chineke; ka unu wee nweekwa ndụ n’aha Ya n’ihi na unu kweere.” (Jọn 20:31) Ee, Jisọs bịara n’ụwa ka mmadụ ndị kweere wee nwee ike ịdị ndụ.

Àjà Ya

‘Jisọs ọ̀ bịara n’ụwa?’ ka ị pụrụ ịjụ. ‘Ò si ebee bịa?’ Jisọs n’onwe ya sịrị: “Esiwo m n’eluigwe rịdata, ọ bụghị ka M na-eme ihe Mụ onwe m na-achọ, kama ka M na-eme ihe Onye zitere m na-achọ.” (Jọn 6:38) Ọ dị adị dị ka Ọkpara Chineke mụrụ nanị ya tupu ọ ghọọ mmadụ. Gịnịzi bụ ọchịchọ nke Onye ahụ zitere ya n’ụwa? “Chineke hụrụ ụwa n’anya otú a, na O nyere ọbụna Ọkpara Ọ mụrụ nanị Ya,” ka Jọn, bụ́ otu n’ime ndị dere Oziọma ndị ahụ, na-ekwu, “ka onye ọ bụla nke kwere na Ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Olee otú nke a si kwee omume?

Bible na-ekpughe otú ọnwụ si ghọọ ahụmahụ nke ihe a kpọrọ mmadụ na-apụghị izere ezere. Di na nwunye mbụ ahụ bụ́ mmadụ nwetara ndụ na atụmanya nke ịdịru ebighị ebi site n’aka Chineke. Otú ọ dị, ha họọrọ inupụrụ Onye Mere ha isi. (Jenesis 3:1-19) N’ihi omume a, bụ́ mmehie mbụ nke mmadụ, ụmụ Adam na Iv ketara ihe nketa na-adịghị mma bụ́ ọnwụ. (Ndị Rom 5:12) Iji nye ihe a kpọrọ mmadụ ndụ nke bụ́ ndụ n’ezie, a ghaghị iwepụ mmehie na ọnwụ.

Ọ dịghị ọkà mmụta sayensị pụrụ iwepụ ọnwụ site n’ụdị ọ bụla nke nkà mgbanwe mkpụrụ ndụ ihe nketa. Ma, Onye Okike nke ihe a kpọrọ mmadụ nwere ụzọ ọ ga-esi mee ka ndị mmadụ na-erube isi zuo okè ka ha wee nwee ike ịdị ndụ ebighị ebi. N’ime Bible, a kpọrọ ndokwa a ihe mgbapụta. Di na nwunye mbụ ahụ bụ́ mmadụ rere onwe ha na ụmụ ha gaa n’ịbụ ohu nke mmehie na ọnwụ. Ha ji ndụ dị ka ndị mmadụ zuru okè na-erubere Chineke isi gbanwere ịdị ndụ n’adabereghị n’ebe Chineke nọ, na-emere onwe ha mkpebi banyere ihe bụ́ ihe ọma na ihe bụ́ ihe ọjọọ. Iji zụtaghachi ndụ mmadụ zuru okè, a ghaghị ịkwụ ụgwọ nke ya na ndụ mmadụ zuru okè ahụ nne na nna anyị mbụ tụfuru hà nhata. Ebe ha ketarala ezughị okè, ụmụ mmadụ erughị eru ịkwụ ụgwọ ahụ.—Abụ Ọma 49:7.

Ya mere Jehova Chineke batara iji nye aka. O bufere ndụ zuru okè nke Ọkpara ọ mụrụ nanị ya n’akpa nwa nke otu nwanyị na-amaghị nwoke, bụ́ onye mụrụ Jisọs. N’ọtụtụ iri afọ gara aga, ị pụrụ ịjụwo echiche nke ịmụ nwa n’enweghị mmekọahụ. Otú ọ dị, taa, ndị ọkà mmụta sayensị emewo ka anụmanụ ndị na-enye nwa ara nwee ụmụ n’enweghị oké gbara ha, sitekwa n’otu anụ were mkpụrụ ndụ ihe nketa tinye n’ọzọ. Mgbe ahụ, ònye pụrụ ịrụ ụka n’ụzọ ziri ezi na Onye Okike enweghị ikike nke ime ka a mụọ nwa n’agazughị usoro ọmụmụ nkịtị?

Ebe ọ bụ na ndụ mmadụ zuru okè adịla, e nwetara ihe ahụ a ga-eji kwụọ ụgwọ mgbapụta ihe a kpọrọ mmadụ pụọ ná mmehie na ọnwụ. Ma, nwata ahụ a mụrụ n’ụwa bụ́ Jisọs aghaghị itolite iji ghọọ “dibịa” ahụ nwere ike inye “ọgwụ” a ga-eji gwọọ nsogbu nile nke ihe a kpọrọ mmadụ. O mere nke a site n’ibi ndụ zuru okè, nke na-enweghị mmehie. Ọ bụghị nanị na Jisọs hụrụ nhụjuanya nke ihe a kpọrọ mmadụ n’okpuru mmehie kama o nwere ahụmahụ nke erughị eru n’anụ ahụ dị ka mmadụ. Nke a mere ka ọ bụrụ dibịa nwere ọmịiko ọbụna karị. (Ndị Hibru 4:15) Ọrịa ndị ọ gwọrọ n’ụwa n’ụzọ ọrụ ebube gosipụtara na o nwere ma ọchịchọ ma ike ịgwọ ndị ọrịa.—Matiu 4:23.

Mgbe Jisọs jesịrị ozi were afọ atọ na ọkara n’ụwa ebe a, ndị na-emegide ya gburu ya. O gosipụtara na mmadụ zuru okè pụrụ irubere Onye Okike isi n’agbanyeghị ọbụna ule ndị kasịnụ. (1 Pita 2:22) Ndụ mmadụ ya zuru okè nke o ji chụọ àjà ghọrọ ụgwọ ihe mgbapụta ahụ, nke nwere ike ịgbapụta ihe a kpọrọ mmadụ pụọ ná mmehie na ọnwụ. Jisọs Kraịst kwuru, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla nwere ịhụnanya karịrị nke a ukwuu, ka mmadụ tọgbọ ndụ ya n’ihi ndị enyi ya.” (Jọn 15:13) N’ụbọchị nke atọ mgbe ọ nwụsịrị, a kpọlitere Jisọs n’ọnwụ gaa ná ndụ nke mmụọ, izu ole na ole mgbe nke ahụ gasịkwara, ọ rịgooro n’eluigwe iji chee ụgwọ ihe mgbapụta ahụ n’ihu Jehova Chineke. (1 Ndị Kọrint 15:3, 4; Ndị Hibru 9:11-14) Site n’ime otú ahụ, Jisọs ji uru nke àjà mgbapụta ya mee ihe n’ebe ndị na-eso ya nọ.

Ị̀ ga-enwe ọchịchọ irite uru site n’ụzọ a nke ịgwọ ọrịa ime mmụọ, nke uche, na nke anụ ahụ? Ime otú ahụ chọrọ okwukwe n’ebe Jisọs Kraịst nọ. Gịnị ma ị bịakwute Dọkịta ahụ n’onwe gị? Ị pụrụ ime nke ahụ site n’ịmụ banyere Jisọs Kraịst na òkè o keere n’ịzọpụta ihe a kpọrọ mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi. Ndịàmà Jehova ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka.

[Foto dị na peeji nke 5]

Jisọs nwere ma ọchịchọ ma ikike ịgwọ ndị ọrịa

[Foto dị na peeji nke 7]

Olee otú ọnwụ Jisọs si emetụta gị?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya