Ihe Mgbapụta ahụ Ozizi Krisendọm nke Fuworo Efu
IHE mgbapụta ahụ, nkwenkwe nke bụ na Jisọs nwụrụ n’ọnọdụ ihe a kpọrọ mmadụ na-emehie emehie, bụ ihe bụ isi nye ezi iso ụzọ Kraịst. Ma, ozizi ahụ abụwo nke ndị ọkà mmụta okpukpe Krisendọm katọworo, kwaakwa ya emo ruo ogologo oge.
N’ihi gịnị ka o ji dị otú ahụ? Jisọs n’onwe ya ó kwughị na Mak 10:45, sị: “Nwa nke mmadụ onwe ya abịaghị ka e jeere ya ozi, kama ka o jee ozi, ka o werekwa ndụ ya nye ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ”?
Ụfọdụ ndị ekwuwo na ọ dịghị mgbe Jisọs kwuru okwu ndị ahụ, na ọ bụ mgbe ọ nwụsịrị ka Pọl onyeozi mere ka e dee okwu ndị ahụ. Ndị ọzọ na-arụ ụka na “ihe mgbapụta” e kwuru okwu ya n’ebe a bụ ihe atụ okwu ma ọ bụ na ozizi ahụ sitere n’akụkọ ifo ndị Grik! Ya mere, ọ fọrọ nnọọ nke nta ka ọ bụrụ na ihe mgbapụta ahụ apụwo kpam kpam site n’ozizi nile nke chọọchị.
Ma, ị pụkwara ịtụgharị uche banyere otú ndị Kraịst oge mbụ si ghọta ọnwụ Jịsọs. Pọl na-agwa anyị ná 2 Ndị Kọrint 5:14, 15, sị: “Ịhụnanya Kraịst na-arụgide anyị; ebe anyị na-atụle nke a, na otu onye nwụrụ n’ọnọdụ mmadụ nile . . . ka ndị dị ndụ wee ghara ịdịrị onwe ha ndụ ọzọ, kama ka ha dịịrị onye ahụ ndụ, bụ́ onye nwụrụ n’ọnọdụ ha, e meekwa ka o si n’ọnwụ bilie.” Lee nnọọ ka ozizi nke a si bụrụ ihe dị mfe—bụ́ nke na-enweghị mgbanwegharị ndị na-akpata mgbagwoju anya ndị o mesịrị nweta n’aka ndị ọkà mmụta okpukpe nke chọọchị.
Ò kwere omume na ọ bụ Pọl chepụtara ozizi nke a? Ee e, n’ihi na ọ kọwara ná 1 Ndị Kọrint 15:3, sị: “Enyere m n’aka unu na mbụ ihe m natakwara idebe, na Kraịst nwụrụ n’ihi mmehie anyị nile, dị ka ihe e deworo n’Akwụkwọ nsọ si dị.” O doro anya na ogologo oge tupu Pọl edee akwụkwọ ozi ya ndị ahụ, ndị Kraịst aghọtaworị ọnwụ Jisọs ịbụ nke ọchụchụ àjà, bụ́ ụgwọ nke a kwụrụ n’ezie iji gbapụta ihe a kpọrọ mmadụ na-emehie emehie, ihe mgbapụta. Ọzọkwa, dị ka Pọl mere ka ọ pụta ìhè, ha ghọtara na ọnwụ Kraịst mezuru “ihe e deworo n’Akwụkwọ nsọ,” ya bụ amụma ndị dị ka Abụ Ọma 22 na Aịsaịa 53 n’Akwụkwọ Nsọ Hibru ma ọ bụ “Agba Ochie.”
Ajụjụ Ndị A Na-azabeghị Aza
Ọ bụrụ na ị họrọ inyocha ihe ndị bụ eziokwu n’onwe gị, ị ga-achọpụta na ozizi nke ndị dapụrụ n’ezi ofufe mịbatara n’iso ụzọ Kraịst laa azụ n’oge dị nso n’oge ndị ozi ahụ. (Ọrụ 20:29, 30; 2 Timoti 4:3, 4) Ma n’agbanyeghị nke ahụ, ikwenye n’àjà mgbapụta nke Kraịst nọgidere, dị ka ihe odide nke ndị Nna Chọọchị oge ochie na-egosi. Otú ọ dị, mgbe ndị ọkà mmụta okpukpe e mesịrị nwee tinyere isi n’ozizi banyere ihe mgbapụta ahụ, ha zutere ajụjụ ụfọdụ ndị siri ike, dị ka, Ònye ka a kwụrụ ụgwọ ihe mgbapụta ahụ? Ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka ụgwọ dị otú ahụ ji dị mkpa?
N’ime narị afọ nke anọ O.A., Gregory onye Nyssa na ndị ọzọ kwalitere echiche ahụ nke bụ na ọ bụ Setan bụ Ekwensu ka a kwụrụ ụgwọ ihe mgbapụta ahụ! Ha rụrụ ụka na Setan ji ụmụ mmadụ eji, na a kwụkwara ya ụgwọ ihe mgbapụta ahụ iji mee ka ihe a kpọrọ mmadụ nwere onwe ha. Otú ọ dị, otu onye dịrị ndụ n’otu oge ahụ, nke aha ya bụ Gregory onye Nazianzus hụrụ na ọ dị ihe kọrọ nchepụta echiche nke a. Echiche ahụ na-egosi na Chineke ji Ekwensu ụgwọ—ihe ezi echiche na-adịghị na ya n’ezie! Otú o sina dị, echiche ahụ nke bụ na ọ bụ Ekwensu ka a kwụrụ ụgwọ ihe mgbapụta ahụ gbasazuru ebe nile, nọgidekwa ruo ọtụtụ narị afọ.
Ọ̀ pụrụ ịbụ Chineke n’onwe ya ka a kwụrụ ụgwọ ihe mgbapụta ahụ? Gregory onye Nazianzus chere na ya hụkwara ihe isi ike n’echiche nke ahụ. Ebe ‘anyị na-anọghị n’agbụ nye [Chineke],’ n’ihi gịnị ka ọ ga-eji dị mkpa ịkwụ ya ụgwọ ihe mgbapụta? Ọzọkwa, ‘ọ̀ pụrụ ịbụ na Nna ahụ nwere obi ụtọ n’ọnwụ nke Ọkpara ya’ site n’ikwu ka e nye ya ihe mgbapụta? O yiri nnọọ ka ndị a hà bụ ajụjụ ndị siri ike ndị mere ka a malite ịrụ ụka banyere ihe mgbapụta ahụ n’onwe ya.
Ọnwụ nke Ihe Mgbapụta ahụ
Nnyocha ị na-eme banyere okwu a pụrụ iduruzi gị bịarute ná mmalite nke narị afọ nke 12. Anselm, bụ́ Bishọp Ukwu nke Canterbury, nwara ịza ajụjụ ndị a n’akwụkwọ ya bụ Cur Deus Homo (Ihe Mere Chineke Ji Ghọọ Mmadụ). Akwụkwọ ahụ kwuru na ọnwụ Kraịst rụrụ ọrụ dị ka ihe e ji mezuo ụkpụrụ ikpe ziri ezi nke Chineke, ma ọ bụghị dị ka ihe mgbapụta. Anselm kwuru na iji gbaghara mmehie site n’ihe mgbapụta n’emezughị ụkpụrụ ikpe ziri ezi ga-apụta na e dozibeghị ihe e mehiere. Anselm kwuru, sị, “Ma Chineke apụghị ịhapụ ihe ọ bụla n’emezighị ya emezi n’ime Alaeze Ya.” Ya mere, olee ụzọ Chineke si dozie ihe?
N’ịrụ ụka na ‘mmehie adịghị enye Chineke nsọpụrụ,’ Anselm kwuru na ọ garaghị ezu ezu “nanị iweghachi ihe e wepụworo” site ná mmehie Adam. Ebe ọ bụ na a kparịwo Chineke, ihe mgbapụta—ọbụna àjà nke mmadụ zuru okè—agaghị ezu ezu. Onye ụkọchukwu ahụ tụgharịrị uche, sị, “N’ịtụle mkparị e nyere, a ghaghị inyeghachi ihe karịrị ihe e wepụrụ.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Anselm rụrụ ụka na nke a ga-achọ ịnwụ ọnwu nke onye bụ “ma Chineke ma mmadụ”!
N’agbanyeghị ihe bụ mmeghachi omume gị ná nkụzi nke Anselm, ha mere ka ndị ya na ha nọrọ n’otu oge kwenyere ya, ọ nọgidekwara na-enwe mmetụta n’oge anyị a. Ee, site n’otu ihe omume, Anselm emesighachiwo ozizi Atọ n’Ime Otu ike, gbuokwa echiche nke ihe mgbapụta ahụ, ma ọ dịghị ihe ọzọ, n’ime Krisendọm! “Imezu Ihe” ghọrọ okwu ndị ọkà mmụta okpukpe na-ejikarị eme ihe, okwu ahụ bụ “ihe mgbapụta” jikwa nwayọọ nwayọọ na-adanyụ. Otú ọ dị, nchepụta echiche nke Anselm dabeere n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’ozuzu ya n’ụkpụrụ echiche a na-enyo enyo, ọ bụghị na Bible. Ka oge na-agafekwa, ndị ọkà mmụta ndị dị ka Thomas Aquinas malitere igbuda nchepụta echiche nke Anselm banyere “imezu ihe,” na-eji ụkpụrụ echiche dị garagara nke ha onwe ha. Nchepụta echiche jupụtara ebe nile. Echiche dị iche iche banyere mgbapụta mụbara, nrụrịta ụka ahụ hapụwanyekwara Akwụkwọ nsọ ma bamiwanye n’echiche mmadụ, nkà ihe ọmụma, na nkà ihe omimi.
Nhazigharị Okpukpe na Ihe Mgbapụta ahụ
Ma, ka anyị bịakwuo nso n’oge anyị a. Mgbe oké ifufe nke Nhazigharị Okpukpe ndị Protestant tiwapụrụ n’ime narị afọ nke 16, a mụpụtara otu òtù ndị isi na-anụ ọkụ a na-akpọ ndị òtù Socinus.a Ha jụrụ ajụ ikwere na ọnwụ Jisọs dị ụzọ ọ bụla o si “mee ka anyị ruo eruo inweta nzọpụta,” na-akpọ nkwenkwe dị otú ahụ “nke ụgha, nke na-ezighị ezi, nke na-ebibikwa ihe nke ukwuu . . . , nke bụ ihe arụ nye ma Akwụkwọ nsọ ma ezi echiche.” (The Racovian Catechisme) Ebe ọ bụ na Chineke na-agbaghara mmehie n’efu, ọ dịghị mmezu ụkpụrụ ikpe ziri ezi ọ bụla dị mkpa. Ha kwuru na ọnwụ Kraịst bụ ihe nnapụta n’echiche nke bụ na ọ kpaliri ụmụ mmadụ iṅomi ihe nlereanya ya zuru okè.
N’ihi nsogbu nke ozizi nke a na ndị ọzọ megidere ha wetaara ha, Chọọchị Katọlik malitere oké mbuso agha, na-akpọkọta nzukọ Kansụl nke Trent (malite na 1545 ruo 1563 O.A.). Ma, ọ bụ ezie na a kọwara ọnọdụ chọọchị ahụ n’ọtụtụ okwu ndị metụtara ozizi, kansụl ahụ ekwughị ihe ọ bụla pụtara ìhè banyere ọnọdụ ya n’ihe banyere mgbapụta ahụ. O kwuru okwu banyere ‘iru eru nke Jisọs Kraịst,’ jirikwa okwu ahụ bụ “imezu ihe” mee ihe, ma gbalịsie nnọọ ike izere okwu ahụ bụ “ihe mgbapụta.” N’ihi nke a, chọọchị ahụ abịaghị nso ma ọlị n’iwere ọnọdụ ọ bụla doro anya nke Akwụkwọ nsọ kwadoro. Ọnụ ụzọ nke na-eduje n’onye ọ bụla ichepụta echiche nke ya ka ghere oghe.
Ihe Mere Ndị Ndú Okpukpe Jiworo Daa
Eri mgbe e nwesịrị nzukọ Kansụl nke Trent ahụ, ndị ọkà mmụta okpukpe—ma ndị Katọlik ma ndị Protestant—ewulitewo nchepụta echiche dị iche iche banyere mgbapụta ahụ. (Lee igbe dị na peji 7.) N’agbanyeghị nke ahụ, e nwebeghị nkwekọrịta ọ bụla banyere ihe ọnwụ Kraịst pụtara. Ndị ọkà mmụta okpukpe nwere nkwekọrịta nanị ná nleda anya ha na-eleda okwu ahụ si n’Akwụkwọ nsọ nke bụ “ihe mgbapụta,” na-ahọrọ ilefuru ya anya, ime ka ịdị mkpa ya ghara ịpụta ìhè, ma ọ bụ na-akọwa ya n’ụzọ a na-agaghị aghọta ya aghọta. A na-akọwa ihe ọnwụ Kraịst pụtara n’okwu mgbagwoju anya dị iche iche, usoro echiche ụgha ndị gbagọrọ agbagọ, na okwu ndị na-ada oké ụda, ndị dị ka “mmetụta nke ụkpụrụ omume” na “imezu ihe nnọchianya nke anụ ahụ.” Kama iwulite okwukwe n’ọnwụ Kraịst, ndị ụkọchukwu Krisendọm emewo ka osisi ịta ahụhụ ya bụrụ nkume mkpọbi ụkwụ nke na-akpata mgbagwoju anya.
Gịnị bụ isi ihe kpatara oké ọdịda nke a? Onye ọkà mmụta okpukpe Katọlik bụ Boniface A. Willems kwuru na ihe kpatara ya bụ eziokwu ahụ nke bụ na ndị ọkà mmụta okpukpe bụ ndị “e ziri ihe ná nnọpụiche nke e ji nlezianya wee chebe”—bụ́ nke dị anya nke ukwuu site ná mkpa ụmụ mmadụ nwere n’ezie.b Ọ́ gaghị amasị gị karị ịnakwere nkọwa ahụ? Otú ọ dị, Jeremaịa 8:9 na-aga n’ihu, na-eme ka mkpọrọgwụ bụ isi nke ihe isi ike ahụ pụta ìhè, sị: “Okwu Jehova ka ha jụworo; ọ̀ bụkwa aha amamihe gịnị ka ha nwere?”
N’eziokwu, ozizi nke ihe mgbapụta ahụ pụrụ ịkpali ajụjụ ụfodụ ndị siri ike. (2 Pita 3:16) Ma, kama ịchọ azịza n’ime Akwụkwọ nsọ, ndị ọkà mmụta okpukpe ejiriwo amamihe na usoro nchepụta echiche mmadụ mee ihe. (1 Ndị Kọrint 1:19, 20; 2:13) Ha agawo n’ihu ịjụ akụkụ Bible ọ bụla nke na-ekwekọghị n’ọchịchọ ha—ma ọ bụ ná nchepụta echiche ha. (2 Timoti 3:16) Ha akwalitewo nkụzi ndị na-adabereghị n’akwụkwọ nsọ, ndị dị ka ozizi Atọ n’Ime Otu. (Jọn 14:28) Ọdịda ha kasị ukwuu bụkwa na ha emewo ka ihe kasị dịrị mkpa bụrụ nzọpụta nke mmadụ, na-elefuru ihe ndị ka mkpa anya, bụ́ ndị metụtara aha na Alaeze Chineke.—Matiu 6:9, 10.
Ihe Na-akwado Ihe Mgbapụta ahụ
Ugbu a, biko mee ka nnyocha gị bịarute n’akụkụ ikpeazụ nke afọ ndị 1800. Otu nwoke na-atụ egwu Chineke onye aha ya bụ Charles Taze Russell kewapụrụ onwe ya site n’ọkà mmụta okpukpe ọha mmadụ nakweere wee malite ibipụta magazin nke a—Ụlọ Nche (Bekee). Russell chetaghachiri, sị, “Site ná mmalite, ọ bụwo ihe pụrụ iche nke na-akwado Ihe Mgbapụta ahụ.”
Ụlọ Nche na-aga n’ihu na-arụ ọrụ dị ka ihe dị otú ahụ ruo taa. Ruo ihe karịrị otu narị afọ, ọ kọwawo ihe ndị dabeere n’Akwụkwọ nsọ iji wee kwenye n’ihe mgbapụta ahụ, o nyewokwa nzaghachi ezi uche dị na ha ndị dabeere n’Akwụkwọ nsọ n’ihe ịma aka nile nke ndị nkatọ. N’ihi ya, anyị na-akpọ gị òkù ka i lebakwuo anya ugbu a n’ihe Bible kwuru banyere ọnwụ Jisọs na ihe ọ pụtara.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee isiokwu bụ “Ndị Òtù Socinus—N’ihi Gịnị Ka Ha Ji Jụ Atọ n’Ime Otu ahụ?” na magazin anyị na-ebipụtakọ ya na nke a, bụ́ Teta! [Bekee] nke November 22, 1988.
b Ma, rịba ama ihe bụ echiche nke Willems n’igbe ahụ dị n’elu.
