-
A Zụrụ Ha Otú Ha Ga-enwe Ike Ịna-ekwusa Ozi Ọma Ọ Bụrụgodị na A Kpagbuwe HaJizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
-
-
Mgbe Jizọs kechara ndịozi ya abụọ abụọ ka ha gaa kwusaa ozi ọma, o nyere ha ezigbo ntụziaka gbasara otú ha ga-esi ekwusa ya. Ma nke ahụ abụghị naanị ihe o mere. Ọ dọrọ ha aka ná ntị banyere ndị mmegide. Ọ sịrị ha: “Lee! M na-eziga unu dị ka atụrụ n’etiti anụ ọhịa wolf . . . Lezienụ anya maka ụmụ mmadụ; n’ihi na ha ga-enyefe unu n’ụlọikpe obodo, ha ga-apịakwa unu ihe n’ụlọ nzukọ ha. N’ezie, a ga-akpụpụta unu n’ihu ndị gọvanọ na ndị eze n’ihi m.”—Matiu 10:16-18.
-
-
A Zụrụ Ha Otú Ha Ga-enwe Ike Ịna-ekwusa Ozi Ọma Ọ Bụrụgodị na A Kpagbuwe HaJizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
-
-
Ịdọ aka ná ntị, agbamume, na ntụziaka ndị a Jizọs nyere ndịozi iri na abụọ ya magburu onwe ha. Ma, anyị kwesịrị ịghọta na ihe ndị a Jizọs kwuru gbasakwara ndị niile ga-ekwusa ozi ọma mgbe ọnwụ na mbilite n’ọnwụ ya gachara. Ihe gosiri na nke a bụ eziokwu bụ ihe ahụ Jizọs kwuru na ‘mmadụ niile ga-akpọ’ ndị na-eso ụzọ ya asị, ya bụ, na ọ bụghị naanị ndị ahụ e zigara ndịozi Jizọs ka ha gaa zie ozi ọma ga-akpọ ha asị. Ihe ọzọkwa bụ na ọ dịghị mgbe anyị gụtara na n’obere oge ahụ ndị na-eso ụzọ Jizọs kwusara ozi ọma na Galili, na a kpụpụrụ ha n’ihu ndị gọvanọ na n’ihu ndị eze. Ọ dịghịkwa mgbe anyị gụtara na ndị ezinụlọ ha nyefere ha n’aka ndị ga-egbu ha.
O doro anya na ọ bụ ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu ka Jizọs bu n’obi gwa ndịozi ya okwu ndị a. Otu ihe mere anyị ji mara bụ ihe ahụ ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya na ha agaghị agazu obodo niile ha kwesịrị ikwusa ozi ọma “ruo mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịarute.” Ihe Jizọs na-ekwu bụ na ndị na-eso ụzọ ya agaghị ekwusacha ozi ọma banyere Alaeze Chineke tupu Eze ahụ dị ebube bụ́ Jizọs Kraịst abịarute dị ka onyeikpe Chineke.
-