Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ị̀ Ga-asụ Ngọngọ n’Ihi Jizọs?
    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2021 | Mee
    • (3) JIZỌS EMEGHỊ ỌTỤTỤ OMENALA NDỊ JUU

      Ọtụtụ ndị sụrụ ngọngọ n’ihi na Jizọs jụrụ iso na-eme omenala ha. Olee otú ụdị ihe a nwere ike isi mee ka ụfọdụ ndị sụọ ngọngọ taa? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13)d

      13. Olee ihe mere ọtụtụ ndị ji katọọ Jizọs?

      13 N’oge Jizọs, ọ gbagwojuru ndị na-eso ụzọ Jọn Onye Na-eme Baptizim anya na ndị na-eso ụzọ Jizọs anaghị ebu ọnụ. Jizọs kọwaara ha na ọ dịghị mkpa ka ha na-ebu ọnụ ebe ọ bụ na ya ka dị ndụ. (Mat. 9:14-17) Ma n’agbanyeghị nke ahụ, ndị Farisii na ọtụtụ ndị na-emegide Jizọs katọrọ ya n’ihi na ọ naghị eso ọtụtụ omenala ha. Iwe were ha mgbe ọ gwọrọ ndị ọrịa n’Ụbọchị Izu Ike. (Mak 3:1-6; Jọn 9:16) Ha kwuru na ha na-edebe Ụbọchị Izu Ike, ma o nweghị nsogbu ha hụrụ n’ịzụ ahịa n’ụlọ nsọ. O were ha ezigbo iwe mgbe Jizọs katọrọ ihe ahụ ha na-eme. (Mat. 21:12, 13, 15) Iwe were ndị Jizọs ziri ozi ọma n’ụlọ nzukọ dị na Nazaret mgbe Jizọs kọọrọ ha ihe ụfọdụ mere n’Izrel iji gosi na ha bụ ndị na-achọkarị ọdịmma onwe ha na ndị na-enweghị okwukwe. (Luk 4:16, 25-30) Ihe ndị a Jizọs mere ndị mmadụ na-atụghị anya ha mere ka ha sụọ ngọngọ.—Mat. 11:16-19.

      14. Gịnị mere Jizọs ji katọọ omenala ndị mmadụ na-esighị n’Akwụkwọ Nsọ?

      14 Gịnị ka Akwụkwọ Nsọ kwuru? Jehova si n’ọnụ Aịzaya onye amụma kwuo, sị: “Ọ bụ n’ọnụ ka ndị a bịakwuteworo m, ọ bụkwa naanị egbugbere ọnụ ha ka ha ji nye m otuto, ha emewo ka obi ha dị anya n’ebe m nọ, egwu ha na-atụ m bụkwa ihe mmadụ nyere n’iwu nke a na-akụziri ha.” (Aịza. 29:13) Nkatọ Jizọs katọrọ omenala ndị mmadụ na-esighị n’Akwụkwọ Nsọ ziri ezi. Ndị ji iwu na omenala ndị mmadụ wepụtara kpọrọ ihe karịa ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru ajụla Jehova na Mesaya o zitere.

  • Ị̀ Ga-asụ Ngọngọ n’Ihi Jizọs?
    Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2021 | Mee
    • (4) JIZỌS AGBANWEGHỊ ỌCHỊCHỊ E NWERE MGBE AHỤ

      Ọtụtụ ndị sụrụ ngọngọ n’ihi na Jizọs enweghị mmasị na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Olee otú ụdị ihe a nwere ike isi mee ka ụfọdụ ndị sụọ ngọngọ taa? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)e

      17. Gịnị ka ọtụtụ ndị tụrụ anya ya n’oge Jizọs nke mere ka ha sụọ ngọngọ?

      17 Ọtụtụ ndị n’oge Jizọs chọrọ ka a gbanwee ọchịchị ha ozugbo. Ha tụrụ anya na Mesaya ga-anapụta ha n’aka ndị Rom na-achị ha ọchịchị nchịgbu. Ma, mgbe ha gbalịrị ime Jizọs eze, ọ jụrụ. (Jọn 6:14, 15) Ndị ọzọ, ma ndị isi nchụàjà, nọ na-atụ ụjọ na Jizọs ga-eweta ọchịchị ga-emegide ọchịchị ndị Rom nke ga-eme ka ha ghara inwe ọnụ ma ọ bụ napụ ha ikike ndị ha nwere. Ihe ndị a mere ka ọtụtụ ndị Juu sụọ ngọngọ.

      18. Olee amụma ndị e buru gbasara Mesaya ahụ ọtụtụ ndị leghaara anya?

      18 Gịnị ka Akwụkwọ Nsọ kwuru? N’agbanyeghị na ọtụtụ amụma ndị e buru na Baịbụl gbasara Mesaya ahụ kwuru na ọ ga-abụ Dike ga-enwe mmeri, amụma ndị ọzọ kwukwara na ọ ga-ebu ụzọ nwụọ maka mmehie ụmụ mmadụ. (Aịza. 53:9, 12) Ma, gịnị mere ndị Juu ji na-eche ihe na-ekwesịghị ekwesị gbasara Mesaya ahụ? Ọ bụ n’ihi na ọtụtụ ndị leghaara amụma ndị ahụ na-ekwughị na a ga-egboro ha mkpa ha ozugbo anya.—Jọn 6:26, 27.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya