Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Olee Mgbe Alaeze Chineke Ga-achịwa Ụwa?
    Ụlọ Nche (Nke Ọhaneze)—2020 | Nke 2
    • Jizọs sịrị: “Mba ga-alụso mba ọzọ agha, alaeze ga-alụsokwa alaeze ọzọ agha. A ga-enwe oké ala ọma jijiji, ụkọ nri na ọrịa na-efe efe ga-adịkwa n’ebe dị iche iche.” (Luk 21:10, 11) Ọ bụrụ na ihe ndị a niile ana-eme n’otu mgbe, ha ga-egosi n’eziokwu na “Alaeze Chineke dị nso.” Ihe ndị a hà emewela ugbu a n’otu mgbe, hà na-emekwa n’ụwa niile? Lee ihe ndị a chọpụtara.

  • Olee Mgbe Alaeze Chineke Ga-achịwa Ụwa?
    Ụlọ Nche (Nke Ọhaneze)—2020 | Nke 2
    • 2. ALA ỌMA JIJIJI

      Ebe ala ọma jijiji na-eme, ụlọ ana-agbawasị.

      Otu akwụkwọ a na-akpọ Britannica Academic kwuru na n’afọ ọ bụla, a na-enwe ihe dị ka otu narị ala ọma jijiji ndị nwere ike “imebi ihe buru ibu.” Otu nchọpụta e mere n’Amerịka kwukwara na “ihe ndị merela eme (kemgbe ihe dị ka afọ 1900) gosiri na a ga na-enwe ihe dị ka oké ala ọma jijiji iri na isii n’afọ ọ bụla.” Ụfọdụ ndị nwere ike ikwu na ihe mere o ji dị ka à na-enwezi ọtụtụ ala ọma jijiji bụ n’ihi na e nweela ngwá ọrụ ọgbara ọhụrụ ndị e ji amata gbasara ala ọma jijiji. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na n’ụwa niile, oké ala ọma jijiji na-akpatara ọtụtụ ndị ahụhụ, na-atakwa isi ọtụtụ ndị karịa otú ọ na-emebu.

      3. ỤKỌ NRI

      Ihe a bụ chaatị gosiri otú ihe ndị a na-akọpụta n’ugbo si na-ebelata.

      A na-enwe ụkọ nri n’ụwa niile n’ihi agha, mpụ, nrụrụ aka, ụkọ ego, ileghara ọrụ ugbo anya, ma ọ bụkwanụ ileghara ihe ndị nwere ike ịkpata ọdachi anya. Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ihe Oriri kwuru ihe ha chọpụtara banyere ụkọ nri n’afọ 2018. Ha sịrị: “N’ụwa niile, narị nde mmadụ asatọ na iri abụọ na otu (821,000,000) na-anọ agụụ. Otu narị nde na iri abụọ na anọ (124,000,000) n’ime ha anaghịdị ahụ tụrụ rachaa.” Erighị ezigbo nri so n’ihe na-akpata ọnwụ ụmụaka dị ihe dị ka nde atọ na otu narị puku (3,100,000) kwa afọ. N’afọ 2011, ọ bụ otu erighị ezigbo nri a kpatara ọnwụ ihe dị ka ọkara ụmụaka niile nwụrụ n’ụwa niile.

      4. ỌRỊA NA-EFE EFE

      Ihe a nọchiri anya ụmụ nje dị iche iche.

      Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike kwuru, sị: “Malite n’afọ 2000, ọtụtụ ajọ ọrịa na-efe efe bụzi okwu a kpụ n’ọnụ. Ọrịa ndị a rịara n’oge gara aga, dị ka ọgbụgbọ na ọnyụnyụ na ịba ọcha n’anya alọghachila, ndị nke ọhụrụ apụtakwala, dị ka ọrịa mmịnwụ, oké ahụ́ ọkụ, ọrịa MERS, Ebola na ọrịa Zika.” Nke kacha ọhụrụ n’ime ha bụ ọrịa koronavaịrọs. Ọ bụ eziokwu na ndị sayensị na ndị dọkịta amatala ọtụtụ ihe banyere ọrịa dị iche iche, ma ha enwebeghị ike ịgwọ ọrịa niile.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya