-
Ị̀ Ga-eso Chineke Jee Ije?Ụlọ Nche—2005 | Nọvemba 1
-
-
5. Gịnị mere Jizọs ji kwuo banyere ịgbakwụnye otu kubit ná ndụ mmadụ?
5 Bible na-ejikarị ndụ atụnyere ime njem ma ọ bụ ije ije. Mgbe ụfọdụ, ọ na-eji ya atụnyere ya n’ụzọ pụtara ìhè, ma n’ebe ndị ọzọ, ọ na-eji ya atụnyere ya n’ụzọ na-apụtachaghị ìhè. Dị ka ihe atụ, Jizọs kwuru, sị: “Ònye n’ime unu pụrụ ịgbakwụnye otu kubit ná ndụ ya site n’ichegbu onwe ya?” (Matiu 6:27) Okwu ahụ nwere ike ịgbagwoju gị anya. Olee ihe mere Jizọs ga-eji kwuo banyere ịgbakwụnye “otu kubit,” nke bụ́ ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nke ịdị anya, ná “ndụ” mmadụ, bụ́ nke a na-eji ihe e ji atụ oge n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ atụ?a O doro anya na Jizọs ji ndụ na-atụnyere njem. Ya mere, ihe ọ na-akụzi bụ na ichegbu onwe gị agaghịdị agbakwụnye otu nzọụkwụ na njem nke ndụ gị. Otú ọ dị, ànyị kwesịrị ikwubi na anyị apụtụghị ịgbatịkwu njem ahụ? Mbanụ! Nke ahụ na-eduga anyị n’ajụjụ nke abụọ, Gịnị mere o ji dị anyị mkpa iso Chineke jee ije?
-
-
Ị̀ Ga-eso Chineke Jee Ije?Ụlọ Nche—2005 | Nọvemba 1
-
-
a Ụfọdụ nsụgharị Bible gbanwere “kubit” dị n’amaokwu a gaa n’ihe e ji atụ oge n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, dị ka “otu sekọnd” (The Emphatic Diaglott) ma ọ bụ “otu nkeji” (A Translation in the Language of the People, nke Charles B. Williams dere). Otú ọ dị, okwu e ji mee ihe n’ihe odide mbụ pụtara nnọọ otu kubit, nke bụ́ ihe dị ka sentimita 45.
-