“Ka Anyị Tụpụkwa Ibu Nile Ọ Bụla”
“E nwere m oké mwute na nkụda aka,” ka Mary kwara arịrị kwuo. N’izo aka n’ibu nke ibu ọrụ onye Kraịst, nwanyị nke a bụ onye Kraịst kwukwara, sị: “M na-ahụ ndị enyi m ka ha na-enwe oké ike ọgwụgwụ. Mụ onwe m na-enwekwa otu ike ọgwụgwụ na ịda mbà ahụ. Biko nyere m aka ịghọta ihe kpatara ya.”
Ị̀NA-ECHEKWA na ị nọ n’okpuru ihe nrụgide, na-enwe oké ike ọgwụgwụ ilekọta ibu ọrụ gị nke ọchịchị Chineke nke ọma? Ọ̀ na-eyi gị mgbe ụfọdụ ka ozi ndị Kraịst ọ̀ bụ oké ibu arọ, ibu nke a na-apụghị ibuli? Ọtụtụ ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi na-enwe oge dị iche iche nke nkụda aka, n’ihi na anyị nwere nrụgide ndị na-ezighị ezi gbara anyị gburugburu mgbe mgbe nke pụrụ iruda ọṅụ anyị n’ala. Ịbụ ezi onye Kraịst taa bụ n’ezie ihe ịma aka. Otú a, mgbe ụfọdụ, ụfọdụ ndị na-ele ozi ndị Kraịst anya dị ka nke bụ ihe ibu arọ.
Ịchọpụta Ihe Na-akpata Ya
Akwụkwọ nsọ mere ka o doo anya na Jehova achọghị n’aka anyị ihe ndị ezi uche na-adịghị na ha. Jọn onyeozi kwuru na ‘ihe Chineke nyere n’iwu adịghị arọ.’ (1 Jọn 5:3) N’otu aka ahụ, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Nyaranụ yoke nke m n’olu unu, mụtakwanụ ihe n’ọnụ m; n’ihi na abụ m onye nwayọọ na onye wedatara onwe ya ala n’obi: unu ga-ahụkwa izu ike nye mkpụrụ obi unu. N’ihi na yoke nke m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.” (Matiu 11:29, 30) N’ụzọ doro anya, ọ bụghị nzube Jehova na anyị ga-enwe mmetụta nke ịbụ ndị bu oké ibu arọ ma ọ bụ nke ịbụ ndị ibu na-anyịgbu n’ozi anyị na-ejere ya.
Mgbe ahụ, olee otú onye Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi pụrụ isi malite ile ibu ọrụ ya nke onye Kraịst anya dị ka oké ibu arọ? O yiri ka ọ̀ gụnyere ọtụtụ ihe. Rịba okwu ndị a nke onyeozi bụ Pọl ama: “Ka anyị tụpụkwa ibu nile ọ bụla, . . . ka anyị werekwa ntachi obi gbaa ọsọ ahụ e debere anyị n’ihu.” (Ndị Hibru 12:1) Okwu ndị ahụ nke Pọl gosiri na mgbe ụfọdụ, onye Kraịst pụrụ ibokwasị onwe ya ibu ndị ọ na-adịghị mkpa na ọ ga-ebu. Nke a adịghị emetụtakarị mmehie ndị dị oké njọ. Ma onye Kraịst pụrụ ime mmejọ ná mkpebi ya nke ga-etinye oké ọgba aghara ná ndụ ya, na-eme ka o siere ya oké ike ịgba ọsọ ahụ e debere anyị n’ihu.
Ile Ihe Onwunwe Anya n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị
Were dị ka ihe atụ, okwu banyere ọrụ ego. N’ọtụtụ ala, ọnọdụ akụ na ụba pụrụ ime ka onye Kraịst ghara inwe ihe ọ bụla ọzọ ọ pụrụ ime ma ọ bụghị ịrụ ọrụ ọtụtụ hour. Ma mgbe mgbe, ọtụtụ mmadụ na-arụ ọrụ nanị iji wee na-enwe ọganihu ma ọ bụ iji kpakọba oké ihe onwunwe. Site n’ịtụleghachi ihe ndị dị ha mkpa n’ezie, ụfọdụ ndị Kraịst ahụwo na ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịhazigharị ọnọdụ ọrụ ha. Otú a ka ọ dị n’ihe banyere Debbie na di ya, ndị bụcha Ndịàmà Jehova. Ọ na-ekwu, sị: “Ọnọdụ anyị agbanwewo n’ihe metụtara ego, e nwekwaghị ezi mkpa ka m gaa n’ihu na-arụ ọrụ ego nke oge nile. Ma o siri ike ịhapụ ya.” Ngwa ngwa, ọ malitere inwe nrụgide nke inwe ọtụtụ ihe ime. Ọ na-akọwa, sị: “Ụbọchị Saturday bụ nanị ụbọchị m nwere ịrụ ọrụ n’ụlọ. Anaghị m enwekebe mkpali ịpụta maka ozi ubi. Nke a wutere m, akọ na uche m nyekwara m nsogbu, ma ahụrụ m ọrụ m n’anya! N’ikpeazụ, echere m ihe bụ eziokwu ihu. Ọ dị nanị otu ihe ngwọta dịnụ. Ahapụrụ m ọrụ ahụ.” Ọ bụ ezie na oké nhazigharị ihe dị otú ahụ pụrụ ịbụ ihe na-agaghị adịrị ụfọdụ ndị mfe ime. Otú ọ dị, nnyocha e leziri anya mee nke ndokwa ọrụ gị pụrụ igosipụta mkpa maka ime mgbanwe ụfọdụ.
A pụrụ inwe ụzọ ndị ọzọ nke iwepụta onwe gị n’ibu ndị ọ na-adịghị mkpa na ị ga-ebu. Gịnị banyere ibelata njem obi ụtọ ndị anyị na-emekarị, ihe omume egwuregwu dị iche iche, ma ọ bụ ntụrụ ndụ ndị ọzọ—na-agụnye oge a na-etinye n’ikiri telivishọn? Ọbụna mgbe e nwetasịrị nhazi dị mma n’akụkụ ndị a, a pụrụ ịchọ ịnọgide na-eme nhazigharị iji kwadoo ọnọdụ ahụ ziri ezi.
Echiche Ziri Ezi Dị Mkpa
Echiche ziri ezi n’ụdị okwu ndị dị otú ahụ ga-enyere anyị aka ịgbanwe iji kwekọọ n’ọnọdụ dị iche iche ka ha na-ebilite. Otú a, anyị pụrụ ịnọgide na-ele ozi anyị anya n’ụzọ ziri ezi.—Ndị Efesọs 5:15-17; Ndị Filipaị 4:5.
Ị̀ na-achọta onwe gị n’okpuru nrụgide ime ihe n’otu ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ ndị ọzọ si na-eme ya n’ozi Chineke? Nke pụkwara ịtụkwasị nchegbu na mgbakasị ahụ ná ndụ gị. Ebe ezi ihe nlereanya nke ndị ọzọ pụrụ n’ezie ịgba gị ume ime karịa, echiche ziri ezi ga-enyere gị aka iguzobe ihe mgbaru ọsọ a pụrụ iru eru n’ikwekọ n’ọnọdụ ndị nke gị na ikike gị. Akwụkwọ nsọ na-agwa anyị, sị: “Ma ka onye ọ bụla nwapụta ọrụ nke aka ya, mgbe ahụ ka ọ ga-enwekwa ihe ọ ga-anyara isi n’ebe nanị ya onwe ya nọ, ọ bụghịkwa n’ebe ibe ya nọ. N’ihi na mmadụ nile n’otu n’otu ga-ebu ibu nke aka ha.”—Ndị Galetia 6:4, 5.
