Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Jizọs Emee Ihe Atụ Abụọ Gbasara Ubi Vaịn
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
    • Jizọs mekwaara ha ihe atụ ọzọ. Na nke ugbu a, o gosiri na ndị ndú okpukpe medịrị ihe karịrị ịghara ife Chineke njọ. Ha bụ nnọọ ndị ọjọọ. Jizọs kwuru, sị: “Otu nwoke kọrọ ubi vaịn, gbaakwa ya ogige gburugburu, ma gwuo olulu nke mmanya si n’ebe nzọchapụta mmanya ga na-agbanye, wuokwa ụlọ elu, ma nyefee ya n’aka ndị ọrụ ubi, wee gawa mba ọzọ. Mgbe oge ruru, o zipụrụ otu ohu ka ọ gakwuru ndị ọrụ ubi ahụ, ka o wee nata ndị ọrụ ubi ahụ ụfọdụ n’ime mkpụrụ nke ubi vaịn ahụ. Ma ha jidere ya, tikasịa ya ahụ́ ma hapụ ya ka ọ lawa n’enyeghị ya ihe ọ bụla. O zipụkwara ohu ọzọ ka ọ gakwuru ha; ha kụkwara nke ahụ ihe n’isi ma menye ya ihere. O wee ziga onye ọzọ, ha gbukwara onye nke ahụ; o zigakwara ọtụtụ ndị ọzọ, bụ́ ndị ha tikasịrị ụfọdụ n’ime ha ahụ́, gbuokwa ụfọdụ n’ime ha.”—Mak 12:1-5.

      Ndị Jizọs na-agwa okwu, hà ghọtara ihe ihe atụ a pụtara? Ha nwere ike icheta okwu Aịzaya onye amụma ji katọọ ụmụ Izrel. Ọ sịrị: “Ụlọ Izrel bụ ubi vaịn Jehova nke ụsụụ ndị agha, ndị Juda bụkwa ubi nke na-eme ya obi ụtọ. O wee na-atụ anya ikpe ziri ezi, ma, lee! ọ bụ mmebi iwu ka ọ hụrụ.” (Aịzaya 5:7) Ihe atụ a Jizọs mere yiri nke Aịzaya mere. Onye nwe ubi vaịn ahụ bụ Jehova. Ubi vaịn ahụ bụ mba Izrel. Jehova ji Iwu o nyere ha chebe ha dị ka ubi vaịn a gbara ogige. Jehova zigara ndị amụma ya ka ha kụziere ndị ya ihe ma mee ka ha mịa ezi mkpụrụ.

  • Jizọs Emee Ihe Atụ Abụọ Gbasara Ubi Vaịn
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
    • Ha amaghị mgbe ha ji jiri aka ha maa onwe ha ikpe n’ihi na ha so ná “ndị ọrụ ubi” ahụ na-arụrụ Jehova ọrụ ‘n’ubi vaịn’ ya, nke bụ́ mba Izrel. Otu n’ime ihe ndị Jehova chọrọ n’aka ndị ọrụ ubi ya bụ ka ha nwee okwukwe n’Ọkpara ya, bụ́ Mesaya ahụ. Jizọs legidere ndị ndú okpukpe ahụ anya wee sị ha: “Ọ̀ bụ na unu agụtụbeghị akụkụ Akwụkwọ Nsọ a, ‘Nkume ahụ nke ndị na-ewu ụlọ jụrụ, ọ bụ ya ghọrọ nkume isi nkuku bụ́ isi. Ihe a si n’aka Jehova, ọ dịkwa ebube n’anya anyị’?” (Mak 12:10, 11) Jizọs meziri ka ihe ọ na-ekwu doo ha anya. Ọ sịrị ha: “Ọ bụ ya mere m ji asị unu, a ga-anapụ unu alaeze Chineke, werekwa ya nye mba nke na-amị mkpụrụ ya.”—Matiu 21:43.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya