-
Ndịàmà Bụ́ Ndị Kraịst Ala Ha Dị n’EluigweỤlọ Nche—1995 | Julaị 1
-
-
2. Olee ihe ọhụrụ Jọn Onye Na-eme Baptism mara ọkwa ya na Jisọs ga-eme, gịnịkwa ka ihe ọhụrụ a metụtara?
2 Mgbe Jọn Onye Na-eme Baptism na-akwadebere Jisọs ụzọ, ọ mara ọkwa na Jisọs ga-eme ihe ọhụrụ. Ihe ndekọ ahụ na-asị: “[Jọn] na-ekwusakwa, sị, Onye ka m ike na-abịa n’azụ m, Onye m na-erughị ihuru ala ịtọpụ eriri akpụkpọ ụkwụ Ya abụọ. Mụ onwe m jiri mmiri mee unu baptism; ma Onye ahụ ga-eji Mmụọ Nsọ mee unu baptism.” (Mak 1:7, 8) Tupu oge ahụ, ọ dịghị onye e jiworo mmụọ nsọ mee baptism. Nke a bụ ndokwa ọhụrụ gụnyere mmụọ nsọ, o metụtakwara nzube Jehova a na-aga ikpughe ekpughe ịkwadebe ụmụ mmadụ maka ịchịisi n’eluigwe.
-
-
Ndịàmà Bụ́ Ndị Kraịst Ala Ha Dị n’EluigweỤlọ Nche—1995 | Julaị 1
-
-
5. Olee mgbe e ji mmụọ nsọ mee ndị ahụ na-eso ụzọ bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi baptism, ọrụ ndị ọzọ dịgasị aṅaa nke mmụọ nsọ werekwaara ọnọdụ n’otu oge ahụ?
5 Mgbe Jisọs gwara Nikọdimọs okwu, mmụọ nsọ abịakwasịworị Jisọs, na-ete ya mmanụ maka ọbụbụeze ya n’ọdịnihu n’Alaeze Chineke, Chineke ekwupụtawokwa n’ihu ọha na Jisọs bụ Ọkpara Ya. (Matiu 3:16, 17) Jehova mụtakwuru ụmụ ime mmụọ na Pentikọst 33 O.A. E ji mmụọ nsọ mee ndị na-eso ụzọ bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi ndị zukọrọ n’ọnụ ụlọ dị n’elu na Jerusalem baptism. N’otu oge ahụ, a mụrụ ha ọzọ site na mmụọ nsọ dị ka ụmụ ndị ikom ime mmụọ Chineke. (Ọrụ 2:2-4, 38; Ndị Rom 8:15) Ọzọkwa, e ji mmụọ nsọ tee ha mmanụ maka ihe nketa eluigwe n’ọdịnihu, e jikwa mmụọ nsọ kaa ha akara n’ụzọ bu ụzọ dị ka ihe nnwapụta nke olileanya eluigwe ahụ ịbụ nke e ji n’aka.—2 Ndị Kọrint 1:21, 22.
-