Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jy isi 49 p. 122-p. 123 para. 3
  • Jizọs Ekwusaa Ozi Ọma na Galili, Nyekwa Ndịozi Ya Ọzụzụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jizọs Ekwusaa Ozi Ọma na Galili, Nyekwa Ndịozi Ya Ọzụzụ
  • Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Njem Nkwusa Ọzọ E Jere na Galili
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Bụrụnụ Ndị Ọrụ Owuwe Ihe Ubi Na-enwe Ọṅụ!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • A Zụrụ Ha Otú Ha Ga-enwe Ike Ịna-ekwusa Ozi Ọma Ọ Bụrụgodị na A Kpagbuwe Ha
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Jizọs Ezipụ Ndị Na-eso Ụzọ Ya Iri Asaa Ka Ha Gaa Kwusaa Ozi Ọma
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
jy isi 49 p. 122-p. 123 para. 3
Mgbe Jizọs na-ezipụ ndị na-eso ụzọ ya abụọ abụọ ka ha gaa kwusaa ozi ọma

ISI NKE 49

Jizọs Ekwusaa Ozi Ọma na Galili, Nyekwa Ndịozi Ya Ọzụzụ

MATIU 9:35–10:15 MAK 6:6-11 LUK 9:1-5

  • JIZỌS AGAGHACHI NA GALILI KWUSAA OZI ỌMA

  • O ZIPỤRỤ NDỊOZI YA KA HA GAA ZIE OZI ỌMA

Kemgbe ihe dị ka afọ abụọ ugbu a, Jizọs ji ike ya niile na-ekwusa ozi ọma. Ma ugbu a, ọ̀ ga-akwụsịtụ ma jiritụ ya nwayọọ? Kama ijiri ya nwayọọ, Jizọs gbakwuru mbọ kwusaa ozi ọma. Ọ malitere “ijegharị n’obodo ukwu nakwa n’obodo nta niile [dị na Galili], na-ezi ihe n’ụlọ nzukọ ha, na-ekwusakwa ozi ọma alaeze ahụ ma na-agwọ ụdị ọrịa ọ bụla na ụdị nsogbu ahụ́ ike ọ bụla.” (Matiu 9:35) Ihe ọ hụrụ mere ka o dokwuo ya anya na o kwesịrị ịgbakwu mbọ iji kwusakwuo ozi ọma. Mana, olee otú ọ ga-esi eme ya?

Ka Jizọs na-aga ebe dị iche iche, ọ hụrụ na e nwere ndị e kwesịrị ka e were eziokwu nke okwu Chineke nyere aka ma kasie obi. A gbara ha akpụkpọ, chụsasịakwa ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha. O meteere ha ebere. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ee, ihe ubi hiri nne, ma ndị ọrụ dị ole na ole. Ya mere, na-arịọnụ Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ ka o ziga ndị ọrụ n’owuwe ihe ubi ya.”—Matiu 9:37, 38.

Ebe ndị na-eso ụzọ Jizọs na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ụlọ n’ụlọ

Jizọs ma ihe ga-enye aka n’ihe a. Ọ kpọrọ ndịozi iri na abụọ ya, kee ha abụọ abụọ, ha aghọọ ìgwè ndị na-ekwusa ozi ọma. Ya enyezie ha ntụziaka a doro anya. Ọ sịrị ha: “Unu abanyela n’okporo ụzọ ndị mba ọzọ, unu abanyekwala n’obodo ndị Sameria; kama nke ahụ, na-agakwurunụ atụrụ furu efu nke ụlọ Izrel. Mgbe unu na-aga, na-ekwusanụ, sị, ‘Alaeze eluigwe eruwo nso.’”—Matiu 10:5-7.

Alaeze ha ga-ekwusa banyere ya bụ nke ahụ Jizọs kwuru okwu ya n’ekpere ahụ o ji kụzie otú e si ekpe ekpere. ‘Alaeze ahụ adịla nso’ n’ihi na Jizọs Kraịst, Eze Chineke họpụtara ịchị n’Alaeze ya nọ ya mgbe ahụ. Oleekwanụ ihe ga-egosi na ndị na-eso ụzọ Jizọs bụ ndị na-anọchite anya Alaeze ahụ n’eziokwu? Jizọs nyere ha ikike ịgwọ ndị mmadụ na ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ. Ha ga-eme ihe a niile na-anaghị ego ọ bụla. Oleezikwanụ otú ndịozi Jizọs ga-esi egboro onwe ha mkpa ha? Dị ka ihe atụ, olee otú ha ga-esi enweta nri ụbọchị?

Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha ghara iwere ihe ndị ha ga-eji egbo mkpa ha ma ha gawa ikwusa ozi ọma. Ha agaghị etinye ọlaedo, ọlaọcha, ma ọ bụ ọla kọpa n’obere akpa ha. Ha agaghịdị ewere obere akpa nri ma ọ bụ werekwuo uwe ime ma ọ bụ akpụkpọ ụkwụ ọzọ ma ha gawa. Gịnị mere na ha agaghị ewere ihe ndị a? Jizọs gwara ha okwu mesiri ha obi ike. Ọ sịrị ha: “Onye ọrụ kwesịrị ka e nye ya nri.” (Matiu 10:10) Ndị ga-anabata ha na ozi ha na-ekwusa ga-enye aka gboo mkpa ha. Jizọs sịrị ha: “N’ebe ọ bụla unu banyere n’ụlọ, nọrọnụ n’ebe ahụ ruo mgbe unu si n’ebe ahụ pụọ.”—Mak 6:10.

Jizọs gwakwara ha ihe ha ga-eme ma ha gaa n’ụlọ ndị mmadụ izi ha ozi ọma Alaeze ahụ. Ọ sịrị: “Mgbe unu na-abanye n’ụlọ, keleenụ ndị ezinụlọ ahụ; ọ bụrụkwa na ụlọ ahụ kwesịrị ekwesị, ka udo unu na-asị ka o nwee dịkwasị ya; ma ọ bụrụ na o kwesịghị ekwesị, ka udo nke si n’ebe unu nọ lọghachiri unu. N’ebe ọ bụla ọ na-adịghị onye nabatara unu ma ọ bụ onye gere ntị n’okwu unu, mgbe unu na-apụ n’ụlọ ahụ ma ọ bụ n’obodo ahụ, tichapụnụ ájá dị n’ụkwụ unu.”—Matiu 10:12-14.

O nwere ike ịdaba na n’obodo ụfọdụ ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-aga, ndị obodo ahụ niile ga-ajụ ozi ọma ha na-ezi. Gịnị ga-eme obodo dị otú ahụ? Jizọs sịrị na a ga-ama ha ikpe mbibi. Ọ sịrị: “N’ezie, ana m asị unu, Ọ ga-adịrị ala Sọdọm na Gọmọra mfe n’Ụbọchị Ikpe karịa obodo ahụ.”—Matiu 10:15.

  • Olee mgbe Jizọs gaghachiri na Galili ikwusa ozi ọma, gịnịkwa ka ọ chọpụtara banyere ndị obodo ahụ?

  • Olee otú Jizọs si zipụ ndịozi iri na abụọ ahụ, oleekwa ntụziaka o nyere ha?

  • Gịnị mere e ji sị na ‘Alaeze ahụ adịla nso’?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya