Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mrt isiokwu 60
  • Oké Ọkọchị—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Oké Ọkọchị—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
  • Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otú amụma ndị e buru na Baịbụl si gbasa oké ọkọchị
  • Ihe mere oké ọkọchị ji aka njọ
  • È nwere olileanya na ihe ga-aka mma n’ọdịnihu?
  • Afọ 2022 Bụ Afọ Nsogbu—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
    Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Oké Okpomọkụ A Na-enwe n’Ụwa Niile—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
    Isiokwu Ndị Ọzọ
  • A Na-emebisị Ụwa—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
    Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Banyere Ụkọ Ezigbo Mmiri n’Ụwa Niile?
    Isiokwu Ndị Ọzọ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Isiokwu Ndị Ọzọ
mrt isiokwu 60
Ala kpọrọ nkụ nke otu ahịhịa jisiri ike sepụta isi na ya.

Brais Seara/Moment via Getty Images

NA-ECHENỤ NCHE!

Oké Ọkọchị​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

  • Akwụkwọ akụkọ a na-akpọ The Guardian, nke Septemba 7, 2022 kwuru na ndị Chaịna sịrị na ọkọchị ha nwere n’afọ a kacha nyụọ ha ịkpakwụ nakwa na ọ bụ nke ugboro atọ ụdị ihe a na-eme n’obodo ha.

  • UN News, nke Ọgọst 26, 2022 kwuru na a ga-enwe oké ọkọchị n’ụfọdụ ebe n’Afrika ruo afọ ise n’akwụsịghị akwụsị.

  • BBC News, nke Ọgọst 23, 2022 kwuru na ihe karịrị ọkara ná mba ndị e nwere na Yurop nwere ike inwe oké ọkọchị nakwa na o nwere ike ịbụ nke kacha njọ ha nwetụrụla n’ime narị afọ ise.

Ọtụtụ ndị ọkachamara na-ekwu na a ga na-enwe ụdị oké ọkọchị a nakwa na o nwedịrị ike ịkakwu njọ. È nwere olileanya na ihe ga-aka mma n’ọdịnihu? Gịnị ka Baịbụl kwuru?

Otú amụma ndị e buru na Baịbụl si gbasa oké ọkọchị

Baịbụl kwuru ihe ndị ga-eme n’oge anyị a. Ọ sịrị:

  • “A ga-enwe . . . ụkọ nri . . . n’ebe dị iche iche.”​—Luk 21:11.

Oké ọkọchị na-akpatakarị ụkọ nri. Ụkọ nri a na-akpatakwa ahụhụ na ọnwụ. Ihe a niile na-emezu amụma Baịbụl.​—Mkpughe 6:​6, 8.

Ihe mere oké ọkọchị ji aka njọ

Baịbụl kwuru isi sekpụ ntị mere e ji enwe oké ọkọchị. Ọ sịrị:

  • ‘Mmadụ enweghị ikike iduzi nzọụkwụ ya mgbe ọ na-eje ije.’​—Jeremaya 10:23.

Ihe ọ pụtara bụ na ndị mmadụ agaghị achịli onwe ha nke ọma ma ọ bụkwanụ duzie onwe ha. Mkpebi ọjọọ ndị ha na-eme na-eme ka e nwee oké ọkọchị na ụkọ mmiri.

  • Ọtụtụ ndị ọkachamara na-ekwu na ndị mmadụ na-eme ihe dị iche iche na-emebi ọtụtụ ihe n’ụwa, ya emeekwa ka a na-enwe oké ọkọchị n’ụwa niile.

  • Ndị mmadụ dị anyaukwu, ha anaghịkwa eche banyere ihe mkpebi ha chọrọ ime ga-akpata n’ọdịnihu. Ha na-egbutusị osisi ndị dị n’ọhịa, na-emebi ikiku, na-emebisịkwa ihe dị iche iche bara uru dị n’ụwa. Ihe ndị a na-eme ka a gharazie inwe mmiri, bụ́kwanụ ihe dị anyị ezigbo mkpa.

Ma, Baịbụl na-eme ka anyị nwee olileanya.

È nwere olileanya na ihe ga-aka mma n’ọdịnihu?

Na Baịbụl, Chineke kwere nkwa na ọ ga eme ka a gharazie inwe ụkọ mmiri. Olee otú ọ ga-esi eme ya?

  1. 1. Chineke ‘ga-ebibi ndị na-ebibi ụwa.’ (Mkpughe 11:18) Chineke ga-ewepụ otu n’ime ihe ndị na-akpata oké ọkọchị, ya bụ, ndị anyaukwu na-emebi ụwa anyị a.​—2 Timoti 3:​1, 2.

  2. 2. “Ala kpọrọ nkụ ga-adị ka ọdọ mmiri nke ahịhịa amị juru.” (Aịzaya 35:​1, 6, 7) Chineke ga-emezi ihe niile oké ọkọchị mebiri. Ọ ga-emekwa ka ụwa anyị a bụrụ paradaịs, ebe a na-agaghị na-achọ mmiri achọ.

  3. 3. “Ị na-elekọta ụwa, na-eme ka ọ na-eme ezigbo nri n’ụba.” (Abụ Ọma 65:9) Chineke ga-agọzi ụwa, mee ka nri ju ebe niile, e nweekwa ezigbo mmiri n’ebe niile.

Ị chọọ ịma otú ụkọ mmiri ozuzo na ihe ndị ọzọ yiri ya na-akpa ụwa aka ọjọọ si emezu amụma Baịbụl, gụọ isiokwu bụ́ “Climate Change and Our Future​—What the Bible Says.”

Ị chọọ ịmatakwu ihe Baịbụl kwuru na-eme ka anyị nwee olileanya maka ọdịnihu, gụọ isiokwu bụ́ “Who Will Save the Earth?”

Gụọ isiokwu bụ́ “Extreme Weather​—Can the Bible Help You to Cope?” ka ị hụ ihe ndị Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka n’oge e nwere ụkọ mmiri ozuzo, oké okpomọkụ, ma ọ bụ ihe ndị yiri ha.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya