Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 6/15 p. 32
  • ‘Bụrụ Ohu nke Onyenwe Anyị Kraịst’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Bụrụ Ohu nke Onyenwe Anyị Kraịst’
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 6/15 p. 32

‘Bụrụ Ohu nke Onyenwe Anyị Kraịst’

N’IME akụkọ ihe mere eme nile, ọtụtụ nde mmadụ ediwo ibu arọ nke ịnọ n’ohu. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ puku afọ gara aga, ndị Israel tara ahụhụ dị ukwuu n’aka ndị nna ukwu bụ́ ndị Ijipt. Dị ka Bible na-ekwu, ha “doro ndị na-achị ndị ohu n’isi ndị Israel iji bogbuo ha n’okpuru ibu dị arọ,” karịsịa n’ịkpụ brick.—Ọpụpụ 1:11, The Jerusalem Bible.

N’ọtụtụ mba taa, ndị mmadụ nwere ike ghara ịbụ ohu n’echiche nkịtị, ma ọtụtụ aghaghị ịrụ ọrụ ruo ogologo hour n’okpuru ọnọdụ ndị chọrọ ndọlị—nke dị oké njọ mgbe ụfọdụ. Ha nọ n’okpuru ibu arọ nke ihe a pụrụ ịkpọ ịnọ n’ohu akụ̀ na ụba.

Otú ọ dị, e nwere otu ụdị ịnọ n’ohu nke na-adịghị arọ. Pọl onyeozi gbara ndị kwere ekwe ibe ya ume, sị: “Unu [bụrụ] ohu nke Onyenwe anyị Kraịst.” (Ndị Kọlọsi 3:24) Ndị họọrọ ịbụ ohu nke Kraịst na-achọta izu ike pụọ n’ibu arọ ha. Jisọs n’onwe ya sịrị: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ, Mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike. Nyaranụ yoke nke m n’olu unu, mụtakwanụ ihe n’ọnụ m; n’ihi na abụ m Onye nwayọọ na Onye wedatara Onwe ya ala n’obi: unu ga-ahụkwa izu ike nye mkpụrụ obi unu. N’ihi na yoke nke m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.”—Matiu 11:28-30.

Ịnara yoke Kraịst adịghị eme ka mmadụ nwere onwe ya pụọ n’ibu ọrụ nke inye ezinụlọ ya ihe n’ụzọ anụ ahụ. (1 Timoti 5:8) Otú ọ dị, ọ na-enye nnwere onwe pụọ n’ọtụtụ agbụ nke nchụso ihe onwunwe. Kama ime ka ntụsara ahụ nke ihe onwunwe bụrụ isi nzube ha ná ndụ, ndị Kraịst na-achọta afọ ojuju n’inwe ihe ndị bụ isi dị mkpa.—1 Timoti 6:6-10; tụlee 1 Ndị Kọrint 7:31.

Ndị Kraịst na-achọtakwa izu ike n’imezu ibu ọrụ ha nke ikwusa “ozi ọma” nke Alaeze Chineke. (Matiu 24:14) Nke a na-eweta ezi ọṅụ na afọ ojuju!

Anyị kwesịrị inwe ekele na anyị pụrụ ‘ịbụ ohu nke Onyenwe anyị Kraịst’!

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 32]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya