-
“Onye Na-agụ, Ya Tụgharịa Uche”Ụlọ Nche—1999 | Mee 1
-
-
18, 19. Olee ihe ndị e kwuru iji gosi na ‘ịgbalaga n’ugwu’ agaghị apụta ịgbanwe okpukpe?
18 Mgbe o busịrị amụma banyere ‘nguzo nke ihe arụ ahụ n’ebe nsọ,’ Jisọs dọrọ ndị na-atụgharị uche aka ná ntị ime ihe. Ò bu n’uche na mgbe ahụ oge gabigarala—mgbe “ihe arụ” ahụ “na-eguzo n’ebe nsọ”—na ọtụtụ mmadụ ga-esi n’okpukpe ụgha gbalaga ma banye n’ezi ofufe? Ọ dịghị ma ọlị. Tụlee mmezu mbụ ya. Jisọs sịrị: “Ndị nọ na Judia, ka ha gbalaga n’ugwu: onye nọkwa n’elu ụlọ, ya ghara ịrịdata, ma ọ bụ ịba n’ime, ịkwapụ ihe ọ bụla n’ụlọ ya: onye nọkwa n’ubi, ya ghara ịlaghachi ịchịrị uwe ya. Ma ahụhụ ga-adịrị ndị dị ime na ndị na-enye nwa ara na mgbe ahụ. Ma kpeenụ ekpere ka ọ ghara ịdị na mgbe oyi.”—Mak 13:14-18, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.
-
-
“Onye Na-agụ, Ya Tụgharịa Uche”Ụlọ Nche—1999 | Mee 1
-
-
22. Gịnị ka anyị itinye ndụmọdụ Jisọs banyere ịgbalaga n’ugwu n’ọrụ pụrụ ịgụnye?
22 Ka ọ dị ugbu a anyị apụghị inwe nkọwa zuru ezu banyere mkpagbu ukwu ahụ, ma anyị pụrụ ikwubi n’ụzọ ezi uche dị na ya na, nye anyị, mgbalaga ahụ Jisọs kwuru okwu ya agaghị abụ n’echiche nke ịgbaga n’otu akụkụ nke ụwa. Ndị Chineke nọ gburugburu ụwa, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’akụkụ nile. Otú ọ dị, anyị pụrụ ijide n’aka na mgbe mgbalaga dị mkpa, ndị Kraịst aghaghị ịnọgide na-egosi ọdịiche doro anya dị n’etiti ha na òtù okpukpe ụgha dị iche iche. Ọ dịkwa ịrịba ama na Jisọs dọrọ aka ná ntị banyere mmadụ ịlaghachi azụ n’ụlọ ya ịchịrị uwe ma ọ bụ ihe ndị ọzọ. (Matiu 24:17, 18) Ya mere a pụrụ inwe ule n’ọdịnihu n’ihe metụtara otú anyị si ele ihe onwunwe anya; hà bụ ihe ndị kasị mkpa, ka nzọpụta nke ga-abịara ndị nile nọ n’akụkụ Chineke ọ̀ dị mkpa karị? Ee, mgbalaga anyị pụrụ ịgụnye ụfọdụ ihe isi ike na ịnapụ onwe onye ihe. Anyị aghaghị ịdị njikere ime ihe ọ bụla dị mkpa, dị ka ndị ibe anyị na narị afọ mbụ mere bụ́ ndị si na Judia gbaga Peria, n’ofe Jọdan.
-