Ụzọ ahụ Dị Warara nke Na-eduje ná Nnwere Onwe
Ọ BỤ mmadụ ole na ole nwere ọgụgụ isi na-arụ ụka na ọ bụ iwu okike dị iche iche na-achịkwa eluigwe na ụwa. Iwu ndị a na-achịkwa ihe nile malite n’ụmụ irighiri ihe ndị dị nta ruo n’ókè ụyọkọ kpakpando ndị nwere ọtụtụ ijeri kpakpando n’ime ha. A sị na ọ dịghị otú a, a pụghị inwe ime atụmatụ na nghọta; ndụ n’onwe ya apụghị ịdị. Site n’ịghọta iwu okike na iso ha na-arụkọ ọrụ, mmadụ enwewo ike ịrụzu oké ihe ndị na-atụ n’anya, dị ka ije ije n’ọnwa na isite n’ebe ọ bụla n’ụwa ma ọ bụ ọbụna n’ebe ndị gafere mbara ụwa sepụta onyinyo ndị tụrụ àgwà àgwà n’ihu telivishọn ndị dị n’ebe obibi anyị.
Ma olee banyere iwu ndị na-achị omume ọma? Ịrapagide na ha ọ̀ bara uru ma na-arụpụtakwa ihe n’otu aka ahụ? Ọtụtụ ndị yiri ka hà na-eche na e nweghị iwu ọ bụla na-achị omume ọma ma na-ahọrọ echiche mere otú o si masị gị ma ọ bụ okpukpe nke ya na ọchịchọ ha dabakọrọ.
Otú ọ dị, e nwere ụfọdụ ndị na-ahọrọ ụzọ ọzọ dị iche, ‘ụzọ ahụ dị warara nke na-eduba ná ndụ’ dị ka e depụtara ya n’ime Bible. O kwesịghị iju anyị anya na nke a bụ nhọrọ nke nanị ọnụ ọgụgụ dị ala karị, n’ihi na Jisọs kwuru banyere ụzọ ahụ dị warara, sị: “Ole na ole ka ha dịkwa, bụ́ ndị na-achọta ya.” (Matiu 7:14) N’ihi gịnị ka o ji bụrụ nanị ole na ole?
N’ihi na iwu na ụkpụrụ nile nke Chineke na-etinye ihe mgbochi n’ụzọ ahụ dị warara. Ọ ga-abụ ihe na-adọrọ adọrọ nanị nye onye ji ezi obi na-achọ ime ka ndụ ya na ụkpụrụ nile nke Chineke kwekọọ. N’ụzọ dị nnọọ iche n’ebe ụzọ ahụ sara mbara dị, bụ́ nke na-enye echiche ụgha nke nnwere onwe ma bụrụ n’ezie nke na-eme mmadụ ohu, ụzọ ahụ dị warara, nke yiri ihe na-egbochi mmadụ, na-eme ka mmadụ nwere onwe ya n’akụkụ nile dị mkpa. Ihe ndị e ji mee ókèala ya nile bụ “iwu zuru okè, bụ́ iwu nke inwe onwe.”—Jemes 1:25.
Otú Ụzọ ahụ Dị Warara Si Enye Nnwere Onwe
N’eziokwu, ọ naghị adị mfe mgbe nile ịnọgide n’ime ụzọ ahụ dị warara. Mmadụ ọ bụla dị ndụ ezughị okè, nweekwa ọchịchọ e ketara eketa nke ime ihe ọjọọ. Ya mere mmadụ pụrụ ịkpafutụ ntakịrị. Ka o sina dị, uru nile nke ịrapagide ‘n’ụzọ ahụ dị warara’ ruru eru ka e nye ya njide onwe onye ma ọ bụ mgbanwe ọ bụla dị mkpa, n’ihi na Chineke ‘na-ezi anyị ime ihe ga-abara onwe anyị uru.’—Aịsaịa 48:17; Ndị Rom 3:23.
Iji maa atụ: Ndị nne na nna maara ihe na-atụpụtara ụmụ ha ụzọ iri ihe ‘dị mkpagide.’ Nke a na-apụta mgbe ụfọdụ ịgbasi aka ike n’oge nri. Ma mgbe ụmụaka ndị ahụ mere okenye karị, ha ga-enwe ekele maka ọzụzụ ịhụnanya nke ndị mụrụ ha. Dị ka ndị okenye, ha ga-azụliteworị ọchịchọ maka ezi ihe oriri. Ụdị ihe oriri dị iche iche na-edozi ahụ e nwekwara ga-eme ka ha ghara inwe mgbe ọ bụla mmetụta nke ịbụ ndị e gbochiri.
N’ụzọ ime mmụọ, Chineke na-eme otu ihe ahụ n’ebe ndị nọ n’ụzọ ahụ dị warara nke na-eduje ná ndụ nọ. Ọ na-azụlite n’ime ndị dị umeala n’obi ezi ọchịchọ ndị na-eduje n’obi ụtọ na ezi nnwere onwe. Ọ na-eme nke a site n’inye Okwu ya, bụ́ Bible. Ọzọkwa, ọ na-akpọ anyị òkù ikpe ekpere maka mmụọ ya iji nyere anyị aka, ọ na-enyekwa anyị iwu iso ndị Kraịst ibe anyị na-akpakọrịta, bụ́ ndị pụrụ ịgba anyị ume ịnọgide n’ụzọ ahụ dị warara. (Ndị Hibru 10:24, 25) Ee, Chineke bụ ịhụnanya, àgwà nke a kasị elu bụ ebe nzube ya na ụzọ ya nile gbakwasịrị ụkwụ.—1 Jọn 4:8.
Mgbe ịhụnanya, udo, ịdị mma, njide onwe onye, na mkpụrụ ndị ọzọ nke mmụọ Chineke jupụtara, ụzọ ahụ dị warara adịghị eyi ihe na-egbochi mmadụ. Dị ka akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ na-ekwu, “ọ dịghị iwu na-emegide ihe nile dị otú a.” (Ndị Galetia 5:22, 23) “Ebe Mmụọ nke Onyenwe anyị nọ, n’ebe ahụ ka mmadụ nweere onwe ha.” (2 Ndị Kọrint 3:17) Ọbụna ugbu a, ezi ndị Kraịst na-anụtatụ ụtọ nke nnwere onwe nke a. Ha nweere onwe ha pụọ n’ọtụtụ n’ime egwu ji ndị mmadụ aka taa, dị ka egwu maka ọdịnihu na egwu nkwenkwe ụgha banyere ọnwụ. Lee ka o si bụrụ ihe na-akpali akpali ịtụgharị uche n’ọdịnihu mgbe “ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri”! (Aịsaịa 11:9) Mgbe ahụ, a gaghị enwe ọbụna egwu maka mpụ. A ga-ewepụsị ihe mkpọchi na ihe ngechibido nile ruo mgbe ebighị ebi. Mmadụ nile ga-enwe mmetụta nke ịbụ ndị nweere onwe ha na nke ịnọ ná nchebe—ehihie na abalị, n’ụlọ na n’èzí. Nke ahụ ga-abụ nnwere onwe n’ezie!
E Mesiri Anyị Obi Ike Banyere Enyemaka Chineke
N’eziokwu, ibi ndụ dị ka ụkpụrụ Chineke si dị na-achọ mgbalị, ma “ihe O nyere n’iwu adịghịkwa arọ,” ọbụna nye ụmụ mmadụ na-ezughị okè. (1 Jọn 5:3) Ka anyị na-agbanwe aga n’ụzọ ahụ dị warara ma na-ahụkwa uru ndị dị n’ije ije n’ime ya, anyị na-azụlite ịkpọasị na-arị elu maka ụzọ na echiche nile ndị e ji mara ndị nọ n’ụzọ ahụ sara mbara. (Abụ Ọma 97:10) Irubere iwu Chineke isi bụ ihe na-adọrọ adọrọ nye akọ na uche anyị nile. Kama ‘ihe mgbu nke obi’ na “ntiwa nke mmụọ” nke e ji mara ọtụtụ ndị, Chineke na-ekwe nkwa, sị: “Lee, ndị ohu m ga-eti mkpu ọṅụ site n’obi dị mma.” Ee, obi nke Jehova zụrụ na-enwe ọṅụ ma nwere onwe ya.—Aịsaịa 65:14.
Jisọs nwụrụ iji mee ka ezi nnwere onwe kwe anyị nnweta. Bible na-asị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya otú a, na O nyere ọbụna Ọkpara Ọ mụrụ nanị Ya, ka onye ọ bụla nke kwere na Ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:16) Ugbu a, dị ka Eze nke Alaeze eluigwe nke Chineke, Jisọs na-enye abamuru dị iche iche nke àjà ahụ. N’oge na-adịghị anya, mgbe ‘oké mkpagbu ahụ’ gasịrị, mgbe a ga-ebibi ụzọ ahụ sara mbara na ndị nọ n’ime ya, ọ ga-eji ndidi malite idu ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi na-aga n’ihe fọdụrụnụ n’ụzọ ahụ dị warara ruo ná njedebe ya kpọmkwem, izu okè nke ụmụ mmadụ. (Mkpughe 7:14-17; Matiu 24:21, 29-31) N’ikpeazụ anyị ga-ahụ mmezu nke nkwa ahụ dị ebube: “A ga-eme ka ihe e kere eke onwe ya pụọkwa n’ịbụ ohu mmebi baa n’ọnọdụ inwe onwe ya nke ebube nke ụmụ Chineke.” Ọ dịghị ihe pụrụ ịkarị nnwere onwe nke a sitere n’aka Chineke. A ga-ewepụ ọbụna ọnwụ.—Ndị Rom 8:21; Mkpughe 21:3, 4.