Igbe dị na peeji nke 7]
ỤFỌDỤ NCHEPỤTA ECHICHE NDỊ E NWERE BANYERE MGBAPỤTA
◻ ECHICHE NKE ONYE ISI MA Ọ BỤ NKE ỌCHỊCHỊ: Onye Netherlands bụ ọkà mmụta okpukpe, bụ́ Hugo Grotius guzobere nke a n’ime narị afọ nke 17 iji megide nchepụta echiche nile nke ndị òtù Socinus. Grotius lere ọnwụ Kraịst anya “dị ka mmekọrịta azụmahịa nke iwu kwadoro, nke Chineke nọ na ya dị ka Onye Isi ma ọ bụ Onye Gọvanọ, nke mmadụ nọkwa na ya dị ka onye mere mpụ.”—Encyclopædia of Religion and Ethics nke Hastings dere.
◻ ECHICHE NKE MKPUCHI MMEHIE DỊ OKÉ MKPA: Onye ọkà mmụta okpukpe Protestant bụ Clarence H. Hewitt welitere echiche nke a na 1946. O lere ọrụ Kraịst anya, ọ bụghị dị ka ịkwụ ụgwọ iwu chọrọ ka a kwụọ, kama dị ka ‘ihe napụtara anyị site n’okpuru iwu nke mmehie na ọnwụ, wee kpalie nchegharị na mwute site n’egwu Chineke, wee si otú a na-eme ka anyị bịa n’ọnọdụ ebe a pụrụ ịgbaghara anyị n’ihu Chineke.’
◻ MGBAPỤTA SITE NÁ MKPAKỌRỊTA NDỊ KRAỊST: Onye ọkà mmụta okpukpe Roman Katọlik bụ Boniface A. Willems (1970) ji “mgbapụta” tụnyere “anyị ịgbakụta mpako anyị azụ wee meghepụ obi anyị otu onye n’ebe ibe ya nọ.” O kwukwara, sị: “Echiche ndị Kraịst nke iji ihe dochie anya ihe ma ọ bụ nke onye ọzọ ịtachitere ndị ọzọ ahụhụ bụ na mmadụ maara na ya na agbụrụ mmadụ nke mmehie mekpaworo ahụ nwere njikọ siri ike. . . . N’ihi ya, Chọọchị bụ mkpakọrịta nke ndị ahụ dị njikere ịdị ndụ n’ọnọdụ ije ozi pụrụ iche n’ihi ndị ọzọ.”
◻ ECHICHE NKE OTU ONYE ỊNWỤCHITERE ỌHA ỌNWỤ: Onye ọkà mmụta okpukpe Katọlik bụ Raymund Schwager welitere echiche nke a na 1978. Ọ jụrụ echiche ahụ nke bụ na Chineke “ga-anara anya n’ọnọdụ anya.” Ọ na-ele àjà Kraịst anya dị ka otu ụdị nke usoro ime ka ihe dị ọcha, nke na-eme ka òtù ụmụ mmadụ gosipụta—wee sikwa otú a wepụchasịa site n’ahụ onwe ha—àgwà ime ihe ike ndị ha bu pụta ụwa.
◻ MGBAPỤTA NKE ỌHA MMADỤ NA NDỌRỌ NDỌRỌ ỌCHỊCHỊ: Onye ọkà mmụta okpukpe Baptist bụ Thorwald Lorenzen dere na 1985, sị: “Ọ bụghị nanị na Chineke na-achọ mgbaghara n’ihe metụtara okpukpe nye onye mmehie, kama ọ na-achọkwa ka ndị ogbenye na ndị a na-akpagbu nwere onwe ha n’ụzọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị. . . . Ya mere, ọnwụ Jisọs na-egosipụta Chineke onye nwere mmetụta banyere ngwọta nke akụkụ nile nke ndụ mmadụ.”
[Foto dị na peeji nke 5]
Ndị ọkà mmụta okpukpe Protestant na ndị nke Katọlik eguzobewo ọtụtụ nchepụta echiche banyere mgbapụta na ihe mgbapụta ahụ, ma gịnị ka Bible na-akụzi?