-
Ọ Bụ “Chineke Na-eme Ka O Too”!Ụlọ Nche—2008 | Julaị 15
-
-
Ọgha Mkpụrụ nke Rahụrụ Ụra
13, 14. (a) Kọọ ná nkenke ihe atụ nke nwoke ahụ na-agha mkpụrụ Jizọs kọrọ. (b) Olee onye ọgha mkpụrụ ahụ na-anọchi anya ya, oleekwa ihe mkpụrụ ahụ na-anọchi anya ya?
13 Na Mak 4:26-29, e nwere ihe atụ ọzọ banyere ọgha mkpụrụ. Ebe ahụ na-ekwu, sị: “N’ụzọ dị otú a, alaeze Chineke dị nnọọ ka mgbe mmadụ ghara mkpụrụ n’ala, o wee hie ụra n’abalị ma bilie mgbe chi bọrọ, mkpụrụ ndị ahụ wee pulite ma too ogologo, otú o si mee, ọ maghị. Ala ahụ ji nwayọọ nwayọọ mịa mkpụrụ n’onwe ya, akwụkwọ ya bu ụzọ pụta, e mesịa, oko ya pụtara, n’ikpeazụ, mkpụrụ kara aka si n’oko ya ahụ pụta. Ma ozugbo mkpụrụ ahụ kara, o ji mma e ji ewe ihe ubi were ya, n’ihi na oge owuwe ihe ubi eruwo.”
14 Ònye bụ ọgha mkpụrụ a? Ụfọdụ ndị na Krisendọm kweere na ọ bụ Jizọs n’onwe ya ka a na-ekwu okwu ya ebe a. Ma olee otú ọ ga-esi bụrụ na Jizọs na-arahụ ụra nke na ọ maghị otú mkpụrụ ahụ si too? Jizọs maara n’ezie otú mkpụrụ si eto! Kama ịbụ Jizọs, ọgha mkpụrụ a, dịkwa nnọọ ka nke ahụ e kwuru okwu ya n’ihe atụ nke mbụ, na-anọchi anya onye ọ bụla na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ, ndị na-agha mkpụrụ nke Alaeze ahụ site n’ozi ọma ha ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa. Mkpụrụ ahụ nke a ghara n’ala bụ okwu ahụ ha na-ekwusa.b
15, 16. Olee eziokwu Jizọs mere ka ọ pụta ìhè n’ihe atụ ọgha mkpụrụ ahụ banyere uto nkịtị na uto ime mmụọ?
15 Jizọs kwuru na ọgha mkpụrụ ahụ ‘na-ehi ụra n’abalị ma bilie mgbe chi bọrọ.’ Nke a apụtaghị na ọgha mkpụrụ ahụ na-eleghara ọrụ ya anya. Naanị ihe ọ na-ekwu bụ ihe ọtụtụ ndị na-eme ná ndụ kwa ụbọchị. Okwu e ji mee ihe n’amaokwu a na-akọwa ihe a na-eme mgbe niile, nke bụ́, ịrụ ọrụ n’ụbọchị ma hie ụra n’abalị. Jizọs kọwara ihe mere n’oge ahụ. O kwuru, sị: “Mkpụrụ ndị ahụ wee pulite ma too ogologo.” Jizọs gakwara n’ihu ikwu, sị: “Otú o si mee, ọ maghị.” Ihe bụ́ isi Jizọs na-ekwu n’ebe a bụ na mkpụrụ ahụ pulitere “n’onwe ya.”c
16 Olee ihe Jizọs na-akọwa n’ebe a? Rịba ama na isi ihe Jizọs na-ekwu bụ otú mkpụrụ ahụ si too na otú o si jiri nwayọọ nwayọọ mee nke a. “Ala ahụ ji nwayọọ nwayọọ mịa mkpụrụ n’onwe ya, akwụkwọ ya bu ụzọ pụta, e mesịa, oko ya pụtara, n’ikpeazụ, mkpụrụ kara aka si n’oko ya ahụ pụta.” (Mak 4:28) Mkpụrụ ahụ ji nwayọọ nwayọọ too, ya wepụtachaa otu ihe, ọzọ esochie. Ọ dịghịkwa onye ga-amanye ya ito ngwa ngwa. Otú ahụkwa ka ndị mmadụ si eto dị ka ndị na-eso ụzọ Kraịst. Nke a na-eji nwayọọ nwayọọ eme na-adabere n’otú Jehova ji kwe ka eziokwu ahụ too n’obi onye nwere ezi obi.—Ọrụ 13:48; Hib. 6:1.
17. Olee ndị na-eso enwe ọṅụ mgbe mkpụrụ nke eziokwu ahụ mịrị mkpụrụ?
17 Olee otú ọgha mkpụrụ ahụ si esonye n’iwe ihe ubi “ozugbo mkpụrụ ahụ kara”? Mgbe Jehova mere ka eziokwu nke Alaeze ahụ too n’ime obi ndị ka malitere iso ụzọ Kraịst ọhụrụ, ha na-emecha nwee ọganihu ruo n’ókè nke na ịhụnanya ha nwere n’ebe Chineke nọ na-akpali ha ịrara ndụ ha nye ya. Ha na-egosizi na ha ararala onwe ha nye Chineke site n’ime baptizim. Ụmụnna ndị nwoke ndị nọgidere na-agbalị itozu okè na-eji nwayọọ nwayọọ enwe ike ịrụkwu ọrụ ndị ọzọ dị n’ọgbakọ. Onye mbụ ahụ ghara mkpụrụ Alaeze ahụ ga-ewe ihe ubi ya, ndị nkwusa Alaeze ndị ọzọ, ndị o nwere ike ịbụ na ha esoghị ghaa mkpụrụ ahụ mere ka onye ahụ bịa bụrụ onye na-eso ụzọ Kraịst na-esokwa ewe ihe ubi. (Gụọ Jọn 4:36-38.) N’ezie, ‘onye na-agha mkpụrụ na onye na-ewe ihe ubi na-aṅụrịkọ ọṅụ.’
-
-
Ọ Bụ “Chineke Na-eme Ka O Too”!Ụlọ Nche—2008 | Julaị 15
-
-
b Ọ dịla mgbe a kọwara na magazin a na mkpụrụ ahụ na-anọchi anya àgwà mmadụ nke kwesịrị ịdị na-akawanye mma ruo mgbe ha mara nnọọ mma, bụ́kwanụ nke ọtụtụ ihe na-ekpebi otú ha ga-adị ka oge na-aga. Ma anyị kwesịrị icheta na n’ihe atụ Jizọs ahụ, ọ dịghị mgbe mkpụrụ ahụ bịara ghọọ mkpụrụ ọjọọ ma ọ bụ mkpụrụ rere ure. Naanị ihe o mere bụ ito ruo mgbe ọ kara.—Lee Ụlọ Nche, December 15, 1980, peeji nke 21-23.
c Naanị ebe ọzọ e kwuru ụdị ihe a bụ n’Ọrụ 12:10, bụ́ ebe e kwuru na ọnụ ụzọ ámá e ji ígwè rụọ ‘meghere n’onwe ya.’
-