Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Otú Anyị Ga-esi Jiri Obi Ụtọ Na-ejere Jehova Ozi
    Ụlọ Nche—2014 | Mach 15
    • 8, 9. (a) Olee otú ihe si dịrị nwaanyị ahụ di ya nwụrụ nke dara ogbenye? (b) Olee ihe nwaanyị a nwere ike ịna-eche?

      8 N’oge Jizọs nọ n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem, ọ hụrụ otu nwaanyị di ya nwụrụ nke dara ogbenye. Ihe nwaanyị a mere ga-enyere anyị aka ịkwụsị iche na anyị abaghị uru ọ bụrụgodị na e nwere ihe ndị anyị na-anaghị emeli. (Gụọ Luk 21:1-4.) Chebara otú ihe si dịrị nwaanyị a echiche. Ọ na-eru uju na di ya anwụọla, na-edikwa ihe ndị isi okpukpe na-eme. Ha ‘na-eripịa ụlọ ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ’ kama ịna-enyere ha aka. (Luk 20:47) Nwaanyị a dara ogbenye nke na naanị ihe o nwere ike inye n’ụlọ nsọ bụ ihe onye ọrụ ga-arụta ná nkeji ole na ole.

      9 Gbalịa ghọta otú obi dị nwaanyị a mgbe o ji mkpụrụ ego abụọ ya bata n’ụlọ nsọ. Ọ̀ na-eche na ihe a ọ bịara inye aharughị ka ihe ọ gaara enye mgbe di ya nọ ndụ? Mgbe ọ hụrụ nnukwu ego ndị ọzọ na-atụnye, ihere ò mewere ya, ya echewe na nke ya abaghị uru? Ọ bụrụgodị na o chere otú ahụ, ọ ka nyere ihe o nwere iji kwado ezi ofufe.

  • Otú Anyị Ga-esi Jiri Obi Ụtọ Na-ejere Jehova Ozi
    Ụlọ Nche—2014 | Mach 15
    • 11. Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ banyere nwaanyị ahụ di ya nwụrụ?

      11 Otú ihe si dịrị gị nwere ike ime ka ị ghara imecha ihe ndị ị chọrọ ime n’ozi Jehova. Nká ma ọ bụ ọrịa nwere ike ha agaghị ekwe mmadụ jee ozi ọma otú o bu n’obi. Ma, ò kwesịrị ime ka mmadụ chee na ya ekwesịghị inye akụkọ ozi ya maka na ihe ọ rụtara dị obere? Ọ bụrụgodị na ahụ́ ka gbasiri gị ike, i nwere ike iche na mbọ ị na-agba enweghị ihe ọ bụ ma e jiri ya tụnyere awa niile ndị Chineke ji na-ejere ya ozi n’ụwa niile kwa afọ. Ma, akụkọ nwaanyị ahụ di ya nwụrụ nke dara ogbenye na-akụziri anyị na Jehova na-ahụ ihe ọ bụla anyị meere ya nakwa na o ji ya kpọrọ ihe, karịchaa ma ọ bụrụ na anyị mere ya n’agbanyeghị na ihe siiri anyị ike. Chebara otú i si jeere Jehova ozi n’afọ gara aga echiche. Ò nwere otu awa ị rụtara nke furu gị ezigbo ihe tupu gị arụta ya? Ọ bụrụ na o nwere, mara na Chineke ji ozi i jeere ya n’awa ahụ kpọrọ ihe. Ị ga-egosi na ị “nọ n’okwukwe ahụ” ma ọ bụrụ na i meere Jehova ihe niile i nwere ike imere ya, otú ahụ nwaanyị ahụ di ya nwụrụ nke dara ogbenye mere.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya