Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 10/15 p. 13-18
  • Jehova Na-eji Ozi Gị Sitere ná Mkpụrụ Obi Dum Akpọrọ Ihe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jehova Na-eji Ozi Gị Sitere ná Mkpụrụ Obi Dum Akpọrọ Ihe
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịma Mma nke Ije Ozi Site ná Mkpụrụ Obi Dum
  • E Jighị Ibe Anyị Tụnyere Anyị
  • Onyinye “Dị Oké Ọnụ Ahịa nke Ukwuu” nke Nwanyị Nwere Ekele
  • “Ego Nta Abụọ” nke Nwanyị Di Ya Nwụrụ
  • Ịmụta Ihe Site n’Otú Jehova Si Ele Ije Ozi Sitere ná Mkpụrụ Obi Dum Anya
  • Jiri Obi Gị Dum!
    Ozi Alaeze Anyi—1996
  • O Diri Ọnwụ Nwa Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Ihe Anyị Nwere Ike Ịmụta ná Ndụ Meri
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • “Lee! Abụ M Nwa Agbọghọ Bụ́ Ohu Jehova!”
    Ṅomie Okwukwe Ha
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 10/15 p. 13-18

Jehova Na-eji Ozi Gị Sitere ná Mkpụrụ Obi Dum Akpọrọ Ihe

“Ihe ọ bụla unu na-eme, na-arụnụ ọrụ site ná mkpụrụ obi unu, dị ka unu na-arụrụ Onyenwe anyị ọrụ, ọ bụghịkwa mmadụ.”—NDỊ KỌLỌSI 3:23.

1, 2. (a) Gịnị bụ ihe ùgwù kasị ukwuu nke anyị pụrụ inwe? (b) N’ihi gịnị ka ọ pụrụ iji bụrụ na mgbe ụfọdụ anyị enweghị ike ime ihe nile anyị ga-achọ ime n’ijere Chineke ozi?

IJERE Jehova ozi bụ ihe ùgwù kasị ukwuu anyị pụrụ inwe. Ọ bụ ezi ihe mere magazin nke a jiworo gbaa ndị Kraịst ume ogologo oge gara aga itinye onwe ha n’ozi ahụ, ọbụna na-eje ozi “nke ukwuu karị” mgbe ọ bụla o kwere mee. (1 Ndị Tesalọnaịka 4:1) Otú ọ dị, anyị adịghị eme ihe nile na-agụ obi anyị agụụ ime n’ozi Chineke mgbe nile. “Ọnọdụ m bụ nke chọrọ ịrụ ọrụ oge nile,” ka otu nwanna nwanyị na-alụbeghị di bụ́ onye e mere baptism ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 40 gara aga na-akọwa. “Ihe mere m ji na-arụ ọrụ abụghị inweta uwe oyiyi ndị dara oké ọnụ ma ọ bụ ịga ezumike na-eri ego, kama ọ bụ inweta ego mmefu maka ihe ndị dị mkpa, gụnyere mmefu ahụ ike na nlekọta ézé. Ọ dị m ka m na-enye Jehova ihe fọdụrụnụ.”

2 Ịhụnanya maka Chineke na-akwali anyị ịchọ ime ihe nile anyị nwere ike ya n’ọrụ nkwusa ahụ. Ma ọnọdụ ndị dị ná ndụ na-ebelatakarị ihe anyị pụrụ ime. Ilekọta ibu ọrụ Akwụkwọ Nsọ, gụnyere ọrụ ezinụlọ, pụrụ iri ihe dị ukwuu n’oge na ume anyị. (1 Timoti 5:4, 8) ‘N’oge ndị a dị oké egwu,’ ndụ na-abụwanye ihe ịma aka. (2 Timoti 3:1) Mgbe anyị na-enweghị ike ime ihe nile anyị ga-achọ ime n’ozi ahụ, obi anyị pụrụ inye anyị nsogbu ruo n’ókè ụfọdụ. Anyị pụrụ ịjụ onwe anyị ma ofufe anyị ọ̀ dị Chineke mma.

