E Mesie Obi Ike Maka Ihe Oriri Ga-ezuru Ụwa Site n’Ụzọ Dị Aṅaa?
“MGBALỊ anyị kasị mma nwere ike ghara izu ezu iji nọgide na-enwe ihe oriri ga-ezu ezu nke anyị maworo n’ime ihe ka ukwuu na narị afọ a,” ka Lester Brown, onyeisi nke Worldwatch Institute dị na Washington, D.C. na-ekwu. Dị ka magazin bụ́ New Scientist si kọọ, ná mmalite 1995, ọka a na-echekwa n’ụwa dalatara gaa n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị ala nke nde tọn 255—zuru ezu iji nye ụwa ihe oriri maka nanị ụbọchị 48. N’afọ ndị bu ụzọ mgbe nke e chekwara dalatara na-erughị akara ụbọchị 60, e nweghachiri ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ. Ma ugbu a Worldwatch ejighị n’aka ikike ụwa nwere inwetaghachi ihe ndị funahụrụ ya.
Mgbe afọ atọ nke owuwe ihe ubi na-emeghị nke ọma gasịrị, ebe a ka nwekwara mba ndị ka na-emepe emepe ji ọka azụ anụ ụlọ, e nwere ọka dị ala karị maka ndị ogbenye chọrọ ya dị ka ihe oriri bụ isi. New Scientist na-adọ aka ná ntị na ọ bụrụ na e meghị ihe ngwa ngwa banyere ọnọdụ ahụ, otu ijeri mmadụ ndị na-etinye ma ọ dịkarịa ala 70 pasent nke ego ha na-enweta n’ihe oriri pụrụ ịmalite ịnọ n’agụụ.
Bible buru amụma na ndị bi n’ụwa n’oge anyị ga-ahụ “oké ụnwụ.” (Luk 21:11) Ma Chineke abụghị onye nsogbu ahụ na-agbasaghị. N’ezie, a ga-egosirịrị nchegbu ya maka ọnọdụ ọjọọ ụmụ mmadụ mgbe Alaeze ya ga na-achịkwa ihe omume ụwa. N’oge ahụ “ala [ga-eme] ihe omume ya.” “Ka ọtụtụ ọka dị n’ala n’elu ugwu nile.” (Abụ Ọma 67:6; 72:16) Mgbe ahụ a ga-emezu okwu amụma ndị a banyere Onye Okike: “I letawo ala, wee mee ka o jupụta n’ihe . . . A na-ewere ọka kpuchie ndagwurugwu nile.”—Abụ Ọma 65:9, 13.
Nkwa ahụ dị ebube ọ̀ na-amasị gị? Ị̀ ga-achọ ịmara otú ị pụrụ isi kere òkè na ya? Mgbe ahụ jụọ Ndịàmà Jehova n’oge ọzọ ha bịara n’ọnụ ụzọ gị ka ha gwakwuo gị banyere Paradaịs nke a e kwere ná nkwa. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ka mmadụ bịa n’ebe obibi gị iji duziere gị ọmụmụ Bible n’efu, biko deta akwụkwọ na Watch Tower, P.M.B. 1090, Benin City, Edo State, Nigeria, ma ọ bụ n’adres nke kwesịrị ekwesị e depụtara na peji nke 2.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 32]
N’etiti: Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.