-
Ọ̀ Bụ Ọkụ Ala Mmụọ Ka Jizọs Na-ekwu Okwu Ya?Ụlọ Nche—2008 | Jun 15
-
-
ỤFỌDỤ ndị kweere n’ozizi ọkụ ala mmụọ na-arụtụ aka n’ihe Jizọs kwuru bụ́ nke e dekọrọ na Mak 9:48 (ma ọ bụ n’amaokwu nke 44, 46) iji kwadoo ozizi a. O kwuru okwu banyere ikpuru na-adịghị anwụ anwụ na ọkụ a na-adịghị emenyụ emenyụ. Ọ bụrụ na mmadụ ajụọ gị ihe okwu ndị ahụ pụtara, gịnị ka ị ga-agwa ya?
Dabere na Baịbụl onye ahụ ji, o nwere ike ịgụ amaokwu nke 44, nke 46, ma ọ bụ nke 48, n’ihi na ọ bụ otu ihe ahụ ka e dere n’amaokwu atọ a ná nsụgharị ụfọdụ.a Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ na-agụ, sị: “Ọ bụrụkwa na anya gị emee ka ị sụọ ngọngọ, tụfuo ya, ọ kaara gị mma ibu otu anya banye n’alaeze Chineke kama inwe anya abụọ e wee tụba gị n’ime Gehena, bụ́ ebe ikpuru ha na-adịghị anwụ anwụ, a dịghị emenyụkwa ọkụ ya emenyụ.”—Mak 9:47, 48.
-
-
Ọ̀ Bụ Ọkụ Ala Mmụọ Ka Jizọs Na-ekwu Okwu Ya?Ụlọ Nche—2008 | Jun 15
-
-
a Amaokwu nke 44 na nke 46 adịghị n’ihe odide Baịbụl ndị e ji aka dee bụ́kwa ndị a nabatara dị ka ndị kacha zie ezie. Ndị ọkà mmụta na-ekwu na o yiri ka a gbakwụnyere amaokwu abụọ ndị ahụ ka oge na-aga. Prọfesọ Archibald T. Robertson dere, sị: “Amaokwu abụọ a adịghị n’ihe odide Baịbụl ndị kacha ochie na ndị kacha zie ezie e ji aka dee. E webatara ha n’oge e dere akwụkwọ mpịakọta nke ndị Western na Syrian (Byzantine). Ihe e mere ebe ndị ahụ bụ ikwughachi ihe e kwuru n’amaokwu nke 48. Ọ bụ ya mere na anyị etinyeghị amaokwu nke 44 na nke 46, n’ihi na ha adịghị ná nsụgharị ndị mbụ.”
-