Site n’ịhụ na ịghọta n’ụzọ doro anya ebe ụzọ ahụ dị warara na-eduje, mmadụ ga-enwe ike karị ịhọrọ ụzọ nke a ma nọgide na-eje ije n’ime ya. A na-enyere ndị na-eto eto aka karịsịa ka ha ghara ịbụ ndị na-adịghị elepụ anya n’ihu, gharakwa ịbụ ndị a kpasuru iwe n’ihi ihe ndị ha weere dị ka ihe mgbochi ndị ụkpụrụ dị iche iche nke Chineke tụkwasịrị ha. Ha na-amụta ịhụ ihe ndị a dị ka ihe àmà nke ịhụnanya Chineke na ihe nchebe pụọ n’ihe ọjọọ dị iche iche nke ụzọ ahụ sara mbara. (Ndị Hibru 12:5, 6) N’ezie, mmadụ aghaghị inwe ndidi, na-echeta na ọ na-ewe oge iji zụlite àgwà na ọchịchọ dị iche iche nke Chineke, dịkwa ka ọ na-ewe oge ka osisi na-amị mkpụrụ wee mịpụta mkpụrụ dị mma. Ma osisi ahụ ga-amị mkpụrụ ma ọ bụrụ na a na-elekọta ma na-akwọsa ya mmiri.
Ya mere mụọ Okwu Chineke, soro ndị Kraịst ndị ọzọ na-akpakọrịta, ‘na-ekpekwa ekpere n’ewepụghị aka’ maka mmụọ nsọ. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:17) Tụkwasị Chineke obi inyere gị aka ‘ime ka okporo ụzọ gị nile zie ezie.’ (Ilu 3:5, 6) Ma à pụrụ ime ihe ndị a nile? Ọ̀ na-arụ ọrụ n’ezie? Ee, ọ rụụrụ Tom nakwa Mary ọrụ, bụ́ ndị e hotara n’isiokwu bu ụzọ.
Ha Kwụsịrị Ije Ije n’Ụzọ ahụ Sara Mbara
Tom na-ede, sị: “N’etiti afọ ndị 1970, anyị zutere Ndịàmà Jehova mgbe otu onye n’ime ha bịara n’ụlọ anyị. Mkparịta ụka ahụ dujere n’ọmụmụ Bible. Nke nta nke nta, amalitere m idozi ndụ m. E mere m baptism na 1982, ana m ejekwa ozi ugbu a n’ọgbakọ dị n’ógbè anyị. Ugbu a, e mekwaala nwa anyị nwoke baptism. Ana m ekele nwunye m n’ihi ịtachiri m obi n’afọ ndị ahụ nile tupu mụ amụta eziokwu. Karịsịakwa, ana m ekele Jehova na Ọkpara ya, bụ́ Kraịst Jisọs, n’ihi ihe nile ha nyeworo anyị nakwa maka olileanya anyị nwere ugbu a maka ọdịnihu.”
Oleekwa banyere Mary? Leenụ, o chere na Chineke apụghị ịgbaghara ya ma ọlị, ma ọ chọrọ ịmụ banyere ya n’ihi ụmụaka ya. Mgbe ọ nụrụ na Ndịàmà Jehova na-akụziri onye agbata obi ya Bible, ọ rịọkwara maka enyemaka. Otú ọ dị, àgwà ọjọọ ya ndị gbanyeworo mkpọrọgwụ mere ka ọganihu sie ike. Ọmụmụ ihe ahụ gatụ ihu ọ latụ azụ. Otú ọ dị, ntakịrị nwa ya nwanyị dị afọ asaa nọgidere na-agba ya ume. “Mama, ike agwụla gị. Ị ga-emeli ya!” ka ọ ga-ekwu. Mgbe ahụ Mary ga-agbalịsi ike karị.
Mgbe onye ya na ya bi dị ka di na nwunye, bụkwa onye na-eji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, lọtara, o sonyekwara n’ọmụmụ ihe ahụ. Ka e mesịrị ha abụọ kwụsịrị àgwà ọjọọ ha. Mgbe ahụ, ka ha mesịrị ka alụmdi na nwunye ha kwekọọ n’iwu ma bụrụ ndị e mere baptism, ha nwere oké obi ụtọ ma na nke mbụ ya nwee mmetụta nke ezinụlọ n’ezie. N’ụzọ dị mwute, ọrịa AIDS mesịrị gbuo Mary, ma ọ nwụrụ na-etinye obi ya ná nkwa Bible maka mbilite n’ọnwụ na ndụ n’elu ala paradaịs, bụ́ nke e mere ka ọ dị ọcha pụọ n’akụkụ nile nke ụzọ ọjọọ ahụ sara mbara.
Ee, ọ ga-ekwe omume isi n’ụzọ ahụ sara mbara nke dịkwa obosara bụ́ nke na-eduje n’ịla n’iyi pụọ. Kraịst Jisọs kwuru, sị: “Nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara Gị, Nke nanị Gị bụ ezi Chineke, marakwa Onye I zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Mgbe ahụ, gịnị mere na ị gaghị ekpebi ije ije n’ụzọ ahụ dị warara nke na-eduje ná ndụ? Site n’iburu ihe ndị ị na-amụta site n’Okwu Chineke n’obi na itinye ha n’ọrụ, ị pụrụ inweta n’onwe gị nkwa ahụ na-ekpo obi ọkụ nke Bible: “Unu ga-amarakwa eziokwu, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu pụọ n’ohu.”—Jọn 8:32.