Omenala na ọdịnala nke ebe dị iche iche pụkwara ịtụkwasị ihe n’ibu anyị. N’oge Jisọs, ike gwụrụ ndị mmadụ site n’ịnwa idebe ọtụtụ iwu na omenala dị iche iche nke okpukpe bụ́ ndị ndị mmadụ setịpụrụ. Taa, e mewo ka Ndịàmà Jehova nwere onwe ha pụọ n’omenala dị iche iche nke okpukpe ụgha. (Tụlee Jọn 8:32.) Otú ọ dị, onye Kraịst pụrụ ịghọ onye na-emikpukarị onwe ya n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị n’omenala dị iche iche nke obodo. Dị ka ihe atụ, mgbe ụfọdụ, a pụrụ inwe ọtụtụ omenala ndị dị nnọọ ukwuu ndị metụtara ihe omume ndị dị ka agbamakwụkwọ. Ọ pụrụ ịbụ na omenala ndị a adịghị njọ, ọ pụkwara ịbụ na ha bụ ihe ndị na-adọrọ adọrọ na ndị na-akpali mmasị. Otú ọ dị, ọ pụrụ ịbụ na ndị Kraịst agaghị enwe oge ma ọ bụ ego iji mee ihe ndị a nile, ịgbalị ime otú ahụ pụkwara ịtụkwasịrị ha ibu ndị ọzọ ọ na-adịghị mkpa na ha ga-ebu.
Tụlee ihe mere mgbe Jisọs jere ileta otu nwanyị aha ya bụ Mata. Kama irite uru zuru ezu site n’amamihe Jisọs nke sitere n’ebe Chineke nọ, “uche Mata na-agbasasị n’ije ozi nke ukwuu.” O bu oké ibu site n’ọtụtụ ụmụ irighiri ihe omume. (Luk 10:40) Ma Jisọs jiri obi ọma tụọ aro na ọ pụrụ ime ka usoro ịkwadebe nri ya dịwanye mfe ka o wee rite uru zuru ezu n’ozizi ihe ya. (Luk 10:41, 42) Nke a na-egosi nke ọma na ime ezi mkpebi na iche echiche ziri ezi ga-enyere gị aka n’inweta ọnọdụ kwesịrị ekwesị n’ozi ndị Kraịst ị na-eje.—Jemes 3:17.
Ọ chọkwara mkpebi ziri ezi mgbe ị na-ahọrọ ndị enyi. Ilu 27:3 na-adọ aka ná ntị, sị: “Nkume dị arọ, ájá bụkwa ibu; ma mkpasu iwe nke onye uche ya gbagọrọ agbagọ dị arọ karịa ha abụọ.” Ọtụtụ mgbe, ndị gị na ha na-akpachi anya na-enwe mmetụta siri ike n’ụzọ i si eche echiche. Iso ndị ahụ na-eme ngwa ịchọpụta mmejọ na ịkatọ ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ na-akpakọ pụrụ ịkụ mkpụrụ nke nkụda aka na echiche na-ezighị ezi n’ime gị. (1 Ndị Kọrint 15:33) Ọ bụrụ na ị chọpụta na nke a bụ nsogbu, iji amamihe mee mgbanwe ụfọdụ ná ndị gị na ha na-akpakọ pụrụ ime ka ibu gị dịwanye mfe.
Jiri Obi Umeala Soro Chineke Na-eje Ije
Na Maịka 6:8, anyị na-achọta ajụjụ nke a na-akpali iche echiche: “Ọ̀ bụkwa gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị, ma ọ bụghị nanị ime ihe e kpere n’ikpe, na ịhụ ebere n’anya, na iji obi umeala soro Chineke gị na-eje ije?” A kọwara obi umeala dị ka mmadụ ịmara otú ọ hà. Ndị ahụ na-amataghị otú ha hà pụrụ iji ọtụtụ ihe omume bogbuo onwe ha. Nke a emewo n’ebe ndị Kraịst tozuru okè nọ, ọbụna ndị nlekọta, na-arụpụta nkụda aka, ahụ mgbakasị, na enweghị ọṅụ. Kenneth, otu onye Kraịst bụ okenye, kwupụtara, sị: “Ahụrụ m onwe m ka m na-amalite inwe obi ịda mbà, m wee sị, ‘Agaghị m ekwe ka nke a mee m.’ Ya mere, ebelatara m ihe omume m ụfọdụ ma lekwasị anya n’ihe ndị m pụrụ ime.”
Ọbụna onye amụma ahụ bụ Mosis onye dị umeala n’obi nwere ihe isi ike n’ịmata ebe ike ya ruru. Ya mere Jetro, bụ́ ọgọ ya nwoke, nyeere Mosis aka iche echiche nke ọma banyere oké ibu ọrụ ọ na-achọ ịbagide nanị ya. “Gịnị bụ ihe a nke gị onwe gị na-eme ndị nke a?” ka Jetro jụrụ. “Ọ dịghị mma, bụ́ ihe gị onwe gị na-eme. Ị ghaghị ịkpọnwụ . . . n’ihi na ọ dị arọ karị gị, bụ́ ihe a; ị pụghị ime ya nanị gị. . . . Gị onwe gị ga-esikwa ná ndị nke a nile lepụta ndị dimkpa, . . . ọ ga-eru, na oké okwu nile ọ bụla ka ha ga-ewetara gị, ma ha onwe ha ga-ekpe okwu nta nile ọ bụla: gị mee ka ọ dịkarị mfe n’ahụ gị, ha ga-esokwa gị buru ibu a.” Ozugbo ahụ Mosis malitere inyefe ndị ọzọ ọrụ ya ụfọdụ, si otú a nweta nnapụta site n’ibu nke ghọworo ibu a na-apụghị ibu ebu.—Ọpụpụ 18:13-26.
N’otu oge ọzọ, Mosis gwara Jehova, sị: “Apụghị m, nanị mụ onwe m, ikuru ndị nke a nile, n’ihi na ọ karịrị m arọ.” Ọzọ, azịza o nwetara bụ inyefe ndị ọzọ ọrụ ụfọdụ. Nke a pụkwara ịbụ ihe ngwọta nye ọnọdụ siri ike ị nọ na ya, ma ọ bụrụ na i chere na ọtụtụ ihe omume na-anyịgbu gị.—Ọnụ Ọgụgụ 11:14-17.
Jehova Na-enyere Anyị Aka Ibu Ibu Ahụ
Jisọs sịrị na yoke nke ya adịghị egbu mgbu, na ibu ya dịkwa mfe, ma nke a apụtaghị na ọ dịtụghị arọ ma ọlị. Yoke nke Jisọs na-akpọ anyị òkù ịnyara abụghị yoke nke ịnọ nkịtị. Ọ bụ yoke nke nrara onwe onye nye Chineke kpam kpam dị ka onye na-eso ụzọ nke Jisọs Kraịst. Ya mere, ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ibu arọ ma ọ bụ nrụgide na-abịa site n’ịbụ ezi onye Kraịst. (Matiu 16:24-26; 19:16-29; Luk 13:24) Ka ọnọdụ ụwa na-adịwanye njọ, nrụgide dị iche iche ga na-arị elu. Otú ọ dị, anyị nwere ihe mere anyị ga-eji nwee ezi uche n’ụzọ anyị si ele ihe anya n’ihi na ọkpụkpọ òkù Jisọs pụtara na ndị ọzọ pụrụ isoro ya banye n’okpuru yoke ya, na ọ ga-enyekwara ha aka.a Otú a, ka anyị na-anọgide na-agbaso nduzi Kraịst, ibu anyị na-anọgide na-abụ nke anyị ga-ebuli n’ihi na ọ ga-enyere anyị aka.
Chineke na-elekọta ndị ahụ hụrụ ya n’anya, ọ na-echekwa obi na echiche uche nke ndị nile ji ekpere na-atụkwasị ya ibu ha nile nche. (Abụ Ọma 55:22; Ndị Filipaị 4:6, 7; 1 Pita 5:6, 7) “Onye a gọziri agọzi ka Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] bụ, kwa ụbọchị ka ọ na-eburu anyị ibu, bụ́ Chineke nke bụ nzọpụta anyị,” ka onye ọbụ abụ ahụ kwuru. (Abụ Ọma 68:19) Ee, jide n’aka na kwa ụbọchị, Chineke ga-ebukwara gị ibu ahụ ma ọ bụrụ na ị tụpụ ibu nile ma jiri ntachi obi gbaa ọsọ ahụ e debere gị n’ihu.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Otú e si dee ya ná nkọwa ala ala peji bụ: “Soro m bata n’okpuru yoke m.”
[Foto dị na peeji nke 24]
Ndị okenye maara ihe dị njikere inyefe ndị ọzọ ọrụ ụfọdụ ma kenye ndị ọzọ ibu ahụ