Ịma Mma nke Ije Ozi Site ná Mkpụrụ Obi Dum

3. Gịnị ka Jehova na-atụ anya n’aka anyị nile?

3 N’Abụ Ọma 103:14, Bible na-emesi anyị obi ike n’ụzọ na-ekpo ọkụ na Jehova “maara otú a kpụworo anyị; Ọ na-echeta na ájá ka anyị bụ.” Karịa onye ọ bụla ọzọ, ọ na-aghọta erughị eru anyị. Ọ dịghị achọ ihe karịrị ihe anyị pụrụ inye. Gịnị ka ọ na-atụ anya ya? Ihe onye ọ bụla, n’agbanyeghị ọnọdụ ya ná ndụ, pụrụ inye: “Ihe ọ bụla unu na-eme, na-arụnụ ọrụ site ná mkpụrụ obi unu, dị ka unu na-arụrụ Onyenwe anyị ọrụ, ọ bụghịkwa mmadụ.” (Ndị Kọlọsi 3:23) Ee, Jehova na-atụ anyị anya—anyị nile—ijere ya ozi site ná mkpụrụ obi dum.

4. Gịnị ka ijere Jehova ozi site ná mkpụrụ obi dum pụtara?

4 Gịnị ka ijere Jehova ozi site ná mkpụrụ obi dum pụtara? Okwu Grik a sụgharịrị “mkpụrụ obi dum” pụtara n’ụzọ nkịtị “site ná mkpụrụ obi.” “Mkpụrụ obi” na-ezo aka n’onye ahụ n’ozuzu ya, ya na ikike ọkpụkpụ aka na uche ya. Ya mere ije ozi site ná mkpụrụ obi dum pụtara inyefe onwe anyị, na-eji ikike anyị nile na-eme ihe ma na-etinye ume anyị nile ruo n’ókè kasị zuo ezu o kwere mee n’ozi Chineke. N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, ọ pụtara ime ihe nile mkpụrụ obi anyị pụrụ ime.—Mak 12:29, 30.

5. Olee otú ihe nlereanya nke ndị ozi si gosi na ọ bụghị iwu na mmadụ nile ga-eme otu ihe ahụ n’ozi?

5 Ime ihe site ná mkpụrụ obi dum ọ̀ pụtara na anyị nile aghaghị ime ihe hà nhata n’ozi? Nke ahụ agaghị ekwe omume ma ọlị, n’ihi na ọnọdụ na ikike dịgasị iche site ná mkpụrụ obi gaa ná mkpụrụ obi. Tụlee ndị ozi kwesịrị ntụkwasị obi nke Jisọs. Ha nile enweghị ike ime ihe hà nhata. Dị ka ihe atụ, anyị maara ihe dị nnọọ nta banyere ụfọdụ ndị ozi, dị ka Saịmọn Kananịọs na Jemes nwa Alfịọs. Ikekwe ọrụ ha dị ka ndị ozi dị nnọọ nta. (Matiu 10:2-4) N’ụzọ dị iche, Pita nwere ike ịnakwere ọtụtụ ibu ọrụ dị arọ—leenụ, Jisọs ọbụna nyere ya “mkpịsị ugodi nke alaeze”! (Matiu 16:19) Ma, e bulighị Pita elu karịa ndị ọzọ. Mgbe Jọn hụrụ ọhụụ nke Jerusalem Ọhụrụ ná Mkpughe (ihe dị ka na 96 O.A.), ọ hụrụ nkume ntọala 12, e dekwasịkwara n’elu ha “aha iri na abụọ nke ndị ozi iri na abụọ ahụ.”a (Mkpughe 21:14) Jehova jiri ozi nke ndị ozi ahụ nile kpọrọ ihe, ọ bụ ezie na ihe àmà na-egosi na ụfọdụ nwere ike imekarị ndị ọzọ.

6. N’ihe atụ Jisọs nke ọgha mkpụrụ ahụ, gịnị mere mkpụrụ ahụ a ghara ‘n’ala dị mma,’ ajụjụ ndị dịkwa aṅaa na-ebilite?

6 N’otu aka ahụ, Jehova adịghị achọ ime nkwusa hà nhata site n’aka anyị nile. Jisọs gosiri nke a n’ilu nke ọgha mkpụrụ ahụ, bụ́ nke jiri ọrụ nkwusa ahụ tụnyere ịgha mkpụrụ. Mkpụrụ ahụ dara n’ụdị ala dịgasị iche iche, na-eme ihe atụ ụdị ọnọdụ obi dịgasị iche iche nke ndị nụrụ ozi ahụ gosipụtara. “Onye a ghakwara n’ala ahụ dị mma,” ka Jisọs kọwara, “mmadụ a bụ onye na-anụ okwu ahụ, wee ghọta ya; onye na-amị mkpụrụ n’ezie, mịpụta, otu [otu narị], ọzọ [iri isii], ọzọ [iri atọ].” (Matiu 13:3-8, 18-23) Gịnị ka mkpụrụ a bụ, n’ihi gịnịkwa ka e ji amịpụta ya n’ọ̀tụ̀tụ̀ dịgasị iche?

7. Gịnị ka mkpụrụ ahụ a ghara mịrị, gịnịkwa mere o ji mịa n’ọ̀tụ̀tụ̀ dịgasị iche iche?

7 Ebe mkpụrụ ahụ a ghara bụ “okwu alaeze eluigwe,” ọmịmị nke mkpụrụ ahụ na-ezo aka n’ịgbasa okwu ahụ, na-agwa ya ndị ọzọ. (Matiu 13:19) Ọ̀tụ̀tụ̀ nke mkpụrụ ahụ na-amịpụta na-adịgasị iche—site n’iri atọ gaa n’otu narị—n’ihi na ikike na ọnọdụ ná ndụ dịgasị iche. Onye nwere ezi ahụ ike na ume pụrụ inwe ike itinye oge n’ime nkwusa karịa ka onye ọnọdụ ahụ ike ya na-adịghị ala ala ma ọ bụ ịka nká na-amịkọrọ ume ya pụrụ ime. Onye na-eto eto na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye nke na-enweghị ibu ọrụ ezinụlọ nwere ike ime ihe karịrị nke onye na-aghaghị ịrụ ọrụ oge nile iji nye ezinụlọ ya ihe na-akpa ha pụrụ ime.—Tụlee Ilu 20:29.

8. Olee otú Jehova si ele ndị na-enye ihe nile mkpụrụ obi ha pụrụ inye anya?

8 N’anya Chineke, onye tinyere mkpụrụ obi ya dum nke na-amịpụta iri atọ ò nwere nraranye dị nta karịa onye na-amịpụta otu narị? Ọ dịghị ma ọlị! Ọ̀tụ̀tụ̀ mkpụrụ a mịpụtara pụrụ ịdịgasị iche, kama obi dị Jehova ụtọ ma ọ bụrụhaala na ozi e jere bụ ihe nile mkpụrụ obi anyị pụrụ inye. Cheta, ọ̀tụ̀tụ̀ dị iche iche nke mkpụrụ a na-amị na-esitecha n’obi ndị bụ “ala ahụ dị mma.” Okwu Grik (ka·losʹ) nke a sụgharịrị “dị mma” na-akọwa ihe “mara mma” nakwa nke “dị obi mma, ma na-amasị anya.” Lee ka o si akasi obi ịmara na mgbe anyị mere ike anyị nile, obi anyị mara mma n’anya Chineke!

E Jighị Ibe Anyị Tụnyere Anyị

9, 10. (a) Obi anyị pụrụ iduje anyị n’ụdị echiche na-ezighị ezi dị aṅaa? (b) Olee otú ihe atụ dị ná 1 Ndị Kọrint 12:14-26 si egosi na Jehova adịghị eji anyị atụnyere ndị ọzọ n’ihe anyị na-eme?

9 Otú ọ dị, obi anyị na-ezughị okè pụrụ ịgbakọ ihe n’ụzọ dị iche. Ọ pụrụ iji ozi anyị tụnyere nke ndị ọzọ. Ọ pụrụ iche, ‘Ndị ọzọ na-eme ihe dị ukwuu n’ozi karịa m. Olee ihe ga-eme ka Jehova nwee obi ụtọ n’ozi m?’—Tụlee 1 Jọn 3:19, 20.

10 Echiche na ụzọ Jehova dị nnọọ elu karịa nke anyị. (Aịsaịa 55:9) Anyị na-aghọtatụ ụzọ Jehova si ele mgbalị anyị n’otu n’otu anya site ná 1 Ndị Kọrint 12:14-26, ebe e ji ọgbakọ tụnyere ahụ nke nwere ọtụtụ akụkụ—anya, aka, ụkwụ, ntị, na ndị ọzọ. Tụlee, na nwa oge, ahụ nkịtị. Lee ka ọ ga-esi bụrụ ihe na-ezitụghị ezi iji anya gị tụnyere aka gị ma ọ bụ iji ụkwụ gị tụnyere ntị gị! Akụkụ ahụ nke ọ bụla na-arụ ọrụ dị iche, n’agbanyeghị nke ahụ akụkụ ahụ nile bachara uru ma bụrụ ndị e ji akpọrọ ihe. N’otu aka ahụ, Jehova ji ozi i ji mkpụrụ obi dum na-eje akpọrọ ihe ma ndị ọzọ hà na-eme ihe ka ukwuu ma hà na-eme ihe ka nta.—Ndị Galetia 6:4.

