-
Imezu Amụma AịzayaJizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
-
-
Ọ bụ amụma a: “Lee! Ohu m nke m họọrọ, onye m hụrụ n’anya, onye ihe ya masịrị mkpụrụ obi m! M ga-eme ka mmụọ m dịkwasị ya, ọ ga-eme ka ihe bụ́ ikpe ziri ezi doo mba niile anya. Ọ gaghị ese okwu, ọ gaghịkwa etisi mkpu ike, ọ dịghịkwa onye ga-anụ olu ya n’okporo ámá. Ọ dịghị ahịhịa amị e chihịara echihịa ọ ga-egwepịa, ọ dịghịkwa owu oriọna na-achọ ịnyụ anyụ ọ ga-emenyụ, ruo mgbe ọ ga-eme ka ikpe ziri ezi nwee mmeri. N’ezie, n’aha ya ka mba niile ga-enwe olileanya.”—Matiu 12:18-21; Aịzaya 42:1-4.
-
-
Imezu Amụma AịzayaJizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
-
-
Jizọs jikwa ozi ya na-akasi obi gakwuru ndị dị ka ahịhịa amị e chihịara echihịa, ndị dara mbà n’obi. Ha dị ka owu oriọna nke ọkụ ya na-achọzi ịnyụ anyụ. Jizọs egwepịaghị ahịhịa amị e chihịara echihịa ma ọ bụ menyụọ owu oriọna na-achọ ịnyụ anyụ. Kama, o ji obiọma na ịhụnanya bulie ndị dị umeala n’obi elu. N’eziokwu, Jizọs bụ onye ahụ mba niile ga-enwe olileanya na ya.
-