11, 12. (a) N’ihi gịnị ka ụfọdụ pụrụ iji na-eche na ha “adịghị ike” ma ọ bụ bụrụ ndị “a dịghị asọpụrụ”? (b) Olee otú Jehova si ele ozi anyị anya?

11 N’ihi ịkpa ókè nke ahụ esighị ike, ịka nká, ma ọ bụ ọnọdụ ndị ọzọ na-eweta, mgbe ụfọdụ ụfọdụ n’ime anyị pụrụ iche na anyị “adịghị ike” ma ọ bụ na “a dịghị asọpụrụ” anyị. Ma ọ bụghị otú Jehova si ele ihe anya. Bible na-agwa anyị, sị: “Ihe ahụ dị n’ahụ nke a na-eche na ha adịghị ike karị bụ ihe dị mkpa karị nke ukwuu: akụkụ ahụ . . . nke anyị na-eche na a dịghị asọpụrụ ha dị ka akụkụ ọzọ, akụkụ ndị a ka anyị na-enyebigakwa nsọpụrụ ókè karị . . . Kama Chineke tigwara ahụ n’otu, akụkụ ahụ ahụ nke nsọpụrụ fọdụụrụ ya inwe ka Ọ na-enyebiga nsọpụrụ ókè karị.” (1 Ndị Kọrint 12:22-24) Ya mere onye ọ bụla pụrụ ịdị oké ọnụ ahịa nye Jehova. Ọ na-ewere ozi anyị na-eje dị ka ike anyị hà n’ihe dị oké ọnụ ahịa. Ọ̀ bụ na obi gị adịghị akwali gị ịchọ ime ihe nile ị pụrụ ime n’ijere Chineke na-ahụ n’anya na nke na-aghọta ihe dị otú ahụ ozi?

12 Ya mere, ihe dị Jehova mkpa abụghị ka i mee ihe hà ka nke onye ọzọ mere kama ka i mee ihe ị—mkpụrụ obi gị—pụrụ ime n’onwe ya. Na Jehova ji mgbalị anyị n’otu n’otu akpọrọ ihe bụ nke e mere ihe atụ ya n’ụzọ na-emetụ nnọọ n’ahụ site ná mmeso Jisọs mesoro ndị inyom abụọ dị nnọọ iche n’ụbọchị ikpeazụ nke ndụ ya n’elu ala.

Onyinye “Dị Oké Ọnụ Ahịa nke Ukwuu” nke Nwanyị Nwere Ekele

13. (a) Gịnị bụgasị ọnọdụ ndị gbara mwụsa Meri wụsara mmanụ ahụ na-esi ísì ụtọ n’isi na n’ụkwụ Jisọs gburugburu? (b) Gịnị bụ ọnụ ego nke mmanụ Meri?

13 N’uhuruchi Friday, Nisan 8, Jisọs bịarutere na Betani, obodo nta nke dị ná mkpọda ọwụwa anyanwụ nke Ugwu Olive, ihe dị ka kilomita atọ site na Jerusalem. Jisọs nwere ezi ndị enyi n’obodo a—Meri, Mata, na nwanne ha nwoke, Lazarọs. Jisọs abụwo ọbịa n’ụlọ ha, ikekwe mgbe mgbe. Ma n’uhuruchi Saturday, Jisọs na ndị enyi ya riri ihe n’ụlọ Saịmọn, onye bụbu onye ekpenta nke nwere ike bụrụ onye Jisọs gwọrọ. Ka Jisọs na-anọdụ na table, Meri mere ihe obi umeala nke gosiri ịhụnanya dị omimi o nwere maka nwoke ahụ kpọliteworo nwanne ya nwoke n’ọnwụ. Ọ kụwara otu ololo nke mmanụ otite na-esi ísì ụtọ, nke “dị oké ọnụ ahịa nke ukwuu,” dị na ya. Ọ dị oké ọnụ ahịa n’ezie! Ọnụ ego ya ruru denarius 300, ihe hà ka ụgwọ ọrụ otu afọ. Ọ wụsara mmanụ ahụ na-esi isi ụtọ n’isi na n’ụkwụ Jisọs. Ọbụna o ji agịrị isi ya hichaa ụkwụ ya.—Mak 14:3; Luk 10:38-42; Jọn 11:38-44; 12:1-3.

14. (a) Olee otú ndị na-eso ụzọ si meghachi omume n’ọrụ ọma Meri? (b) Olee otú Jisọs si gbachitere Meri?

14 Iwe were ndị na-eso ụzọ ya! ‘Gịnị mere e ji laa ya n’iyi?’ ka ha jụrụ. Judas, n’izochi ọchịchọ ya izu ohi n’azụ ịtụ aro ịrụ ọrụ ebere maka ndị nọ ná mkpa, sịrị: “N’ihi gịnị ka a na-ereghị mmanụ otite a [narị denarius atọ], were ya nye ndị ogbenye?” Meri gbara nkịtị. Otú ọ dị, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Hapụnụ ya; gịnị mere unu na-esogbu ya? ọ rụrụ ọrụ ọma [otu ụdị nke ka·losʹ] n’ahụ m. . . . O mere ihe o nwere ike ime: o buru ụzọ tee ahụ m mmanụ otite ka e wee dozie m n’olili. Ma n’ezie asị m unu, Ebe ọ bụla a ga-ekwusa ozi ọma nke a n’ụwa dum, a ga-ekwutekwa ihe nke nwanyị a mere, ka ọ bụrụ ihe ncheta ya.” Lee ka ikpo ọkụ nke okwu Jisọs na-aghaghị isiworị mejụọ Meri obi!—Mak 14:4-9; Jọn 12:4-8.

15. N’ihi gịnị ka ihe Meri mere ji metụ Jisọs n’ahụ nke ukwuu, gịnịzi ka anyị mụtara banyere ozi sitere ná mkpụrụ obi dum?

15 Ihe Meri meworo metụrụ Jisọs n’ahụ nke ukwuu. N’uche Ya, o mewo ihe kwesịrị otuto. Ọ bụghị ọnụ ego onyinye ahụ bụ mkpa Jisọs kama eziokwu ahụ bụ na “o mere ihe o nwere ike ime.” O ji ohere ahụ mee ihe ma nye ihe o nwere ike inye. Nsụgharị ndị ọzọ asụgharịwo okwu ndị a, “O mewo ihe nile ọ pụrụ,” ma ọ bụ, “O mewo ihe dị n’ike ya ime.” (An American Translation; The Jerusalem Bible) Inye ihe nke Meri sitere ná mkpụrụ obi dum n’ihi na o nyere ihe kasị mma o nwere. Ọ bụ ihe ije ozi site ná mkpụrụ obi dum pụtara.

“Ego Nta Abụọ” nke Nwanyị Di Ya Nwụrụ

16. (a) Olee otú Jisọs si bịa hụ onyinye nwanyị dara ogbenye nke di ya nwụrụ? (b) Gịnị bụ ọnụ ahịa nke mkpụrụ ego nke nwanyị ahụ di ya nwụrụ?

16 Ụbọchị ole na ole nke ahụ gasịrị, na Nisan 11, Jisọs nọrọ ụbọchị nile n’ụlọ nsọ ahụ, ebe a mara ikike ya aka, ọ zakwara ajụjụ na-enye nsogbu banyere ụtụ isi, mbilite n’ọnwụ, na okwu ndị ọzọ. Ọ katọrọ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii maka, tinyere ihe ndị ọzọ, ‘iripịa ụlọ ndị inyom di ha nwụrụ.’ (Mak 12:40) Mgbe ahụ Jisọs ewere oche, eleghị anya n’Ogige Ndị Inyom, bụ́ ebe, dị ka ọdịnala ndị Juu si dị, e nwere igbe ụtụ 13. Ọ nọdụrụ ala ruo nwa oge, na-ekiri nke ọma ihe na-emenụ ka ndị mmadụ na-atụbanye onyinye ha. Ọtụtụ ndị ọgaranya bịara, ụfọdụ ikekwe na-enwe ọdịdị ezi omume onwe onye, ọbụna n’oké ngosi. (Tụlee Matiu 6:2.) Anya Jisọs legidere otu nwanyị. O nwere ike anya nkịtị agaghị ahụ ihe ọ bụla dị ịrịba ama banyere ya ma ọ bụ onyinye ya. Ma Jisọs, onye pụrụ ịmata obi ndị ọzọ, maara na ọ bụ “ogbenye, nke di ya nwụrụ.” Ọ makwaara kpọmkwem ókè onyinye ya hà—“ego nta abụọ, nke mere otu farthing.”b—Mak 12:41, 42.

17. Olee otú Jisọs si jaa onyinye nwanyị ahụ di ya nwụrụ mma, gịnịzi ka anyị na-amụta banyere inye Chineke ihe?

17 Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya n’ebe ọ nọ, n’ihi na ọ chọrọ ka ha jiri anya ha hụrụ ihe mmụta ọ gaje ịkụzi. Ọ “tụbara karịa ndị nile na-atụba n’ime ebe ụtụ ahụ,” ka Jisọs kwuru. N’echiche ya ọ tụnyere karịa ihe ndị ọzọ nile tụnyere ma e jikọọ ha. O nyere “ihe dum o ji biri”—ego ikpeazụ o nwere. Site n’ime nke ahụ, o tinyere onwe ya n’aka nlekọta nke Jehova. Onye e si otú ahụ gụpụ dị ka ihe nlereanya nke inye Chineke ihe bụ onye onyinye ya fọrọ nke nta ka ọ ghara ịba uru ọ bụla n’ụzọ ihe onwunwe. Otú ọ dị, n’anya Chineke, ọ dị oké ọnụ ahịa!—Mak 12:43, 44; Jemes 1:27.

Ịmụta Ihe Site n’Otú Jehova Si Ele Ije Ozi Sitere ná Mkpụrụ Obi Dum Anya

18. Gịnị ka anyị na-amụta site ná mmeso Jisọs mesoro ndị inyom abụọ ahụ?

18 Site ná mmeso Jisọs mesoro ndị inyom abụọ a, anyị na-amụta ụfọdụ ihe na-ekpo obi ọkụ banyere otú Jehova si ele ozi e ji mkpụrụ obi dum na-eje anya. (Jọn 5:19) Jisọs ejighị Meri tụnyere nwanyị ahụ di ya nwụrụ. O ji mkpụrụ ego abụọ nke nwanyị ahụ di ya nwụrụ kpọrọ ihe dịkwa ka o ji mmanụ “dị oké ọnụ ahịa nke ukwuu” nke Meri. Ebe ọ bụ na nwanyị nke ọ bụla nyere ihe nile o nwere, n’anya Chineke onyinye ha bachara uru. Ya mere ọ bụrụ na echiche abaghị uru ejupụta n’ime gị n’ihi na i nweghị ike ime ihe nile ị chọrọ ime n’ijere Chineke ozi, adala mbà. Obi dị Jehova ụtọ ịnakwere ihe nile ị pụrụ inye. Cheta, Jehova “na-ele obi,” ya mere ọ mazuuru ihe na-agụ obi gị agụụ.—1 Samuel 16:7.

19. N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị ikpe ihe ndị ọzọ na-eme n’ijere Chineke ozi ikpe?

19 Otú Jehova si ele ije ozi sitere ná mkpụrụ obi dum anya kwesịrị imetụta ụzọ anyị si ele ibe anyị anya ma na-emeso ha omume. Lee ka ọ ga-esi ghara ịbụ ihe ịhụnanya ịkatọ mgbalị nke ndị ọzọ ma ọ bụ iji ozi mmadụ tụnyere nke onye ọzọ! N’ụzọ dị mwute, otu onye Kraịst dere, sị: “Mgbe ụfọdụ, ndị ụfọdụ na-enye echiche na ma ị bụghị ọsụ ụzọ ọ dịghị ihe ị bụ. Anyị ndị na-adọga iji nọgide ‘nanị’ dị ka ndị nkwusa Alaeze mgbe nile chọkwara ka a jaa anyị mma.” Ka anyị cheta na e nyeghị anyị ikike ikpebi ihe bụ ozi sitere ná mkpụrụ obi dum nke onye Kraịst ibe anyị. (Ndị Rom 14:10-12) Jehova na-eji ozi sitere ná mkpụrụ obi dum nke onye ọ bụla n’ime ọtụtụ nde ndị nkwusa Alaeze kwesịrị ntụkwasị obi akpọrọ ihe, otú ahụkwa ka anyị kwesịrị iwere ya.

20. Ọ na-akakarị mma iwere ihe otú ole banyere ndị na-efe ofufe ibe anyị?

20 Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na o yie ka ụfọdụ ha na-eme ihe dị nta karịa ihe ha pụrụ ime n’ozi? Nselata aka n’ọrụ onye kwere ekwe ibe anyị pụrụ igosi ndị okenye nwere nchegbu na e nwere mkpa maka enyemaka ma ọ bụ agbamume. N’otu oge ahụ, anyị agaghị echezọ na nye ụfọdụ, iji mkpụrụ obi dum eje ozi pụrụ iyi nnọọ ego nta nwanyị ahụ di ya nwụrụ kama iyi mmanụ dị oké ọnụ nke Meri. Ọ na-akasịkarị mma iwere ya na ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị hụrụ Jehova n’anya nakwa na ụdị ịhụnanya ahụ ga-akwali ha ime ihe dị ukwuu—ọ bụghị ihe dị nta—dị ka ha pụrụ. N’ezie ọ dịghị onye ohu Jehova nwere nlezianya nke ga-ahọrọ ime ihe dị ala karịa ihe ọ pụrụ ime n’ijere Chineke ozi!—1 Ndị Kọrint 13:4, 7.

21. Ọrụ dị aṅaa na-enye ụgwọ ọrụ ka ọtụtụ na-achụso, ajụjụ ndị dịkwa aṅaa na-ebilite?

21 Otú ọ dị, nye ọtụtụ ndị Chineke, ozi e ji mkpụrụ obi dum na-eje apụtawo ịchụso ọrụ na-enye ụgwọ ọrụ dị ukwuu—ozi ọsụ ụzọ. Ngọzi ndị dị aṅaa ka ha na-enweta? Gịnịkwa banyere ụfọdụ n’ime anyị bụ́ ndị na-enwebeghị ike ịsụ ụzọ—olee otú anyị pụrụ isi gosi mmụọ ịsụ ụzọ? A ga-atụle ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ebe Mataịas nọchiri Judas dị ka onyeozi, aha ya—ọ bụghị nke Pọl—ga-apụtaworị n’etiti ndị ahụ nọ na nkume ntọala 12 ahụ. Ọ bụ ezie na Pọl bụ onyeozi, o soghị n’ime 12 ahụ.

b Nke ọ bụla n’ime mkpụrụ ego ndị a bụ lepton, mkpụrụ ego ndị Juu kasị nta e ji eme ihe n’oge ahụ. Lepton abụọ na 1/64 nke ụgwọ ọrụ otu ụbọchị hà nhata. Dị ka Matiu 10:29 si kwuo, maka mkpụrụ ego otu assarion (nke ha ka lepton asatọ), mmadụ pụrụ ịzụta egwele abụọ, ndị so ná nnụnụ ndị kasị ọnụ ala ndị ogbenye ji emere nri. Ya mere nwanyị a di ya nwụrụ dara ogbenye n’ezie, n’ihi na o nwere nanị ọkara ego a chọrọ iji zụta otu egwele, nke na-ezutụghị maka otu nri.

Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?

◻ Gịnị ka ijere Jehova ozi site ná mkpụrụ obi dum pụtara?

◻ Olee otú ihe atụ dị ná 1 Ndị Kọrint 12:14-26 si egosi na Jehova adịghị eji anyị atụnyere ndị ọzọ?

◻ Gịnị ka anyị na-amụta banyere inye ihe site ná mkpụrụ obi dum site n’okwu Jisọs banyere mmanụ dị oké ọnụ nke Meri na ego nta abụọ nke nwanyị ahụ di ya nwụrụ?

◻ Olee otú ụzọ Jehova si ele ozi sitere ná mkpụrụ obi dum anya kwesịrị isi emetụta ụzọ anyị si ele ibe anyị anya?

[Foto dị na peeji nke 15]

Meri nyere ihe kasị mma o nwere, na-eji mmanụ “dị oké ọnụ ahịa nke ukwuu” eme ka ahụ Jisọs na-esi ísì ụtọ

[Foto dị na peeji nke 16]

Mkpụrụ ego nwanyị ahụ di ya nwụrụ —ihe fọrọ nke nta ka ọ ghara ịba uru ọ bụla n’ụzọ ihe onwunwe kama dịrị oké ọnụ ahịa n’anya Jehova

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya